World Food Safety Day: Kedụ ụzọ na usoro ị kwesịrị ịgbaso iji chekwaa ihe oriri gị ma zeere ọrịa?

Ụbọchị asaa nke ọnwa June afọ ọbụla bụ ụbọchị otu mba ụwa bụ United Nations wepụtara iji dọọ aka na ntị maka mkpa ọ dị ichekwa ihe oriri, a na-akpọ ya na bekee ‘World Food Safety Day’.
Kwa afọ ọbụla, ọnụọgụgụ ọrịa nke a na-ebute site n’ihe oriri, nke bekee na-akpọ foodborne illnesses’ na-akarị nde narị isii n’ụwa niile.
Ebe ihe dịka mmadụ puku narị anọ na puku iri abụọ na-anwụ kwa afọ, n’ihi nje sitere na nri ha riri eri,pasentị iri anọ n’ime ha bụ ụmụaka na-erubeghi afọ ise.
Ya mere taa, ọ bụrụ na ị bụ onye nri na-amasị dịka m, ọ dị mkpa ịmata ụzọ nakwa usoro dị icheiche ị kwesịrị ịgbaso iji chekwaa ihe oriri gị ma zeere ọrịa, ahụ mgbu nakwa oge ụfọdụ ọnwụ, nke i nwereike iji aka gị ritere onwe gị.
Lee usoro anọ ị ga-eji chekwaa onwe gị nakwa ihe ihe oriri gị
Ịdị ọcha:
Were mmiri na ncha kwọchaa aka gị ihe ruru timkọmtimkọm iri abụọ tupu ị malite isi nri. Dịka ị na-esi nri, ọ bụrụ na ị metụchaa anụ ndụ, azụ ndụ maọbụ akwa aka, ị kwesịrị ịkwọchapụ aka gị tupu i siri gawa.
Werekwa mmiri na ncha sachaa ite na ngwa ndị ọzọ iji esi nri nakwa ndị iji ebe ihe nri tupu ị malite isi nri nakwa oge i sichara.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ṅachaa mkpụrụosisi na akwụkwọ nri gị nke ọma na mmiri na-agba agba tupu i tinye ha na nri
Dopu iche
Oge ị na-etinye ngwanri gị n’igwe njụ oyi maka nchekwa, ọ dị mkpa idopu anụ ndụ, azụ, akwa na ndị ọzọ dịka ha iche. Ekwela ka mmiri si na ha metụta na ngwanri ndị ọzọ.
I kwesịrị inwe ihe e ji ebe nri abụọ, otu maka anụ ndụ, azụ na ndị ọzọ yiri ya, nke ọzọ maka ngwanri dịka akwụkwọ nrị, achịcha na ndị ọzọ.
Sie nke ọma
Isi nri ka o ghee eghee nke ọma, ọ kachasị anụ, bụ otu ụzọ ị ga-esi gbuo nje niile dị na ya ka ha ghara inye nsogbu ọbụla ma mmadụ ribaa ha n’afọ. Ya mere ọ dị mkpa isi anụ gị nke ọma tupu i rie.
Ọ dịkwa mkpa ịdakwa nri nke ọma ma ha jụọ oyi tupu ị malite iri ha ọzọ, maka na nje dị icheiche na-amụba ngwangwa na nri ma ha jụọ oyi.
Tinye n’igwe njụoyi
Gbaa mbọ hụ na igwe njụoyi gị na nke na-akpọ nri bụ freezer na-arụ ọrụ nke ọma oge niile.
Kunye nri dị ọkụ n’obere obere efere me tinye ha n’ime njụoyi maka na ọ ga-eme ka ọ jụọ oyi ngwa ngwa.
Ngwanri ndị na-emebi emebi dịka anụ, azụ, ụfọdụ mkpụrụosisi na akwụkwọ nri, kwesịrị ka e tinye ha n’igwe njụoyi n’ime otu awa maọbụ abụọ e ji zụta ha
Ọ bụrụ na nri e rifọrọ erifọ nọkarịa abalị atọ maọbụ anọ n’igwe njuoyi gị, biko tufuo ya.
Matakwa o na ihe a Bekee na-akpọ, ‘food poisoning’ apụtaghị naanị mgbe mmadụ tinyere nsi na nri mmadụ ibe ya ga-eri.
Mmadụ nwekwara ike iji aka ya nye onwe ya nsi, n’ihi agbasoghi ezi usoro nchekwa nri.
Ndụ dị na ntị o!














