Otu Ipob bụ otu nke atọ kacha kwafuo ọbara na 2021 - Akwụkwọ Nchọcha

Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Nchọcha 'Global Terrorism Index' nke afọ 2022 na-ekwu na otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ otu nke atọ kacha gbuo mmadụ na Naịjirịa n'afọ 2021.

Akwụkwọ nchọcha ahụ kwuru na ogbugbu mmadụ n'aka ndị otu dị icheiche na Naịjirịa gbadara nke ukwu n'afọ 2021, n'agbanyeghị na mwakpo ndị oyi ndụ egwu rịrị elu.

N'ihi nke a, Naịjirịa gbadatara n'ogogo nke isii na mba ebe ndị oyi egwu kacha akpa ike n'ụwa niile, ma a gụchaa mba Afghanistan, Iraq, Somalia, Burkina Faso, na Syria.

GTI 2022

Ebe foto si, GTI-2022

Dịka nchọcha GTI 2022 si gosi, otu kacha gbuo mmadụ na Naịjirịa na 2021 bụ otu Islamic State in West African (ISWA), ebe otu nke abụọ bụ Boko Haram.

ISWA na Boko Haram bụ ndị ọgụ sị na ha chọrọ ka etinye usoro ọchịchị gbadoro ụkwụ n'okpukperechi alakụba. Ha na-ekwu n'agụmakwụkwọ ọgbara ọhụrụ bụ ihe rụrụ arụ.

Ipob ọ bụ otu na-eyi ndụ egwu?

GTI 2022

Ebe foto si, GTI-2022

Nkọwa foto, Nchọcha GTI 2022 akpọghị IPOB otu na-eyi ndụ egwu kpọmkwem, mana aha Ipob bụnke atọ n'otu ndị kacha gbuo mmadụ

Gọọmentị Naịjirịa hụtara otu Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu, nke bekee na-akpọ 'terrorist organisation', mana ndị gọọmentị mba ụwa dị icheiche anabataghị nke a.

Ipob, nke onyeisi ha bụ nwa amadị aha ya bụ Nnamdi Kanu, bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ mba nke onwe ya a na-akpọ Biafra.

Mana gọọmentị na-ebo ha ebubo igbu ndị ọrụ nchekwa nakwa ịwakpo na imebi ụlọ gọọmentị dị icheiche.

Onyeisi otu a bụ Nnamdi Kanu nọ ugbua n'ụlọ mkpọrọ na Naịjirịa dịka a nwụchiri ya na mba Kenya n'ọnwa June afọ 2021.

Mana ụlọikpe mkpesa nke Naịjirịa ekwuola ka atọhapụ ya maka na Naịjirịa agbasoghị usoro ziri ezi iji jide ya na mba Kenya, kama ọ bụ ntọrọ ka ha tọọrọ ya ma jiri aka ike kpụlata ya Naịjirịa.

Nchọcha GTI 2022 ekwughị kpọmkwem na Ipob bụ otu na-eyi ndụ egwu, ha kpọrọ ha 'separatist group', nke pụtara otu na-azọ nnwereonwe.

Mana na n'eserese ha ji kọwaa otu ndị kacha gbuo mmadụ, ha tinyere aha Ipob dịka ndị nke atọ.

BBC Igbo kpọtụụrụ Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu ndị Ipob, nakwa Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị Ipob, mana ha azaghachibeghị ozi anyị zigaara ha gbasara akụkọ a.

Ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful ekwubeghịkwa ihe ọbụla gbasara mpụtara nchọcha a.

Nkọwa ihe bụ 'Global Terrorism Index'

GTI 2022

Ebe foto si, GTI-2022

Ndị na-eme ma na-ewepụta mpụtara nchọcha a bụ 'Global Terrorism Index' bụ otu a na-akpọ 'Institute for Economics and Peace (IEP).

IEP bụ otu nọọrọ onwe ya nke ọrụ ha bụ ime nnyocha na ịgba mbọ etu udo ga-esi kawanye mma n'ụwa.

Isi ụlọọrụ otu IEP dị n'obodo Sydney, Austrelia, mana ha nwekwara ụlọọrụ na New York (Amerịca), The Hague (Netherlands), Mexico City (Mexico), Brussels (Belgium) na Harare (Zimbabwe).

Usoro anọ ha na-agbaso n'ime nchọcha a gụnyere:

  • Ọnụọgụgụ mwakpo ndị oyi ndụ egwu n'ime otu afọ
  • Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihi ihe iyi ndụ egwu n'ime otu afọ
  • Ndị merụrụ ahụ n'ihi ihe iyi ndụ egwu n'ime otu afọ
  • Ndị a tọọrọ n'ihi ihe iyi ndụ egwu n'ime otu afọ

Otu IEP na-ejikwa akụrụngwa a kpọrọ 'terrorism tracker' nke e wepụtara n'afọ 2007 maọbụ akụrụngwa 'Global Terrorism Database' nke ụlọakwụkwọ Mahadum Maryland nke mba Amerịka wepụtara n'afọ 2001.

Akụrụngwa ndị a na-edetu ma na-edebe ebe ọbụla e nwere mwakpo iyi ndụ egwu n'ụwa.