COP27: Etu ụfọdụ ihe ị na-eme si akwalite mgbanwe ihu eligwe

Aha onyonyo, COP27: Etu ụfọdụ ihe ị na-eme si akwalite mmetọ ihu eluigwe
COP27: Etu ụfọdụ ihe ị na-eme si akwalite mgbanwe ihu eligwe

Ọgbakọ UN banyere mgbanwe ihu eliigwe nke a na-eme kwa afọ ga-amalite taa bụ Sọnde, ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2022 na mba Egypt. Isiokwu ọgbakọ a bụ ‘watershed moment’.

N’ọgbakọ a nke ndị isi ọchịchị ruru 200 si mba dị iche iche ga-akpa maka etu a ga-esi balata mmetọ ihu eluigwe nke na-emetụta ndụ ndị mmadụ n’ụwa niile n’ụzọ ọjọọ.

A ga-akpakwa ụzọ a ga-eji belata mmepụta ikuku anwụrụ na-etinyeaka na mmetọ a, inyere mba dị iche iche aka n’atụmatụ ịkwado mgbochi mgbanwe ihu igwe, Ịtọkọrọ mba ndị na-emepe emepe teknụzụ na ego maka atụmatụ ndị a.

Mgbanwe ihu eligwe na-emetụta mmadụ niile ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya.
Nkọwa foto, Mgbanwe ihu eligwe na-emetụta mmadụ niile ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ikuku anwụrụ ọjọọ na-esi na mmepụta ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala so isi sekpụ ntị n'okwu mmetọ ihu eligwe.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ikuku anwụrụ ọjọọ na-esi n'ụlọọrụ mmepụta ọkụ latrịk na mmanụ ụgbọala so isi sekpụ ntị n'okwu mmetọ ihu eligwe.

Kedụ etu mgbanwe ihu eluigwe si emetụta gị?

Ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme so akwanye ọkụ na mgbanwe ilu eligwe nke na-emezị ka n’akụkụ dị iche iche dị ezigbo ọkụ ebe akụkụ ndị ọzọ ga-ajụzị ezigbo oyi.

Nnyocha sayensị egosikwala na mgbanwe ihu eluigwe na-eme ka oke mmiri ozizo na-eme n’akụkụ ụfọdụ ebe enweghị mmiri ozizo nakwa ala ọkpọ nkụ ga na-eme n’akụkụ ndị ọzọ.

N’afọ a, idemmiri so oke mmiri ozizo kpara ike n’akụkụ ụwa dị iche iche nke gụnyere Palestine, China, nakwa Naịjirịa.

Mgbanwe ihu eligwe akpalịtekwala mmụbawanye ọtụtụ ọrịa dị ịche ịche. Nke a mere ndị isi ọchịchị ụwa ji agbakọta ọnụ ka amalite ịchụ ewu ojii mgbe chi dị tupu chi ejie.

Ụgbọala dị iche iche na-emepụta ikuku ọjọọ na-emetọ ihu eluigwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọala dị iche iche na-emepụta ikuku ọjọọ na-emetọ ihu eluigwe

Kedụ ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-eme na-akwalite mgbanwe ihu eluigwe?

Iji ụgbọ dị iche iche eme njem: Ụgbọala, ụgbọelu nakwa ụgbọmmiri ụfọdụ na-eji ọtụtụ mmanụ na-emepụta ikuku anwụrụ ọjọọ na-emetọ ihu eluigwe n’ụzọ ọjọọ. A na-achọ ụzọ a ga-eji belata iji ụgbọ ndị a mee njem nakwa etu a ga-esi chọọ ụzọ ọzọ na-amụnye ha ọkụ nke na-abụghị mmanụ ụgbọala maọbụ mmanụ ụgbọelu.

Ịmụ ọkụ latrịk: A na-ejikwa mmanụ ụgbọala emepụta ọkụ latrịk nke so etinye ka n’ọnọdụ ọjọọ ụwa nọ n’ime ya ugbua. Ndị na-enweghị ọkụ latrịk na-ejikwa igwe eji amụ ọkụ latrịk etinye ọkụ na be ha. Igwe ndị a na-ejikwa mmanụ ụgbọala nke na-emepụta anwụrụ ọjọọ.

Ndị ọrụ ugbo

Ebe foto si, AFP

Mmepe obodo: Ọtụtụ mgbe atụmatụ mmepe obodo na-akpata mbetụ ọtụtụ ukwu osisi nakwa ahịhịa. Ukwu osisi ndị a na ahịahịa nọ ha nso na-enyere aka amịpụ ikuku anwụrụ ọjọọ mana ebetuo ha, ya bụ ikuku ọjọọ ga-ejupụta ebe niile ma na-emetọ ihu eluigwe.

Ọrụ ugbo na ọzụzụ anụmanụ: Ọtụtụ usoro mmepụta nri nakwa ịkọ ọrụ ugbo na-ebute mmepụta ikuku ọjọọ dị iche iche nke gụnyere ‘carbon dioxid’, ‘methane’, nakwa ikuku gasị ndị ọzọ na-ekpo ọkụ ma na-emetọ ihu eligwe n'ụzọ dị iche iche. Nke a gụnyere atụmatụ ọrụ ugbo ndị na-igbutu osisi nakwa na-ekpochapụ ala ebe ahịahịa dị maka ọrụ ugbo na mmepụta nri. Ihe ndị ozo na-emetọkwa ala na ihu eligwe eji akwalite owuwe ihe ubi bụ ‘fertilizer’ sokwa etinyeaka n’ọnọdụ ọjọọ a.

E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ so emetọ ihu eligwe dịka mmepụta plastịkị nke e ji eme ọtụtụ ihe gụnyere uwe, ngwa ọrụ dị ịche ịche, ihe teknzu, akpa wakịrị wakịrị wdgz.

Ọtụtụ na-ajụzị “Kedụ ihe anyị ga-eme nyere onwe anyị aka?”

Otu ihe dị mkpa bụ mmadụ niile ime mmụta na okwu, ihe ndị ọzọ bụ itinyeaka na mgbasaozi banyere ya, ịchọ ụzọ etu o kwere onye belata aka na ihe ndị ga-akwanye ọkụ na mmetọ ihu eluigwe, ịge ndị ọchịchị ntị n’atụmatụ nchekwa ihu eligwe ọbụla nakwa ikuziri ndị nọ gị nso banyere okwu a.

 Kirie ihe onyonyo dị n'elu akụkọ a ka ị mụta ụfọdụ ihe ndị dị mkpa n'okwu a.