Living with diabetes: Ihe onye nwere ọrịa shuga ga-eme ka ọ gbanarị ibepụ ya ụkwụ

Aha onyonyo, People living with diabetes: Ihe onye na-arịa ọrịa shuga ga-eme ka ọ gbanarị ibepu ya ụkwụ
Living with diabetes: Ihe onye nwere ọrịa shuga ga-eme ka ọ gbanarị ibepụ ya ụkwụ

Otu nwada nwere ọrịa shuga akọwaala ihe ọ gabigara ma nye ndụmọdụ ihe ga-eme ka ndị nwere ọrịa a gbanarị ibepụ ha ụkwụ.

Na mkparịtaụka ya na ngalaba BBC na-ahụ maka ahụike nwere, nwada a bụ Osarenkhoe Ethel Chima-Nwaogwugwu sị na o nwere ọrịa shuga a kpọrọ 'type 2 diabetes'.

Ọ sị na mgbe ọ chọpụtara na o nwere ọrịa shuga bụ mgbe ọ dị ime nwa ya nke abụọ nakwa nwa ya nke atọ.

Ọ sị na ọrịa shuga a mechuru ya ihu nke ukwuu nke bụ na mmammịrị na-akpa ya tupu ọ na-eru n'ụlọmposi na ihe niile agbajuola dọrọ.

Nwaogwugwu sị na 'diabetes' tinyere ya ụjọ n'ahụ ma a gaara ibepu ya ụkwụ makana ọ bụ site n'ibepu ụkwụ ka nne ya jiri nwụọ.

Ọ sị na otu aka ahụ na nwanne ya nwaanyị nwekwara ọrịa shuga nke mere ụkwụ jiri na-ere ere.

Otu onye dọkịta sị na ọ bụ ọrịa shuga na-ebutekaarị ụkwụ mmadụ ụkwụ, mere e ji ebepu ya.

Ọ sị na mmadụ pasentị iri isii maọbụ iri ise nwere ụkwụ orire na-esikaarị n'ọrịa 'diabetes'.

Ụkwụ onye nwere ọrịa shuga

Etu onye nwere ọrịa shuga ga-esi chekwaa ụkwụ ya ka a ghara ibepu ya ụkwụ

  • Dọkịta a sị na onye nwere ọrịa shuga kwesịrị ịna-enyocha ụkwụ ya kwa mgbe kwa mgbe, lee anya n'ime mbọ ya nakwa n'etiti mkpịsị ụkwụ ya.
  • Gbalịa hụụ na o nweghi mmerụ ahụ n'ụkwụ ya, maọbụ ụkwụ ya ịchagharị n'ụdị dị aṅaa.
  • Ka onye ahụ ghara iji agụba (razor) ebe mbọ ya ka ọ ghara imerụ ya ahụ kama ka o jiri nke a kpọrọ 'nail cutter'.
  • Gbaa mbọ yiri akpụkpọ ụkwụ dị ụkwụ gị mma, ga-eme ka ị ghara ịda maọbụ nke ga-eme ka mkpịsị ụkwụ gị gbagọọ.

Kirie ihe onyonyo a n'uju;