CAN asaala El-Rufai n'okwu 'Muslim-Muslim ticket'

Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Nasir El-Rufai

Otu jikọrọ ndị ụka Kraist na Naijiria bụ Christain Association of Nigeria(CAN) ekwuola na ihe aka chịburu Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru maka ndị Ụka Alakụba iji ọchịchị Naijiria, bụ 'okwe ka ọ na-azụ."

Na mkparịtaụka ya na ụlọmgbasaozi AriseTV nwere n'ụbọchị Wenezde,onyeisioche CAn alaka nke Kaduna steeti bụ Ụlkọchukwu Joseph Hayab kwuru sị. “Kemgbe ka ọ (El-Rufai) na-akpa nkata. Ọ na-azụ okwu. Ihe ọ chọọ ime bụ imegharị ndị mmadụ anya ka ọ kpalite ndị ụka Kraisti, ka ndị ụka Kraisti kulie megide gọọmentị ugbua, o su, o si etu ahụ rite uru n'ọdịnihu."

Hayab ,onye kwuru na ihe El-Rufai kwuru gosiri na ọ bụghị onye ndu, gwara ndị mmadụ ka a gbaa ya nkịtị."

Kedụ ebe Iwu Naijiria kwụ n'ihe El-Rufai kwuru maka 'Muslim-Muslim ticket'?

Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Twitter

Ndị ọkaiwu ekwuola n'okwu aka chịburu Kaduna steeti bụ Nasiri El-Rufai kwuru maka onyeisiala na osote ya ịbụ ndị okpukperechi Alakụba "megidere iwu Naijiria" ma nwe ike "ịkpalite ọgbaghara".

Na nsonso a, El-Rufai kwuru na onye Ụka Alakụba ịbụ Onyeisiala na Osote agbanyela mgbọrọgwụ na Naijiria dịka Bolla Amhed Tinubu meriri na ntuliaka 2023.

Mana na mkparịtaụka, ha na BBC Igbo nwere , ndị ọkaiwu gbaụrụ ihu ma kọwaa n'okwu ahụ megidere iwu ala Naijiria

Okaiwu Goddy Uwazuruike gwara BBC Igbo n'ekwentị, sị, "Iwu Naijiria kọwara na gọọmentị ma na steeti, ma n' etiti ọchịchị ga-abụ onye were oke, ibe ya e were (Federal Character)n'okwu agbụrụ nakwa okpukperechi, na gọọmentị ekwesịghị inwe okpukperechi ha kwụ na ya iche."

"Ya bụ ihe El-Rufai kwuru megidere iwu."

N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ifeanyi Olumba kwuru sị, "Ọ bụrụ na El-Rufai kwuru nke a, ihe ọ pụtara bụ na e mewala Naijiria ka ọ bụrụ obodo na-eso nanị otu okpukperechi- Okpukperechi nke Islam."

Ọkaiwu Ọlumba kwukwara sị," Iwu Naijiria akwadoghị ya n'ihi na Naijiria dịka ọ dị n'iwu enweghị okpukperechi nwe ya. A gbakọrọ agbakọ were nwere Naijiria."

Ọlumba gara n'ihu kwuo na ihe El-Rufai chọrọ "ịmụnye ọkụ n'obodo."

'Muslim-Muslim ticket' adịla, ọ ga-adị na-aga - El-Rufai

Nasir El-Rufai

Ebe foto si, El-Rufai/Twitter

Aka chịị Kano steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru na dịka ndị okpukperechi Alakụba ịbụ onyeisiala na osote ya adịla ka Bola Ahmed Tinubu na Osote ya meriri na Ntuliaka 2023 na ọ ga-adị na-aga n'ihu.

N'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na nsonso a, El-Rufai kwuru n'Awụsa na ndị ụka Alakụba ga-abụ gọvanọ na osote ya na Kaduna steeti ruo afọ 20.

N'ihe onyonyo ahụ nke wuru ewu, El-Rufai gara n'ihu kwuo na ya bụ ihe emewela n'ọchịchị nke etiti, sị,

"Na-agbanyeghị na ndị ụka Kraisti ji okpukperechi na ekpere, Allah nyere Asiwaju mmeri."

"O nweghị onye okwu asị ga-emeri na ntuliaka na Naijiria n'aha na ọ bụ onye okpukpere ụka Kraisti ọzọ."

"Peter Obi gbariri mana o merighị."

"Ebe ka CAN nọ? Kemgbe Tinubu meriri, CAN mechiri ọnụ."

"Onye Ụka alakụba ị bụ Onyeisiala na Osote ya ga-eweta udo n'ala a, Oge anyị mere ya ,mekwa ya ugboro ugboro, anyị ga-eweghachi udo na Naijiria."

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu

Dịka ihe onyonyo aahụ pụtara ihe, ọ kpanyela ọkụ na soshal midia dịka ụfọdụ ụmụ Naijiria na-akatọ ihe El-Rufai kwuru.

Ọkaiwu Malcolm Omirhobo kwuru na okwu ahụ gosiri na El-Rufai bụ "onye agha Jihad".

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post