Sedentary Lifestyle: Etu ịnọdụ ala ogologo oge nwereike isi gbuo gị

Nnyocha sanyesị gbara ama na ntukwuala ruo ogologo nwereike igbu mmadụ.

Ebe foto si, iwaria

Nkọwa foto, Nnyocha sayesị gbara ama na ịnọ ala ogologo nwereike igbu mmadụ.

Ụwa anyị bi n’ime ya ugbua adịghị etu ọ dịbụ na mgbe gboo. N’oge gara aga, ndị mmadụ na-eji ụkwụ agagharị, na-aga ahịa, ọrụ ugbo, achụ nta, nakwa na-eme njem.

Ụwa ọgbara ọhụrụ a bụ nke na-akwado oke ịnọdụ ala, ma mmadụ a chọrọ ya ma ọ chọghị ya.

Ọtụtụ mmadụ na-anọ ala ogologo awa n’ime ụgbọala, n’ụlọakwụkwọ, n’ụlọọrụ, n’ụlọ ọkachasị oge anyị na-elele ihe onyonyo TV.

Ndị sanyesị nakwa ndị ọrụ ahụike enyopụtala na oke ịnọdụ ala nwereike ibutere mmadụ ọtụtụ ọnọdụ ahụike ọjọọ nke nwereike idula mmadụ mmụọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ụfọdụ ọrịa nakwa ọnọdụ ahụike oke ịnọdụ ala nwereike ịbutere mmadụ gụnyere: Ọrịa shuga, ọrịa obi, ụfọdụ ọrịa kansa, oke ibu (nke na-akpata ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ) nakwa ọnwụ.

Dọkịnta Emma Wilmot gbara ama nke a dịka ọ kọwara na nnyocha ha gosiri na ndị na-anọ ala ogologo oge na-ebutekarị ọrịa ndị a.

Nke bụ eziokwu bụ na e nyochapụtara na ịnọdụ ala ogologo oge na-emetụta mmepụta ihe na-enye ike n’ime ahụ mmadụ nke Bekee na-akpọ ‘Glucose’, nakwa akụrụngwa nke a na-akpọ 'insulin', bụ ihe na-enye aka ka Glucose na-adị n’ọbara mmadụ etu o kwesịrị.

Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ n'ime ụgbọala ka ndị mmadụ na-anọ ruo ogologo awa.

Ebe foto si, iwaria

Nkọwa foto, Mgbe ụfọdụ ọ na-abụ n'ime ụgbọala ka ndị mmadụ na-anọ ogologo awa n'ime ya.

Onye ọkachamara ọzọ, bụ Dọkịnta Udodi Okoli, kwukwara na “ịnọdụ ala ogologo awa nwere ike ịkpata nsogbu n’ọkpụkpụ azụ mmadụ, ọkachasị ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị anọdụ ala n’ụzọ kwesịrị ekwesị, maọbụ na ọ naghị eji oche ahaziri maka ịnọdụ ala n’ụzọ dị mma”

Ọ kọwara na ọ bụrụ na mmadụ na anọ ala ogologo awa n’ihu kọmpụta ya ma odobeghi isi ya maọbụ olu ya n’ụzọ ziri ezi, olu nwereike imalite igbu ya mgbu.

Okoli kwuru na ịgba mbọ kwụrụ ọtọ ma gagharịa nwereike inye aka belata ọnọdụ ndị a.

O kwukwara na mmadụ anaghị emegharị ahụ nwereike ime mmụọ ya daa mba maọbụ o nwereike ịmetụta ahụike echiche ya n'ụzọ ọjọọ.

Etu ị nwereike isi nyere onwe gị aka

Ịgba mbọ na-akwụ ọtọ kwa mgbe kwa mgbe nwereike inyere gị na ahụike gị aka.

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Ịgba mbọ na-akwụ ọtọ kwa mgbe kwa mgbe nwereike inyere gị na ahụike gị aka.

Mmadụ igbanwe akparamagwa ya abụghị ihe na-adị mfe mana ọ bụ ihe na-ekwe omume ma onye ha nwee ezigbo mkpebi.

Ụfọdụ ihe ndị ga-enyere gị aka ịbelata ogologo oge iji anọdụ ala gụnyere:

  • Gbaa mbọ tinye ihe ncheta n’ekwentị maọbụ depụta ya n’akwụkwọ nọ gị nso ka ị na-ebili n’oche gị kwa mgbe kwa mgbe, kwa ụbọchị
  • Ọ bụrụ na o kwe gị omume, kwụrụtu ọtọ ma ị na-arụ ọrụ gị, nke gụnyere n’oge ọgbakọ gị n’ụlọorụ gị (Ị nwereike idobe kọmputa gị n’elu tebulu ma kwụrụ ọtọ rụtụ ọrụ gị.)
  • Malite ịṅụ mmiri maọbụ tii kwa mgbe kwa mgbe – nke a na-akacha mma ma ọ bụrụ na ebe ite mmiri dị n’ụlọọrụ gị anọghị gị oke nso. Marakwa na ịṅụ mmiri ga-eme ka ị malite ịnyụ mamịrị nke ga-eme ka i isi n’oche gị kulie
  • Belata aka n’oge iji ele ihe onyonyo n’Igwe TV
  • Gbaa mbọ malite ịmegharị ahụ kwa ụbọchị maọbụ kwa ụbọchị abụọ - ọbụladị ịga ije, ịwụ ụdọ, ịgba ọsọ, ịnya igwe, ibu ihe dị arọ maọbụ ihe ndị ọzọ bụ ihe egwuregwu masịrị gị