Ọkpụrụkpụ ihe ndị isi ọchịchị n’ụwa kpara n’ọgbakọ COP27

Ndị isi ọchịchị na mbaụwa dị iche iche bịara emume COP27 n'Egypt.

Ebe foto si, COP27

Nkọwa foto, Ndị isi ọchịchị na mbaụwa dị iche iche bịara emume COP27 n'Egypt.

Ndị isi ọchịchị si akụkụ ụwa dị iche iche amalite ikwu okwu n’ọgbakọ ụwa nke UN hibere bụ COP27 maka okwu mgbanwe ihu eligwe n’ụwa.

Ọgbakọ a na-aga n’ihu na mba Egypt malitere n’ụbọchị Mọnde dịka a na-akpa maka etu aga esi echepụta echiche ọhụrụ maka nchekwa gburu gburu ụwa nakwa ihu eligwe.

Ọgbakọ gakwa n’ihu chere ndị ọchịchị ụfọdụ nkwa ndị ha kwere banyere itinye aka mgbochi ihe ndị na-emetọ ihu eligwe anyị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres

Iji mepee ọgbakọ a, onyeisiala mba Egypt bụ Abdel Fattah El-Sisi kwuru na ka ọ dị ugbua, “Ihe ize ndụ ole m ole emeela n’akụkụ ụwa dị iche iche” ma kwukwa na ọ dị zị ka ‘Ụwa anyị abụ ebe ahụhụ ugbua.’

O kwukwara na mba dị iche iche ga ejikọ aka ọnụ rụọ ọrụ ichekwa ụwa anyị.

Onyeisi otu jịkọrọ ndị mba Afrịka nakwa onyeisiala Senegal bụ Macky Sall kwuru na mba ndị Afrịka na-agba mbọ ịhụ na ha belatara aka na mmepụta ikuku anwụrụ ọjọọ bụ Carbon agbanyeghị na Afrịka bụ ebe na-emepụta naanị pasentị anọ ikuku a.

O kwuru na ndị “Kacha emepụta ikuku ọjọọ ndị a kwesịrị ịbụ ndị nọ n’ihu ndaju ya bụ ihe n’ụwa.”

Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres kwuru n’oge okwu nke ya na ‘ka ihe ize ndụ na-eme n’ụwa aghara aghara, enweghị etu ụwa ga-esi dichaa njikere maka ha ncha.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ụmụ ụwa ji ọsọ na-agbaba n’ọkụ ma na-achọghị ilee anya n’azụ.

Onyeisiala mba Seychelles, bụ Wavel Ramkalawan

Ebe foto si, COP27

Nkọwa foto, Onyeisiala mba Seychelles, bụ Wavel Ramkalawan
Praịm minista mba Barbados bụ Mia Mottley.

Ebe foto si, COP27

Nkọwa foto, Praịm minista mba Barbados bụ Mia Mottley.

Ka ọ dị ugbua, mkpomọkụ ụwa ariala elu ruo 1.1C kemgbe mmụba ụlọọrụ ukwuu dị iche iche dịka ndị ọkachamara Sayensị na-ekwu na a ga-agba mbọ gbochie mkpomọkụ a ruo 1.5C tupu afọ 2100 ma ọ bụrụ na ụwa achọghị ihu oke mbibi.

Ndị ọkachamara na-ekwu na ndị ọchịchị ga n’ihu na-eleli ọnọdụ mgbanwe ihu eligwe anya, mkpomọkụ ụwa ga-arị elu ruo 2.8C n’oge adịghị anya nke ga-ebute oke mbibi.

Mba ndị na-enweghị ka ọ hara ha na-achọ ka a malite inye ha ihe iti aka n’obi ga-esi n’aka ndị mba mepere emepe bụ ebe mmepụta ikuku ọjọọ ndị na-emetọ ihu eligwe bụ ‘atụrụ tawa’.

Al Gore bụbu Osote onyeisiala mba Amerịka.

Ebe foto si, COP27

Nkọwa foto, Al Gore bụbu Osote onyeisiala mba Amerịka.

Al Gore bụbu osote onyeisiala mba Amerika kwuru na ọtụtụ n’ime ndị mba mepere emepe na-agba ọsọ egwupụta mmanụ agbidi n’Afrịka mana ha achọghị ime ihe ha kwesịrị.

Praịm minista mba Barbabos bụ Mia Mottley kwuru okwu banyere etu ndị isi ọchịchị n’ụwa si akpagbu ndị ọzọ ma na-egbochikwa atụmatụ ‘e tinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a’.

Ọ gara n’ihu kwuo na nke a so akwanye ọkụ na ihe ndị na-egbochi njịkọ aka ọnụ n’ọrụ mbelata mgbanwe ihu eligwe.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ga-abịa ọgbakọ ahụ n’izuụka na-abịa abịa gụnyekwara onyeisiala Brazil ọhụrụ bụ Luiz Inacio Lula da Silva.

Onyeisiala mba China bụ Xi Jinping egosighi mmasị ịbịa mana ọ ga-ezute onye nnọchịteanya.

 India abịaghị, Russia abịaghịkwa dịka ha natara ọtụtụ ntaramahụhụ n’aka ndị isi ụwa dị iche iche kemgbe ha malitere iwakpo Ukraine.

Mgbe ndị isi ọchịchị ụwa nwere nkwekọrịta ‘Paris Agreement’ n'afọ 2015.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ndị isi ọchịchị ụwa nwere nkwekọrịta ‘Paris Agreement’ n'afọ 2015.

Ihe ị kwesịrị ịma maka nkwekọrịta ndị isi ọchịchị ụwa nke ‘Paris Agreement’

Dịka ndị isi ọchịchị n’ụwa nọ n’ọgbakọ COP27 a n’Egypt, a na-akwanye ha ọkụ n’ike ka ha mezuo ihe ndị ha kwere na nkwa na Paris ebe afọ asaa gara aga banyere ibeleta aka na mmepụta nakwa igbochi ihe ndị na-emetọ ihu eligwe.

Nkwekọrịta ‘Paris Agreement’ a jịkọrọ ọtụtụ mba ụwa dịka ha gbara izu kwete na ha ga-amalite ndaju mmepụta ikuku ọjọọ ndị na-emetọ ihu eligwe nke bụ ihe di ukwu mgbe ahụ.

Ha kwekọrịtakwara na ha ga-enyere mba ndị na-enweghị ka ọ hara ha aka n’atụmatụ ahụ ma kwetekwa na ha ga-agba mbọ hụ na egbochiri mkpomọkụ ụwa iri elu ruo 1.5C.