School cultism: Ụlọakwụkwọ achụọla ụmụakwụkwọ isii maka akara'snake bite'

Azụ aka ụmụaka a sị e nyere akara arụ agwọ'

Ebe foto si, Screengrab

Otu ụlọakwụkwọ dị n'Asaba, Delta Steeti, achụọla ụmụaka ụmụakwụkwọ ha isii n'ihi okwu metụtara akara 'arụ agwọ' nke a sị bụ akara e ji edubanye ụmụaka nọ n'ụlọakwụkwọ Pramarị na sekọndịrị n'otu nzuzo.

Akwụkwọ ozi nke ndịisi ụlọakwụkwọ ahụ(nke anyị achọghị ịkpọ aha na onyeisi otu jikọrọ otu ndị nne na nna ụlọakwụkwọ ahụ binyere ma degara ndị mụrụ ụmụakwụkwọ ndị ahụ a chụrụ,kwuru na mkpebi ahụ so "iyi egwu nke ụfọdụ ndị nne na nna na-eyi ndị nkuzi anyị kemgbe nsogbu akara 'arụ agwọ' dapụtachara n'ụlọakwụkwọ anyị nke mere ka ha nọrọ n'ize ndụ."

Otu nwaanyị, anyị achọghị ịkpọ aha ya a chụrụ ụmụ ya atọ boro ebubo na ụlọakwụkwọ ahụ hapụrụ ndị na-edufu ụmụaka ndị ọzọ, tawa ụmụ ya ahụhụ n'ihi na ya jụrụ ụlọakwụkwọ ese ma gbaa ama ihe na-eme n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Oge BBC jụrụ onye nwe ụlọakwụkwọ n'ekwentị, ọ gọrọ sị na ọchụchụ ụmụaka ahụ emetụtaghị akara arụ agwọ.

"Ihe anyị chụrụ bụ ụmụaka isii; nwata akwụkwọ nwaanyị kụrụ onye nkuzi ihe na nwanne ya; ụmụaka atọ nne ha na-amaja m; o nweghi ihe jikọrọ ndị e nyere akwụkwọ ha na arụ agwọ."

"Ọ bụ ndị mụrụ ụmụakwụkwọ anyị yijara anyị sịdubanye ụmụaka ibe ha n'otu nzuzo mere ihe mere ha jiri chụọ ụmụaka n'ụlọakwụkwọ ahụ oge ọfọrọ.

Nke a so ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia na nsonso a nke gosiri ụmụaka otu ụlọakwụkwọ anyị achọghị ịkpọ aha ya karịrị iri bụ ndị a hụrụ apa ọya n'azụ aka ha nke a sị na ọ bụ akara arụ agwọ(snake bite).

A na-enyo na akara ahụ nke ụfọdụ ụmụakwụkwọ ahụ kọwara na ọ bụ ndị ogbo ha ji akwụkwọ nye ha n'azụ aka n'ụlọakwụkwọ bụ akara ndubanye n'otu nzuzo.

Akụkọ ahụ kusuburu ọtụtụ ndị nne na nna ọkachasị ndị bi n'Asaba, Delta steeti ma kpalite Ministrị na-ahazi agụmakwụkwọ na steeti ahụ ka ha gaa n'ụlọakwụkwọ ahụ maka nleta.

Akara ‘snake bite’ abụghị maka nduba n’otu nzuzo – Ndị uweojii

A na-ebo ebubo na akara 'Snake bite' bụ usoro nduba n'otu nzuzo n'akụkụ ụlọakwụkwọ ụfọdụ na Delta steeti.

Ebe foto si, Getty Images/Screengrab

Nkọwa foto, A na-ebo ebubo na akara 'Snake bite' bụ usoro nduba n'otu nzuzo n'akụkụ ụlọakwụkwọ ụfọdụ na Delta steeti.

Ndị uweojii na Delta steeti ezipụtala ozi ma kwuo na akụkọ fegharịrị nke otu nwoke na-alụ ọgụ ikike dịrị onye kesara maka akara ụmụakwụkwọ na-aka onwe ha n’aka nakwa etu o siri bụrụ usoro nduba n’otu nzuzo bụ akụkọ ụgha.

N’akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bright Edafe zipụtara, o kwuru:

‘Anyị ma maka ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke sị na a na-ebuba ụfọdụ ụmụaka n’otu ụlọakwụkwọ n’otu nzuzu...”

“Anyị nyochara ya bụ ihe onyonyo ma na-asị na ya bụ akụkọ bụ akụkọ ụgha.”

Edafe kọwara na ọ gara na ya bụ ụlọakwụkwọ ma gbaa ọtụtụ ụmụaka ndị ahụ ajụjụ ọnụ dịka o nyere ha aka ka akaa ya ya bụ akara o were hụ na ya bụ ihe bụ egwuregwu ụmụaka na-egwu kama na ọ bụghị nraba n’otu ka onye ikike dịrị onye ahụ kesara akụkọ a siri kwuo.

Akara 'arụ agwọ'

Ebe foto si, Harrison Gwamishu

Etu akụkọ a siri malite na-ewu

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụfọdụ ndị nne na nna malitere iti mkpu na mbido izu a dịka a na-ebo ebubo na e dubara ụmụaka karịrị 50 n'otu nzuzo n'otu ụlọakwụkwọ dị n'Asaba, Delta steeti.

A na-enyo na ụmụaka ahụ bụ ndị dị agbata afọ asatọ na afọ 15 bụ ndị edubanyere n'otu ahụ dịka ụmụaka ibe ha ji akwụkwọ nye ha akara a kpọrọ arụ agwọ' (snake bite) n'azụ aka ha.

Nke a pụtara ihe dịka ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'izu nọ na-ebo ebubo na-edenyere aha ọtụtụ ụmụakwụkwọ si n'otu ụlọakwụkwọ n'otu nzuzo site n'inye ha akara "arụ agwọ" (snake bite) n'azụ aka ha.

N'ihe onyonyo ahụ nke otu onye na mgba mbọ maka ikike dịịrị onye ndị mmadụ aha ya bụ Harrison Gwamishu tinyere n'akara Facebook ya, ihe ruru ụmụaka 61 na-agụ akwụkwọ n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ na Delta steeti nwere akara ahụ n'azụ aka ha.

Gwamishu gwara BBC Igbo na ụmụaka ndị otu a na-enye ibe ha akara ahụ site ichi ha akwụkwọ n'azụ aka kwubie ụfọdụ okwu ma kwee ha nkwa ịgbatara ha ọsọ enyemaka ma onye nkuzi ọbụla maọbụ onye ọbula nye ha ntaramahụhụ ọbụla.

Akara 'arụ agwọ'

Ebe foto si, Screengrab

Gwamishu kwuru na ọ chọpụtara na:"Otu nwata akwụkwọ a na-enyo bụ onye otu a chọrọ iti onye nkuzi ya nwoke ihe maka ịta ya ahụhụ."

"Ụmụaka ndị a dị na-agbata afọ asatọ na afọ 15. Ọ bụrụ na-edenye aha gị, ị ga denye onye ọzọ."

"Ha na-ekwe nkwa onye tie gị ihe, ị gagwa ha, ha gaa taa onye ahụ ahụhụ."

Otu nwaanyị e dere nwa ya dị afọ 13 akara 'agwọ' a n'aka nke sị n'otu ụlọakwụkwọ na steeti ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ ka "nwa m lọtara akwụkwọ na-ajụ m ihe 'snake bite' pụtara" ka ọ matara ihe na-eme.

"A jụrụ m ya, ọ bụ na ị maghị ihe agwọ ịta mmadụ pụtara? E nyere m ya ekwentị sị ya were chọọ na 'Google' mana dịka ọ na-ele ya, e lere m ya anya n'azụ aka, hụ apa dị ya n'aka."

"Oge m jụrụ ya ihe mere ya n'aka, o kwuru na ọ bụ ya merụrụ onwe ya ahụ n'aka mana n'ihi ihe m gụtara a soshal midia, a jụsiri m ya ike ka ọ gwa m eziokwu onye nyere ya akara ahụ, o wee kpọọ aha nwa ụlọakwụkwọ nyere ya ya bụ akara n'aka."

Ndị uweojii Delta state sị na ha amaghị maka akụkọ a na-efegharị.

Oge onye ntaakụkọ anyị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bright Edafe maka okwu a, ọ sịrị, "Ebe ka ihe ahụ mere? Anyị anụbeghị maka ya."

Akara 'agwọ'

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, A hụrụ akara 'arụ agwọ' dị n'azụ aka ụfọdụ ụmụaka Praịmari na Sekọndrị a na-enyọ na-edubara n'otu nzuzo

Otu onyeisi na ministrị Agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Dkt Mike Emeshiri kwuru: "Ihe a ị na-ekwu gbagwojuru m anya."

"Ama m na otu onye kpọrọ anyị n'ekwentị sị na ọ na-abịa iwetara anyị mkpesa maka ya, mana anyị ahụbeghị ya"

"Amaghị m maka ya bụ okwu."

Dịka ihe onyonyo ahụ wuru na soshal midia, ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia na-ebo ebubo na e tinyere nwa ha maọbụ onye agbataobi ha n' otu nzuzo na pramarị na sekọndrị na steeti ahụ site ya bụ akara.

Ụmụakwụkwọ ịbanye otu nzuzo abụghị ihe ọhụrụ Naijiria dịka ọ na-eme n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ mahadum.

Mana nke ọhụrụ bụ ndị Praịmarị na sekọndrị isonye.

Dịka Gwamishu siri kwuo, "ọ bụrụ na egbochighi nke a n'oge, ọtụtụ ụmụaka na-eto eto ga-atufu ezi ụkpụrụ sowe agwa na nkwenye ọjọọ nke otu nzụzọ."

Ihe akaebe ga-agba ama maka ebubo a ka bụ ihe a na-atụ anya ya ịpụta mana akụkọ a na-efegharị dịka ndị uweojii na-ekwu na mkpesa banyere ya erubeghi ha ntị mkpọm kwem.