Sweden agụnyela mmekọrịta dịka asọmpi egwuregwu n'ezie? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị mba Sweden ekwuola na o nweghị mgbe ha binyere maọbụ nwee mkpebi ime mmekọrịta nwoke na nwaanyị asọmpi egwuregwu na mba ahụ.
Akụkọ fegharịrị ma wuo na nsonso a na-ekwu nac Sweden abụrụla mba mbụ na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị asọmpi egwuregwu.
Mana mba ahụ kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha.
N'ọsịsa ajụjụ nke BBC zigara ụlọnnochiteanya mba ahụ na Naijiria, onye odeakwụkwọ ha bụ Anna Edoh sịrị, " Nke a bụ akụkọ ụgha."
"Mmekọrịta nwoke na nwaanyị abụghị asọmpi egwuregwu na Sweden, o nweghị ngalaba gọọmentị na-ahụ maka egwuregwu mmekọ."

Ebe foto si, Getty Images
Edoh gara n'ihu kwupụta na otu ụlọọrụ kpọrọ onwe ha "Swedish Sex Federation' detara gọọment ha akwụkwọ ozi snị ka anabata ha na otu ndị na-ahazi asompi egwuregwu na mba Sweden.
"Anyị jụrụ ịnabata ha n'ihi na ha tozughị n'ihe ụlọọrụ na-ahụ maka egwuregwu kwesịrị inwe."
Ọ gara n'ihu kwuo na ha hụrụ akụkọ ahụ na-ekwu na Sweden anabatala asompi mmekọrịta nwoke na nwaanyị mana ya bụ akụkọ esighị n'aka gọọmentị maọbụ ngalaba na-ahazi asompi egwurewgu na mba ahụ.
Kedụkwanụ ebe akụkọ ahụ si?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nnyocha ngalaba na-ahụ maka nnyocha na BBC mere nnyocha iji mata oge akụkọ ahụ gbara n'intanet kpomkwem.
Nchọpụta anyị gosiri na e wepụtara akụkọ ahụ mbụ n'ọba ozi tudurudu.com n'abalị 29 nke ọnwa Mee.
O doghị anya onye nwe ọbaozi ahụ nke na-ebipụtakarị akụkọ na-atọ ọchị.
N'akụkọ ha dere banyere Sweden ịnabata mmekọ dịka asọmpi egwuregwu, ha kwuru na Sweden bụ mba mbụ na-eme nke a n'ụwa..
Ha ekwughị ma o nwere ihe jịkọrọ ụlọọrụ na-ahazi ya na gọọmentị
Ị gụdaa akụkọ ahụ, ị ga-ahụ na ha kwuru na asompi ahụ ga-adị ire ọtụtụ izuụka.
Ha kwukwara na ndị mmadụ ga-enwe ohere ikiri ya dịka a ga-egosi ya n'intanet dịka ọ na-eme ihe Bekee kpọrọ, "livestreaming."
Na nnyocha anyị, anyị chọkwara onye a kpọrọ Dragan Bratych bụ onye a sị bụ onyeisi otu 'Swedish Federation of Sex' mana o nweghị ihe anyị hụrụ maka ya n'intanet, ọbụladị foto ya maọbụ okwu o kwuru maọbụ dee.
Cheta na akụkọ Sweden inabata mmekọrịta dịka asọmpi wuru ewu na Naijiria nke na ọtụtụ akwụkwọ akụkọ nakwa ọbaozi intanet na Naijiria bipụtara ya.















