Etu e si tọrọ ma gbuo nwa anyị n'Enugwu - Ezinụlọ Ogbuene

Joseph Ogbuene

Otu nwoke aha ya bụ Joseph Ogbuene alaala mmụọ dịka ndị ntọ tọọrọ ma gbuo ya n'izuụka gara aga.

Dịka ndị ezinụlọ ya si kwuo, nwa amadị a bụ Joseph kpọrọ nwanne ya nwoke nke tọrọ ya n'ekwe ntị n'ụbọchị Sọnde abụọ gara aga, ya bụ Jenụwarị 19, ma kwuo na ndị ntọ tọọrọ ya.

Mana ka ụbọchị olemole gachara, ha nwetara ozi na nwanne ha anwụọla.

Ka ọ dị ugbua nnyocha gbasara ihe a merenụ na-aga n'ihu n'aka ngalaba ndị uweojii Enugwu steeti n'ahụ maka arụ ọjọọ dị icheiche a na-akpọ 'Criminal Investigative Department'.

Etu e si bido ịchọ Joseph Ogbuene achọ

Emeka Ogbuene bụ nwanne Joseph gwara BBC Igbo na Joseph bịara kọọrọ ya na ya na otu enyi ya nwoke a na-akpọ Biggy ga eme njem, mana o gwaghị ya ebe ha ga-aga.

"N'ụbọchị Sọnde izuụka abụọ gara aga ka nwanne m kpọrọ m n'ekwentị ma kwuo na ndị ntọ tọọrọ ya," Emeka Ogbuene kwuru.

"O kwuru na ọ bụ njem ahụ ya na Biggy gara ka ndị ntọ nọ tọrọ ha

"Ajụrụ m ya etu o si jiri ekwentị ya na-akpọ m ebe ọ bụ na ndị ntọ ji ya, mana otu onye naara ya ekwentị ahụ ma gwa m ka anyị ga chọwa nde naịra 30 iji gbapụta nwanne m."

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mazi Ogbuene kwuru na ya bụ onye nkụzi na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụka gọọmentị ka ji ụgwọ ọnwa kamgbe otu afọ, na ya enweghị ụdị ego ahụ ndị ntọrị sị ya kwụọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ntọrị ahụ kpọkwara nwunye Joseph ma kwukwaa ka ha weta ego.

Ndị ntọ ahụ mechara gbadata sị ha weta nde naịra iri, mechaa kwuo nde naịra abụọ, mechaa sị ha weta otu nde naịra.

Mana dịka ha na-achọ ego, n'ụbọchị Tọzde, Jenụwarị 23, Emeka Ogbuene kwuru na Biggy, enyi nwanne ya nwoke so ya mee njem, kpọrọ ya n'ekwentị ma kwuo na Joseph anwụọla.

"Biggy kpọrọ m ma kwuo na ya na Joseph si n'aka ndị ntọ ahụ gbaa ọsọ, mana oge ha na-agba ọsọ n'ime ọhịa, Joseph koropuru ma nwụọ."

"Oge ndị uweojii kpọrọ m ka m ga hụ ozu nwanne m, ahụ ya erechaala, mana anyị jisi ike buru ya ga tinye n'ụlọ ozu."

"Nwanne m abụghị onye na-achọ nsogbu. Ọ bụ mmadụ obi ọma. Amaghị m na ọ ga-ezute ọnwụ ya n'ụdị ụzọ ọjọọ a."

"Ọ gụrụ mahadum, mana ọ na-akwọ ụgbọala ugbua na-achọkwa ọrụ. Ọ lụrụ nwaanyị mụọ ụmụ abụọ, gịnị ka ezinụlọ ya ga-emezi ugbua," Emeka Ogbuene.

Ebe okwu ahụ dị ugbua

Dịka ihe si kwụrụ ugbua, Mazi Ogbuene kwuru na Biggy nọ n'aka ndị uweojii n'ihi na ọ bụ onye a na-enyo enyo n'ọnwụ Joseph.

Ya bụ okwu ga-agafe na ngalaba CID nke Enugwu steeti.

"Ihe dị ezinaụlọ anyị mkpa ugbua bụ ịhụ na ikpe ziri ezi gara n'ihu" ka o kwuru. "Nwanne anyị anwụọla bụ na ọ nwụọla, mana anyị chọrọ ịmata nke bụ eziokwu n'ọnwụ ya".

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe gbasara okwu a mana ọ zaghị ekwentị ya.