Ramaphosa agwala ndị Saut Afịrịka n'ọga dị mma

Ebe foto si, Reuters
Onye a na-eche na ọ ga anọchị anya onyeisiala mba Saut Afịrịka bụ Cyril Ramaphosa edepụtala akwụkwọ na gwa ndị Saut Afịrịka nwe ndịdị.
Ọ sị na ya na onyeisiala bụ Zuma na-enwe nzụkọ dị mkpa ka ha mara etu ha ga-ebute oganiru mba ha.
Ọ sị na ọrụ ọchịchị ga na-aga nke ọma, na nzụkọ ha agaghị egbochi ihe ọbụla.
"N'ime ihe nke a niile, ihembu n'obi bụ ọdịnma ndị Saut Afịrịka" ka o kwuru n'ime akwụkwọ a o depụtara.
Ihe na-eme na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mba Saut Afịrịka ụgbụa: akagbuola ọtụtụ nzụkọ na mmemme dịmkpa ka a na-eche ịhe ga abụ chi onyeisiala Saut Afịrịka bụ Jacob Zụma
Otu nọ n'ọkwa ọchịchị bu ANC ekwuola na ha na-aganiru ịnwe nzụkọ n'etiti Zuma n'onye echere ga-anọchị anya ya bụ Cyril Rmaphosa.
Ndị mmadụ echebela na ịhe ga-apụta ihe ndị a bụ na Zuma ga-ekwekọrịta ịrịtụ n'ọkwa ọchịchị.
Cheta nụ na ndị nnukwu mmadụ na Saut Afịrịka agwala Zuma ya ritue n'ọkwa ọchịchị maka ihe dị ịcheịche dịka mmerụaka egọ omere.









