Nnamdi Kanu: Lee ihe Ipob sị ha ga-eme ma a tọhapụghị ya

Ebe foto si, Getty Images
Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) asaala Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ịsị na ọ gaghị atọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu na mkparịtaụka ya na Channels TV nwere na Wenezde.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful wepụtara ọ sịrị "Anyị nụrụ na ị sị na ịgaghị atọhapụ onye ndu anyị mana anyị ma ebe mkpebị a si bịa"
Powerful kwuru na ụfọdụ n'ime ndị otu ha achụpụrụ n'oge gara aga, gara hụ Onyeisiala Buhari na ngwụcha afọ 2021 ma metọọ obi ya n'ebe atụmatụ ịtọhapụ Maazị Nnamdi Kanu nọ.
Ọ sị na ha enyochapụtala ndị kpara nkata ahụ maka na Onyeisiala Buhari kwuburu na ọ ga-eleba anya n'ịtọhapụ Kanu mgbe ndị okenye ala Igbo gara rịọ n'afọ 2021.
Powerful gara n'ihu kwuo "Buhari na ndị otu ya ga-eme ihe nwereike ikposa Naịjirịa ma ọ bụrụ na ha atohapụghị Maazị Kanu" .
O kwukwara na "Ipob ga-eme ihe ga-atụ Naịjirịa n'anya ma ndidi anyị gwụụ n'okwu ntọhapụ Maazị Kanu"
Ọ sị na ụjọ anaghị atụ ha n'okwu onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu izara ọnụ ya n'ụlọikpe dịka Onyeisial Buhari si kwuo na mkparịtaụka ahụ.
Cheta n'ụbọchi Tọọzde, ndị Igbo ndị ọzọ nwere agba tinyere ọnụ n'okwu ịtọhapụ Nnamdi Kanu site n'ụzọ 'Political Solution'.
Ohere ka dị iji 'political solution' gbapụta Kanu - Goddy Uwazuruike

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu onyeisi otu ndị Igbo a na-akpọ Aka Ikenga bụ Goddy Uwazurike ekwuola na ohere ka dị ha na onyeisiala Muhammadu Buhari ịkpa nkata etu a ga-esi tọhapụ onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu.
O kwuru sị, "Esọ m n'ime mmadụ anọ gụnyere Mbazulike Amaechi, Chukwuemeka Ezife na Bishop Onuoha gara hụ onyeisiala n'ọnwa Nọvemba maka Nnamdi Kanui. O kwuru na ọchọghị itinye ọnụ maka ihe ọbụla nọ n'ụlọikpe".
Goddy uwazurike bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo gwara BBC sị:
"Mgbe anyị sị ya kedụ maka iji 'Political Solution' dozie ya bụ okwu, onyeisiala kwuru na eweta nke ahụ na ọ ga-elebara ya anya".
Ọ gara n'ihu kwuo na dịka ha na onyeisiala nwechara nzụkọ, na ndị o ji egbe akpa ike bụ 'Unknown Gunmen' wakporo ọwụwa anyanwụ ọzọ.
Ọ kwukwara sị, " Mwakpo a mere ọ dị ka ọwụwa anyanwụ ọ jọrọ njọ".
Ọ na-akọwa na ihe onyeisiala kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ụlọọrụ mgbasaozi Channels TV nwere, nke egosiri n'ụbọchị ise nke ọnwa jenuwarị 2022 ebe o kwuru na "agaghị atọhapụ Nnamdi Kanu na ọ ga-azara ọnụ ya n'ụlọikpe" abụghị ngwụcha ya bụ okwu.
Uwazurike kọwara sị. " E gere m ya ntị nke ọma, o kwukwara na ohere dị ịkpa nkata iji 'Political solution' kpọpụta Nnamdi Kanu".
Ihe anyị ga-eme maka ọjụjụ Buhari jụrụ ịtọhapụ Nnamdi Kanu - Ohaneze

Ebe foto si, Getty Images
Otu Ohaneze ekwuola na mgbe ha ga-aga kọwaara onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari, na ọ ga-aghọta ihe o jiri dị mkpa na atọhapụrụ onye isi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Ohaneze bụ Alex Ogbonnaya kwuru nke a ma sị na ihe onyeisiala kwuru na ọ gaghị etinye aka n'okwu ikpe Kanu, bụ nzaghachị maka nzụkọ ahụ ya na Mbazulike Amechi na ụfọdụ ndị Igbo nwere agba, nwere n'ọnwa Nọvemba, afọ 2021.
Maazị Ogbonnaya gwara BBC sị, "anyị na onyeisiala ga-enwe nzukọ na mbido afọ a, anyị ga-akọwara ya ihe bụ 'Political Solution' nke ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa na atọhapụrụ Nnamdi Kanu".
O kwukwara na ndị ọchịchị na ndị ọnụ na-eru n'okwu bụ ndị Igbo hiwere nzukọ ise, dịka ha na-eme nkwadọ nzukọ ha na onyeisiala Naijirịa ga-enwe na nso nso a.
Ogbonnaya kwukwara sị, "Nnamdi Kanu na Ipob bụ ihe ọmụmaatụ na-egosi ihe mmegide nke gụnyere ịchụpụ mmadụ n'ihe o so nwere. Ọ bụ mmegide a ka ha na-akọwa na ọdịghị mma".
Ọ kọwara sị, "enwere ihe ọ ga-abụ Buharị kwuo ugbua, ndị Igbo niile aṅụrị wa. mgbe e mere etu a , a sị NNamdi Kanu pụtawazie na ihe ị na-achọ erutela".
Akụkọ ka na-abịa









