Gịnị mere ndị ndu mbaụwa ji agbakọ na UN?

Otu United Nations

Ebe foto si, Getty Image

Ajụjụ banyere nkwalite mba ụwa na-etu a ga-esi egbo nsogbu mgbanwe ihu igwe bụ ihe ga-abụ isi okwu oge ndị ndu mba ụwa ga-ezukọ na ọgbakọ 'United Nations General Assembly' na New Yọk.

Agha na-ada na Yukren nwere ike ịbụ isi sekpụ nti na ihe a ga-akpa.

Gini bụ 'United Nations' n'ọgbakọ ya bụ 'General Assembly'?

Otu 'United Nations' n'ọnụọgụgụ . [ 1945 Afọ otu a malitere ],[ 51 Ndị nọ n'otu a na mbido ],[ 193 Mba dị n'otu a n'afọ 2023 ],[ 2 Ndị anọghị na otu a ],[ 2011 Afọ Saụt Sudan batara otu a ọhụrụ ], Source: Ebe ozi a si: United Nations, Image: The chamber at the United Nations headquarters in New York

Otu 'United Nations' bụ otu mbaụwa e hiwere n'afọ 1945 ka a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ nke ebunnobi ya bụ udo nke ụwa.

Ugbo a e nwere mba 193 so na ya bụ ndị otu ahụ n'ime mmụọ na n'ezi okwu , ma nwe mba abụọ ji otu ụkwụ kwụrụ- the Holy See (ebe Rome bụ ebe Popu na-achị) na steeti Palestine.

Ọgbakọ 'UN's General Assembly (UNGA)' bụ nnukwu ọgbakọ ebe otu a na-ekpebi ihe ha kwesịrị ime.

Nke a bụ ọgbakọ mba 193 nọ n'otu ahụ na enwe onye na-anọchite ha.

A na-enwe ọgbakọ zuzugbe a ( General Assembly) kwa ọnwa Septemba n'isi ụlọọrụ UN dị na Nu Yọk.

N'afọ a, ọ malitere n'abalị ise nke ọnwa Septemba.

Mana ọtụtụ ndị ndu n'ụwa bụ n'abalị 18 nke ọnwa Septemba ka ha ga-abịa ọgbakọ ndị bụ isis a hụrụ kwawa okpu.

Kedụ ihe a ga-akpa n'ọgbakọ'UNGA'?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọgbakọ nke ga-eme n'ala 18 na 19 nke ọnwa Septemba bụ ebe mba dị iche iche ga-akpa maka atụmatụ mmepe obodo tọrọ atọ(sustainable development) etu ha ga-esi mejupụta ebumnobi nkwalite atụmatu mmepe tọrọ atọ( UN's "sustainable development goals).

Nke a gụnyere ịkwụsị agụụ na ụbịam n'ụwa, ikwalite mkpata ego nakwa agụmakwụkwọ n'ụwa nakwa ime ka ezi mmiri ọṅụṅụ na gburugburu dị ọcha rute mmadụ nile aka.

Ndọrịta ụka (General Debate) ga-adị malite na'abalị 19 nke ọnwa Septemba rue abalị 23 nke ọnwa Septemba, ma gaa n'ihu n'abalị 26 nke ọnwa Septemba.

N'ọgbakọ ndị a, ndị nnọchiteanya si mba ọbụla dị na UN nwere ohere ikwu okwu. maọbụ kpalite okwu metụtara ha.

Ọgbakọ banyere ihu igwe( Climate Ambition Summit) ga-adị n'abalị 20 nke ọnwa Septemba.Ebumnobi ọgbakọ a bụ ime ngwangwa ka e meghara nsogbu so mgbanwe ihu igwe(climate change).

E nwekwara ọgbakọ banyere itinye ego na nkwalite akụnaụba, ọrịa zuru mba ọnụ nakwa ịnapụ ndị nwere ngwa agha nuklia.

A na-ahọpụta onyeisi ọgbakọ UNGA kwa afọ. N'afọ a, onyeisi ya bụ Dennis Francis, onye ọrụ mmekọrịta mba na ibe ya si mba Trinidad na Tobago.

Kedụ ihe a na-eche nwere ike isi n'ọgbakọ 'UNGA' pụta?

Ọgbakọ 'UNGA' na-enye ohere ka ndị isiala mba dị iche iche nọkọ ọnụ n'otyuu ebe nke Bekee kọwara dịka "diplomatic speed dating" .

Uru pụrụ iche a na-erite na ọgbakọ UNGA bụ ohere ndị ndu mba dị iche iche inwega obere ọgbakọ n'akụkụ dịka ya bụ nnukwu ọgbakọ na-aga.

A na-ataụ anya na onuyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-abịa nakwa na o nwere ike ikwu okwu n'ọgbaka otu nchekwa na United Nations bụ 'UN Security Council' banyere agha na-ada n'ala ya.

Mana,onyeisiala Vladimir Putin nke Roshia, Onyeisiala China bụ Xi Jinping na nke Fransị bụ Onyeisiala Emmanuel Macron agaghị abịa.

E nwere akụkọ na-ekwu na Praim Minista mba Briten bụ Rishi Sunak agaghị abịa.

Kedụ ka e si eme ndọrịta ụka UN (UN's General Debate)

Omenala bụ na onye mbụ na-ekwu okwu na-abụkarị onye ndu mba Brazil maọbụ onye na-anọchite ya.

Ndị na-eso ya bụ Amerịka bụ ha ndị na-ele ndị mba ọzọ ọbịa.

Brazil malitere emume a n'ihi na oge a malitere ọgbakọ a, onweghị ndị na-ekwe ebu ụzọ nke mere ka ha hara ịbụ ụzọ kwuo okwu., e si etu ahụ malite meewe ya otyu ahụ.

N'oge emume a, onye ndu mba ọbụla maọbụ onye na-anọchite ya na-agwa ọgbakọ ahụ okwu.

Ha nwere ohere iji otu n'ime asụsụ isi UN bụ: Asụsụ Arabic, Chinese, Bekee, Frenchị, Rọshịa na Spanish.

A na-agwa ndị na-ekwu okwu ka ha gbubie okwu ha ka ọ bụr u naanị nkeji 15, mana ọtụtụ mgbe a naghị edowe iwu ahụ.

Fidel Castro nke Mba Kuba bụ onye a ma dịka onye kacharala kwuo okwu n'ọgbakọ ahụ ogologo oge- o kwuru okwu awa anọ na ọkara n'afọ 1960.

Ndị bịara ọgbbakọ ahụ na-anọ dịka mgburu ABCHỊ aka ha ma a tapịa ya na Bekee. Manaz mba na-anọ n'oche mbụ na-abụkarị otu UN na-ahọpụta ha.

N'afọ a, ọ bụ Nọt Macedonia.

Kedụ ihe ndị meburu n'ọgbakọ 'UNGA' a gaghị echefu echefu?

N'afọ 2019, nwa afọ mba Swidin na-alụ ọgụ maka nchekwa gburugburu bụ Greta Thunberg, bụ onye dị afọ 16 oge ahụ gwara ndị ndu mba ụwa n'ọgbakọ maka ihu igwe(UNGA's Climate Action Summit) sị:: "Ụnụ ejirila okwu enweghị ihe ọ pụtara zuru ihe ndị m na-arọ nrọ ya nakwa ndụ m dịka nwata. Onye nyere ụnụ ikike?""

N'afọ 2017, Donald Trump bụbu Onyeisiala mba Amerịka kwuru na Onyeisiala mba Nọt Koria bụ Kim Jong-un bụ: "Nwoke rọketị chọrọ ịkwugbu onwe ya."

N'afọ 2009, Onyeisial Libya bụ Konel Gaddafi kwuru okwu otu awa na ọkara, kwụkata sị na ndị bịara ọgbakọ ahụ na-apụsịsị n'ụlọ ọgbakọ ahụ.

O bokwara ebubo na ndị kachasị ike na mba ụwa na-arapụta nkwenye e jiri hiwe otu UN nke Bekee kpọrọ, "UN Charter' tupu ọ tụọ akwụkwọ ahụ n'ala.

N'afọ 2006, Onyeisiala mba Venezuela bụ Hugo Chavez kpọrọ Onyeisiala mba Amerịka oge ahụ bụ George W Bush, "ekwensu".

O kwuru na ebe nkwụba(podium) Bush kwụ kwuo okwu n'ụbọchị fotara ụbọchị ahụ n'esi 'sulphur' sulphur".