A maala ụkọchukwu ikpe ọnwụ maka igbu iko ya nwaanyị na mmadụ abụọ ọzọ

Ebe foto si, Rivers State Police
Ụlọikpe ukwu dị na Pọtakọt, Rivers Steeti amaala ụkọchukwu otu ụlọụka ọ gbara ọhụrụ bụ Chidiebere Okoroafor ikpe ọnwụ site n’ịkwụ ụdọ maka igbu ọtụtụ mmadụ.
Okoroafor bụ onyeisi ụkọchukwu ụlọụka ‘Alter of Solution and Healing Assembly’ dị n’Oyigbo nke Rivers steeti, nọ n’ikpe maka igbu onyendu ndị ọbụ abụ ya bụ Concilia Ezenwa, bụ onye ọ tụwara ime.
A makwara ikpe maka igbu Uluoma Onweagba, bụ enyi nwaanyị Concilia na nwa dị ọnwa itoolu ọ kuu n’aka bụ Christabel n’ụbọchị 11 Disemba, 2017.
Ọkaikpe S.O Benson sị na ihe akaebe nakwa nkwupụta site n’ọnụ ụkọchukwu ahụ gosiri na ọ kpara arụ a n’ezie.
Ọ sị na ikpe a gosiri na ebubo igbu mmadụ e boro ụkọchukwu a bụ eziokwu ma nye iwu ka e were ụdọ kwụgbuo ya gbaa ya ọgwụike ga-egbu ya ọsịsọ.
Kedụ ka ihe a si mee?
Nke a mere n’ụbọchị 11 Disemba, 2017 mgbe ụkọchukwu ahụ gburu Ezenwa na Onweagba n’otu ụlọ a na-arụchabeghi arụcha.
Onweagba dị ime ọnwa ise ma kuru nwa kwọrọ nwa dị ọnwa itoolu n’azụ mana nwa ahụ nwụrụ mgbe Onweagba dara n’ala site n’aka ụkọchukwu kwara ya.
Okoroafor kpara arụ a iji kpuchie iko ọ na-akwaso onyendu ndị ọbụ abụ ya bụ Concilia Ezenwa onye ọ tụwara ime mana ọ jụrụ iwepu ime ahụ.
Ndị ezinaụlọ ndị a o gburu mere mkpesa n’aka ndị uweojii mgbe ha mailtere ịchọ ha achọ dịka ha gara ịhụ ụkọchukwu iji mara etu a ga-esi mee ime ahụ ọ tụwara Concilia.
Ụkọchukwu ahụ kpọrọ ha gawa n’ime ọhịa ma gbuo ha atọ n’ebe dị iche iche ma lie ozu ha n’obere ili o gwuru.
Ndi uweojii na ndị obodo bọpụtara ozu Onweagba na nwa ya n’ime ọhịa dị n’ụzọ Afam-Igberu n’ụbọchị 13 Disemba 2017.
Ebe a hụrụ ozu Ezenwa n’ụbọchị 18 Disemba, 2017 n’otu ụlọ a na-arụchabeghi dị n’obodo Izuoma, Oyigbo.
A kpụpụrụ ụkọchukwu Okoroafor n’ụlọikpe n’afọ 2018 n’ebubo igbu iko ya nwaanyị, Concilia Ezenwa, nakwa Uluoma Onweagba na nwa ya dị ọnwa itoolu.
A kpọchiri ụkọchukwu a dị afọ 32 n’ụlọmkpọrọ bụ ebe ọ nọ ruo ugbua a mara ya ikpe ọnwụ.
Ụlọikpe ekpeteghi ikpe a - Ọkaiwu onye ụkọchukwu Okoroafor
Ọkaiwu gọọmenti n’ikpe ahụ bụ Precious Ordu kwuru na obi dị ya ụtọ n’ikpe ahụ mana Innocent Ekwu bụ ọkaiwu na-anọchiteanya ụkọchukwu a sị na ha ga-agbagha ikpe ahụ, na ụlọikpe a ekpeteghi ikpe ahụ.
Ekwu sịrị “Ụlọikpe a sị na e nweghi onye akaebe hụrụ ka ihe si mee kamgbe ikpe a malitere.
“Ụlọikpe kwukwara na o nweghi ihe akaebe ha ji n’ikpe ahụ mana ha mara ụkọchukwu Okoroafor ikpe site na nkwupụta ọnụ ya.
“Ya mere dị ka ndị na-anọchiteanya ụkọchukwu Okoroafor, anyị ga-agbagha ikpe ọnwụ ahụ e kpere ya.”









