Arondizuọgụ, Ajalị, Panya na ebe ndi ọzọ n'ụwa ndị Arochukwu binyere, gbanye mgbọrọgwụ

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Nigeria
Arochukwu dị n'Abia steeti, nke ụfọdụ ma dịka 'Aro-Okigbo', bụ obodo e ji arụsị ha aha ya na-ada ụda, bụ 'Ibini Ụkpabi' nke ndị Bekee kpọrọ 'Long juju', mara n'oge gboo.
Arochukwu bụ obodo nwere ogbe 19 nke gụnyere; Amuvi, Obinkita, Agbagwu, Utughugwu, Ugwuakuma, Ujari, Amasu, Ibom, Oro,Amanmagwu na Amoba.

Ndị ọzọ bụ Amankwu, Ugbo, Amukwa, Atani, Isinkpu, Ugwuafor, Amangwu na Asaga.
Ejikwa azụmahịa, ịdị ike ọgụ, nakwa ịgba mgbere ohu mara ndị Arochukwu oge ochie.
N'agba ọhụrụ a, aha mba ahụ ka na-ada ụda dịka Arochukwu nwere ọtụtụ ụmụafọ ha nwere agba na Naijiria na mba ofesi dịka Sam Ohuabunwa, Nwankwo Kanu wdg.

Mana ị ma na Arochukwu gbasara ka ụkpaka n' ọtụtụ obodo n'Ala Igbo na mba ndị ọzọ ?
Ndị Aro si ala ha mee njem bịambiri n'oge gboo ma gbanye mkpọrọgwụ n'obodo ndị a.

Dịka otu okenye Arochukwu bụ Ichie Emma Kanu Ivy si kọwara BBC Igbo, ihe mere na e nwere ọtụtụ obodo ndị Aro gara biri gbanye mkpọrọgwụ bụ n' oge gboo bụ maka na ha bụ ndị njem, azụmahịa nakwa ịgbasa ozi ọma banyere arụsị ha na-amasị.

Kanu kwuru na n'oge gboo, “Anyị nwere ndị na-aga n’obodo dị iche iche na-akọwara ha ike dị n'Ivu Chukwu Aro nke ndị mmadụ maa dịka Ibini Ukpabi.”
“Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị ịnụbeghị di ,nwaanyị ime na-esiri ike, onye chọrọ ka ha ha na-ada ụda, ndị chọrọ ka ahịa ha na-aga, ndị nwere esemokwu n’obodo, ha bịa n'Ivu Chukwu Aro, a kọwara ha nke bụ eziokwu.”
“ Maka ndị mmadụ anyị ndị na-aga ebe a na-akpọ Anambara steeti, Enugwu, Rivas state, ugbua, etu ha na-aga akọwa ya, etu ha na-aga akọwa ya ha na-eme ọyị, nweta ọyị nwaanyị, mgbe ụfọdụ ha amụọrọ ha nwa, ụfọdụ ha binyere ha, nọrọ ebe ahụ mụbaa.”

N'otu aka ahụ, onye nkuzi Asụsụ Igbo na mahadum, 'University of Lagos' bụ Ọkammụta Iwu Ikubuzor kọwara “ Ndị Aro dịka ndị Igbo ndị ọzọ bụ ndị na-eme njem rinne.
"Ihe mere ha ji eme njem site n'ebe a mụrụ ha gawa ebe ọzọ bụ azụmahịa,kpata ego, ihe bụ ihe e jiri mara ndị Igbo"
"Mana ihe Aro ji dịrị iche bụ na ha ka a ka mara n'ịgbasa biri n’etiti ndị ọzọ."
"Ha biiri, ha nọrọ ebe ahụ na-amụba, mana ha ka nwere ihe jikọrọ ha na Arochukwu, n'oge emume, ha na-echeta ebe ha sị.”
"Ibinu Ukpabi bụ nnukwu arusi e ji mara ndị Aro, o nyere ha aka na-agbamike ndị Aro n'ihi na ọ bụ arụsị a na-atụ egwu."
Ikubuzor gara n'ihu kọwaa na ihe mere "Ibinu Ukpabi iwelite ogo Aro ebe ọbula ha nọ.”
"Ha na-ebu arụsị ha ahụ n'abọ na-agagharị."
Njirimara ndị Aro

N'ihi njem ngagharị, e nwere ndị Arochukwu n'obodo dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa mba ndị ọzọ.
Otu njirimara ha bụ n'obodo ndị a ha binyere, a na-agbakwụnye 'Aro' maọbụ ogbe dị n'Arochukwu n'aha ha.
Ọzọ, ihe ọdịnala na-amasị ha nke ukwu.
Ihe ọzọ e ji mara ndị Arọ bụ na ebe ọbụla ha batara ha na-ewulite soro na ndị na-ekwu ihe na-eme n'obodo ahụ nke mere ụfọdụ ji akpọ ha," Ọbata-ọbachie".
Ndị Aro n'Imo steeti

Lee ụfọdụ ebe ndị Arọ nọ n' Imo steeti:
- Arondizuogu
- Aro Oguta
- Aro Atta Ikeduru
- Aro Ihite Owerri
- Aro Nta(Mbaise)
Ndị Aro n'Anambara steeti

N'Anambara steeti, e nwere ndị Aro na:
- Ajali dị n'Okpuru Ọchịchị Orumba-North
- Ndikerionwu, obodo Chukwuemeka Ike, deere akwụkwọ "Bottled Leopard"
- Azia dị n' Okpuru Ọchịchị Ihiala
- Ndiowu dị n'Okpuru Ọchịchị Orumba-North
N'Abịa steeti,

N'Abịa steeti, e nwere ndị Aro na:
- Aro Nkalunta na Nde Totty na Aro Oboro n'Okpuru Ọchịchị Ikwuanọ
- Aro Ndi itee na Nde Okereke

- Aro Onicha Ngwa n'Okpuru Ọchịchị Isiala-Ngwa
- Aro Ntalakwu n'Okpuru Ọchịchị Bende
Ndị Arọ n'Enugwu steeti

E nwere ndị Arọ n'ebe ndị n'Enugwu steeti:
- Aro-Udi
- Aro Nkerefi
- Aro-Nike
- Aro Amokwe
- Aro Ezeagu
N'olu

Ọ bụghị nanị n'Igbo, e nwere ndị Aro n'Olu.
Ndị Aro binyere ndị abụghị ndị Igbo na mpaghara dị iche iche na Naijria nakwa mba ndị ọzọ.
Ebe ndị a gụnyere:
- Aro Ikot Ukana dị n'Akwa-Ibom
- Aro Idoma dị na Benue steeti
- Aro na Bongayu dị na Cameroon
- Aro Fernando poo na mba Equitorial Guinea
- Aro Panya na mba Equitorial Guinea( Ichie Kanu kwuru na "ha bụ ndị agbụrụ Bioko dị na Equitorial Guinea".
O nwere ebe ndị ọzọ ị ma na ndị Arọ binyere? Gwa anyị maka ha n'ọbaozi anyị na Facebook













