Ihe Nasir El Rufai kwuru maka Peter Obi na-akpọtụ

Nasir El-Rufai na Peter Obi

Ebe foto si, Nasir El-Rufai

Dịka a ka kpụ ihe Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru maka ndị pati ha na-arụka ha na ntuliaka, ka na-akpọtụ, o kwuola na o nweghị ebe Peter Obi na-azọ ọkwa Onyeisiala na ya bụ ntuliaka gi azụ aga na ntuliaka 2023.

El-Rufai kwuru nke a na mkparịtaụka ya na oge 'Journalist Hangout nke ụlọntaakụkọ TVC nwere n'ụbọchị Tọzde.

Ọ sịrị, "Peter Obi agaghị merinwu; o nweghị ọnụọgụgụ steeti, o nweghị karịa pasentị 25 na ihe karịrị steeti 16."

" O nweghị ebe o ji azụ aga. Ọ bụ onye ejije Nollywood. Ọ gaghị abụ karịa nke a."

"Ntuliaka a dị n'etiti APC na PDP, n'ihi na ha nwere ụkpụrụụkwụ ma gbasaa ebe nile."

El-Rufai gara n'ihu kwuo ebe Peter Obi nwere ike ịchịta aja, na ebe ọ gaghị.

"Peter Obi ga-enweta nanị otu pasenti na Sokoto, pasentị abụọ na Katsina, pasentị ise na Kano. Steeti nile ahaghị nhatanha."

Na ọ na-enweta pasent 70 n'Anambara steeti apụtaghị na onye na-enweta pasenti 10 na Kaduna akaghị ya mma. Kano nwere vootu nde anọ(4m votes.) "

"Vootu okle ka Anambara nwere? Vootu Anambara nile nwere dịka vootu otu Okpuru Ọchịchị na Kaduna."

"Ọdị mma, Peter Obi ga-emeri na steeti ndị dị n'Ọwụwa Anyanwụ. Ọ ga-eme ọfụma na Saụt-Saụt. Kedụ ebe ọzọ?"

" Ọ naghị eme ọfụma na Ọdịda Anyanwụ(South-West) karịa kpọm na Legọs."

"Ọ na-eme ọfụma na mpaghara Ugwu ebe ndị otu Kraisti nọ. Mmadụ ole ka ha dị."

El-Rufai gara n'ihu kwu na "o nweghị ebe okwu agbụrụ na okpukperechi bụ nke ọ na-ebo otu 'Labour Party' ga-eduga" Peter Obi.

Ihe Gọọmenti Etiti sara El-Rufai

Lai Mohammed na Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Lai Mohammed/Nasir El-Rufai

Gọọmenti Onyeisiala Naijiria bụ Muhamadu Buhari ekwuola o nweghị onye nọ n'Ọchịchị ahụ na-arụka pati ha dịka Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El Rufa si boo n'ebubo.

El-Rufai boro ebubo na nsogbu ụkọ naira ọhụrụ na nke mmanụ ụgbọala bụ aka ọrụ ụfọdụ ndị pati ha bụ ndị enwetaghị ohere ife ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2023 .

mana Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Muhammadu kwuru na nke a bụghị eziokwu

O kwuru na ọchịchị Buhari bụụ na ime ntuliaka ziri ezi, na o nweghị onye ọ kwadoro iche maọbụ onye ọ na-arụka.

“Ọchịchị a na-agba mbọ ịhụ na e nwere ntuliaka kwụ ọtọ.”

“Onyeisiala egosila site okwu ya na agwa ya na ọ chọrọ ntuliaka kwụ ọtọ.”

"Ọ na-ekwu nke a ebe nile ọ garala ọbụladị Daura ebe ọ gara ụbọchị Fraide."

"E nwee onye na-akpa nkata megide onye ọbụla na ntuliaka aka , anyị amaghị."

Ebe Aisha Buhari kwụ n'ihe El-Rufai kwuru

Aisha Buhari, Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Aisha Buhari/Nasir El-Rufai

Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari ekegharịala ihe onyonyo ebe gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai brụtụụaka na e nwere ndị nọ n'ọchịchị onyeisiala na gba mgba okpuru ka APC kpụ afọ n'ala na ntuliaka 2023.

Aisha Buhari mere nke n'akara ya na Instagram ji ozi Naihjria ga-adị ogologo ndụ were zipụta ihe onye onyo ahụ ka kpanyere ọkụ na soshal midia mabụrụ isiakụkọ ọtụtụ akwụkwọ akụkọ Naijiria taa bụ Tọzde.

N'ụbọchị Wenezde, El-Rufai bioror ebubo na ọ bụ ndị nọ n'ọchịchị Buhari merighị na ntuliaka imeụlọ APC ji ụkọ Naira na mmanụ ụgbọala arụka otu APc.

Ebubo ya yiri ebubo Aisha Buhari boburu na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'afọ 2016, ebe o boro ndị 'cabal' na-ekwu ihe na-eme n'ọchịchị di ya, na ọtụtụ ndị soro hụ na o meriri na ntuliaka esoghị ekwu ihe na-eme n'ọchịchị ya.

Ihe ndị El-Rufai kwuru mụnyere ọkụ na soshal midia

Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Nasir El-Rufai

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Aka na-achị Kaduna steeti bu Nasir El-Rufai eboola ebubo na o nwere ndị nọ n'ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari achọghị ka pati ha bụ APC merie na ntuliaka.

El-Rufai kwuru nke n'ụbọchị Wenezde na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere.

Ọ rụtụrụ aka na ibipụta ego naira ọhụrụ na ụkọ mmanụ ụgbọala nke mere ọtụtụ ụmụ Naijiria ha were eze ekpe ekwere ugbua na mpaghara dị iche iche na Naijiria bụ ihe a ma ama eme ji wụnyere pati ha aja na garị na ntuliaka na-abịa.

Ọ sịrị, “Ekwenyere m na o nwere ndị nọ na Villa chọrọ ka e merie anyị na ntuliaka mana ọ gaghị agara ha."

" Ha nwere onye ha chọrọ ka ọ bụrụ ya meriri na ntuliaka imeụlọ(APC) mana ọ garịghị ha ka ha siri chọọ."

“Ha na-agbalị ịhụ na anyị emerighị na ntuliaka, zoo n'azụ ebumnobi onyeisiala ime ihe o chere bụ ihe kwesịrị."

Ebubo El-Rufai na-abịa dịka ọ gachara otu izu, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n'aha APC bụ Bola Tinubu kwuru oge ọ gara achụmta vootu n'Abeokuta, isiobodo Ogun steeti na ụkọ mmanụ ụgbọala na ibipụta ego ọhụrụ bụ iji hụ na ya emerịghị na ntuliaka.

Tinubu na ndị nwere agba na APC dịka Ahmed Lawan bụ onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu, Osote Onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo, Mịnịsta na -ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige nakwa Mịnịsta njem bụ Rotimi Amaechi, Gọvanọ Ebonyi bụDave Umahi, nke Kogi bụ Yahaya Bello, nke Krọs Rivas bụ Ben Ayade, aka chiribu Imo steeti bụ Rochas Okorocha, Mịnịsta Teknụzụ bụ Ogbonnaya Onu , nke agụmakwụkwọ bụ Emeka Nwajiuba na ndị ọzọ zọrọ ọkwa onye ga-efe APC ọkọlọtọ na ntuliaka imeụlọ ha mere mana Tinubu meriri.

N'okwu mbipụta ego ọhụrụ, El-Rufai kwuru na ụta adịghịrị onyeisi Ụlọakụ Etiti bụ Godwin Emefiele dịka Onyeisial Buhari mebuorola ụdị ihe a mbụ iji hụ na ọ kụrụ ndị zupuru ego ahịa.

“Ndị mmadụ na-ata onyeisi CBN ụta maka ibipụta ego ọhụrụ mana ndị mmadụ kwesịrị ị laghachi azụ hụ na Buhari meburu ya n’oge ọchịchị ya na Idiagbon bụ oge ọ gbanwere ego iji jide ndị zofuru ego ha nwetara n’ụzọ akwụghị ọtọ.”.”