Etu ndị 'influencer' si anara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ego iji ghọgbuo ndị mmadụ na Soshal midia

Ego naịra

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu, Fauziya Tukur, na Yemisi Oyedepo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Team
    • Ebeg o si, Lagos

Nnyocha BBC mere egosila na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-egobi ndị a ma ama na soshal midia, a na-akpọ 'social media influencers', ka wee na-etiri ha mkpu site n'ịgbasa akụkọ ụgha megide ndị ha na ha na-azọ ọkwa.

Ngalaba nnyocha akụkọ ụgha na BBC chọtara mmadụ abụọ bụ ndị gbara ama gbasara otu ndọrọndọrọ abụọ nakwa etu ha si enye ndị 'influencers' ọrụ oti mkpu na mgbasa ozi ụgha.

Ndị ọgba ama a kwuru na ndị 'influencers' a na-enweta ihe nrite ego, onyinye galara ọnụ, ọrụ ngo gọọmentị, nakwa iwere ha n'ọrụ ma ha banye n'ọchịchị.

Anyị gbanwere aha ndị ọgba ama abụọ a iji chekwaa ha. "Yemi" bụ onye oti mkpu ndị ndọrọndọrọ a ma ama ebe "Godiya" bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Godiya
Nkọwa foto, Godiya, onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama, kwuru na ha kwụrụ otu onye 'influencer' ego ruru nde naịra 20

"Anyị kwụrụ otu onye 'influencer' ego ruru nde naịra 20 n'ihi ọrụ ọ rụrụ. Anyị enyekwala ndị ọzọ onyinye dara oke ọnụ. Mana ndị ọzọ, ihe ha chọrọ ịnụ bụ "kedu ọrụ ị chọrọ na gọọmentị, ịbụ 'board member' ka ọ bụ ịbụ onye enyemaka pụrụ iche?," Godiya kwuru.

N'aka nke ọzọ, Yemi kwuru na ha na-enwe ọgbakọ ebe ha na-anọ ebupụta akụkọ ụgha megide ndị ha na ha na-azọ ọkwa ọchịchị.

"N'ọgbakọ a ka anyị na-anọ atule etu ndị mmadụ si nabata akụkọ ụgha ahụ anyị wepụtara. Anyị na-akpachara anya wepụta akụkọ ndị iji ghọgbuo ndị mmadụ.

BBC na ọtụtụ ndị 'influencer' nwere mkparịtaụka ebe ha nọ kweta na a na-akwụ ha ụgwọ ịgbasa akụkọ ụgha maka ndị na-azọ ọchịchị.

Otu n'ime ha na-achọghị ka a kpọọ aha ya, onye ndị na-eso ya na Facebook ruru 150,000, gwara anyị na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwụ ya ụgwọ ka ọ gbasaa akụkọ na-emeghị eme chaachaa gbasara ndị ha na ha na-azọ ọchịchị.

Onye a kwuru na ya na-akwụ ndị obere 'infulencers' ndị ọzọ ụgwọ iji nyere ya aka kesaa akụkọ ndị a.

N'aka nke ọzọ, Rabi'u Biyora bụ onye a ma ama na-akwadodu pati 'All Progressives Congress', kwuru na ndị pati ọzọ chọrọ 'ịzụrụ ya' ka ọ sonyere ha, hapụ APC.

Anyị hụrụ n'akara Facebook ya na o mere nke a n'ezie.

Biyora kwuru na ya anaghị ego ọbụla iji hapụ ndị APC, mana anyị hụrụ ihe o tinyere na Facebook n'afọ 2019 ebe ọ naara ego nakwa ụgbọala iji sonyere pati ọzọ.

Oge anyị jụrụ ya gbasara nke a, ọ kwụsịrị ịgwa anyị okwu.

Etu ha si eme ya

Ihe ruru mmadụ nde 80 nwere ohere inweta ịntaneetị, nke mere soshal midia ji bụrụ nnukwu ihe maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nnyocha anyị gosiri na ihe ndị mmadụ na-ejikarị ekesa akụkọ ụgha bụ ihe gbasara okpukperechi, agbụrụ maọbụ mpaghara.

N'ọnwa Julaị, ndị 'influencer' malitere ikesa akụkọ gbasara Kashim Shettima, na-azọ ọkwa osote Onyeisiala na APC, ma na-ekwu na ya na ndị Boko Haram nwere mmekọ.

Puku kwuru puku mmadụ kesara akụkọ ahụ n'ọba ozi soshal midia dị icheiche.

Mana nnyocha gosiri na ndị ha na Shettima nọ na foto ahụ bụ ndị ọchịehi nke Shettima tinyere ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ n'afọ 2017, ọ bụghị ndị Boko Haram.

Kashim Shettima

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Nnyocha gosiri na ndị a bụ ndị ọchịehi nke Shettima tinyere ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ n'afọ 2017, ọ bụghị ndị Boko Haram.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ fesakwara na Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na Labour Party na-arụrụ ndị otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob) ọrụ. Ipob bụ otu na-achọ ikewapụ na Naịjirịa, mana Peter Obi kwuru na akụkọ ahụ bụ asị.

Onye kesara akụkọ a bụ Reno Omokri - bụbu onye enyemaka Onyeisiala Goodluck Jonathan - onye ndị mmadụ karịrị nde abụọ na-eso na Twitter.

Oge anyị jụrụ ya, Reno Omokri kwuru na ya kwụsiri ike n'ihe o kwuru n'agbanyeghị na o gosighi ihe akaebe ọbụla. O kwukwara na ọ bụghị ndị Peoples Democratic Party (PDP) kwụrụ ya ụgwọ.

Akụkọ ụgha ọzọ fesara na Atiku Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala na PDP dara ọrịa e buru ya gawa mba ofesi maka ịnata ọgwụgwọ.

Godiya, onye ndọrọndọrọ ahụ anyị gwara okwu, kwuru na ndị influencer na-ejikarị akụkọ na-emetụ n'obi ekesa akụkọ ụgha.

"Anyị nwereike iji foto mere ebe ọzọ n'Afrịka n'afọ garala aga ma tinye ya n'akụkọ na Twitter ma kwuo na ọ bụ otu a ka e si ekpochapụ ndị agbụru m. Ndị mmadụ hụ nke a ọ ga-amasị ha ikesa ya, o si otu ahụ na-efesa," ka o kwuru.

Ndị na-ege redio

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ oge ka akụkọ ụgha na-esi na soshal midia banye n'ọba mgbasaozi ndị ọzọ dịka akụkọ ụwa na redio nakwa ndị ọzọ

Ndị ọgba ama a kwuru na oge ụfọdụ, a ga-agwa ha ihe a chọrọ ka ha kesaa, ka onye ọbụla tinyezie ya etu ga-amazị ya, mana oge ụfọdụ kwa ka a na-enye ha kpọmkwem ihe ha ga-ekesa.

Ha kwuru na etu e si akwụ ndị 'influencer' ụgwọ bụ site n'ọnụọgụgụ ndị na-eso ha na soshal midia.

BBC jụrụ pati APC, PDP na Labour Party maka ihe a ndị ọgba ama kwuru, mana ha azaghị.

Twitter ewetuola ụfọdụ akụkọ ndị anyị chọpụtara na ha bụ akụkọ ụgha ma kwuo na ọ bụ ọrụ ha ichekwa ndị mmadụ pụọ na mfesa akụkọ ụgha gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Mana ọtụtụ na-ekwu na Twitter agaghị enwe ike itinye anya na mgbasaozi ụgha n'Afrịka ọ kachasị ugbua Elon Musk weghaara ụlọọrụ ahụ, mechie isi ụlọọrụ ha dị na Ghana ma chụọ ndị ọrụ ha niile.

BBC kpọtụụrụ Twitter maka nke a mana ha azaghị.

Idayat Hasan bụ onyeisi ụlọọrụ 'Centre for Democracy Development' kwuru na ihe ndị 'influencer' na-eme adịghị mma.

"Ọ bụ ime ka ndị mmadụ ghara inwe ntụkwasị obi n'ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa n'usoro ntuliaka, ya na ịkpalite ọgbaaghara," ka o kwuru.

Mana Godiya, onye ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na "ọ bụ okwe ka a na-azụ. Otu onye ga-emeri, mana Chineke nyere m aka ka m ghara ịnọ n'otu ndị e meriri emeri."