Onye bụ Ousmane Sonko na mba Senegal?
Ousmane Sonko bụ onyeisi ndị na-ama Onyeisiala Senegal aka ịzọ ọkwa ọchịchị mba ahụ. Lekwa ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka ya:
- Ousmane Sonko bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Senegal.
- Ọ bụ onyeisi ngalaba ndị na-ana ụtụisi na Senegal
- Ọ bụ onyeisi ndị na-ama ndị ọchịchi aka. iweghara ọchịchị.
- Ọ bụbu onye kacha nta zọrọ ọchịchị mba Senegal n'afọ 2019 bụkwa onye mara Onyeisiala Macky Sall aka.
Atụọla Ousmane Sonko nga afọ abụọ na Senegal

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na Sonko na ndị nkwado ya e boro ebubo agaghị aga mkpọrọ.
Ngagharị iwe amalitela na mpaghara Dakar. Ndị nkwado Sonko na-ebuso ndị nchekwa ọgụ tụmadị ebe Sonko bi.
N'ụbọchị mbụ n'ọnwa Juunu ka otu ụlọikpe na Senegal atụọla Ousmane Sonko nga afọ abụọ maka ebubo “imebi ndị ntoroọbịa”.
Ụlọikpe kagburu ebubo idina mmadụ n'ike nakwa iyiegwu ọnwụ e boro Sonko na-azọ ọkwa Onyeisiala na ndọrọndọrọ ọchịchị Senegal nke a ga-eme n'afọ 2024.
Mpụtara ikpe nwerike ime ka Sonko; onye ndị ntoroọbịa hụrụ n'anya nke ukwuu azọzịla ọkwa ọchịchị mba Senegal na ntuliaka ha n'afọ 2024.

Ebe foto si, Sonko/Instagram
Kedụ ihe ikpe a mara Ousmane Sonko pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Ịtụ ya nga afọ abụọ a pụtara na ọ gaghị eso azzọ ọkwa onyeisiala mba Senegal na-akwado ime na Febụwarị 25, 2024.
Sonko agaghị ikpe ya, n'ọnụ onye ọkaiwu ya, ọ bụ maka na o nwetaghị akwụkwọ mkpoku ma ncha.
Onye nke ọzọ e boro ebubo, bụrụkwa onye nwere ụlọọrụ ebe a na-akpa isi ebe a sị na ya bụ ebubo e boro Sonko mere, natara afọ abụọ n'ụlọ mkpọrọ.
Enyela iwu na mmadụ abụọ a na-enyo n'okwu a kwụọ ego ịda nha 600,000 CFA francs, 600,000 CFA francs.
Ụlọọrụ mgbasaozi Senegalese Press Agency na-ekuwkwa na ha abụọ ga-ejikọ aka ọnụ kwụọ nchịkọta nde 20 CFA francs maka etu ha ihe a siri metụta civil party.
Kedụ ihe ndị ọkaiwu ya kwuru maka ikpe a?

Ebe foto si, Getty Images
Maître El Hadj Diouf kwuru tupu amalite iwepụta mgbasaozi maka ikpe a
"Anyị nweturu afọ ojuju maka ikpe a mana afọ ejuchaghị anyị. Anyị kara ịchọ ka ikpe ọmụma Maazị Sonko nata ntaramahụhụ ruo afọ 10 maka anyị ga-eso mkpebi ndị ọkaiwu,"
Maka okwu ihe akaebe gbasara ikpe a, Me Diouf kwuru "Ọ bụrụ na ijiri ohere ikike dị n'ọchịchị dịnaa nwata nwaanyị, nke a dị ka ndịna n'ike. Mmeri n'ikpe a bụ n'ihi na ị gọnarịbeghị na e nwere gosiri na e mere mmekọ maọbụ na e mekpara nwaada a ahụ."
Kedụ ihe bụ "corrupution of youth" a eji maka ya maa Sonka ikpe?

Ebe foto si, Getty Images
N'akwụkwọ iwu mba Senegal, e depụtara ịda iwu "corruption of youth" a n'nchịkọta okwu ikpeazụ nke akụkụ iwu 324, nke depụtara:
"A ga-ata onye dara iwu ahụhụ site n'ohere akwụkwọ iwu nyere, bụ onye wakporo esi ụkpụrụ site n'ịraba, ime ịma mmadụ maọbụ metọọ onye ntorobịa site n'okwu ndịda onye na-erubeghi afọ 21 maọbụ mgbe ụfọdụ, onye erubeghi afọ 16."
Ntarama ahụhụ e depụtara maka ịda iwu bụ iga nga ruo afọ abụọ ruo afọ ise nakwa ịkwụ ego ịda nha CFA francs 300 ruo nde anọ.










