Ọ ga-atụ ha n'anya, aga m abụ Gọvanọ Legọs - Gbadebo Rhodes-Vivour
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Reporter na Shoot/Edit
- Ebeg o si, Lagos
Legọs bụ steeti kacha nta na Naijiria n'ihe gbasara oke ala, mana ọ bụ ya bụ steeti kachc na Naịjirịa n'ọnụ ọgụgụ mmadụ nakwa akụnụba.
Ihe ọbụla mere ka ọnọdụ akụnụba Legọs maa jijiji emetụtala ọnọdụ akụnụba Naịjirịa niile. Nke a mere o ji dị mkpa na Gọvanọ na-achị Legọs steeti ga-ama ihe ọ na eme ma dịkwa uchu n'ọrụ ya.
Dịka ntuliaka Naịjirịa na-abịa nso, Gbadebo Rhodes-Vivour, onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Legọs steeti na'Labour Party' na-ekwu na ya ga-arụ ọrụ ahụ nke ọma karịa ndị nọ n'ọchịchị ugbua.
GRV dịka ndị nkwado ya si akpọ ya kwuru na ọchịchị aka ike, nrụrụaka na wuruwuru emeela ka Legọs steeti bụrụ ebe naanị ndị nọ n'ọkwa ọchịchị, maọbụ ndị bụ enyi ndị ọchịchị na-erite uru.
"Mana ọchịchị m ga-eme ka mmadụ niile, ma ndị okenye ma ndị ntorobịa, ma ụmụnwaanyị nọ n'ahịa, rite uru," Rhodes-Vivour kwuru.
"Ihe mbụ ọchịchị m ga-eme bụ ịgba akwụkwọ ego Legọs steeti n'anwụ ka onye ọbụla hụ etu ego si abata ma na-apụkwa n'akpa gọọmentị.
"Ka ọ dị ugbua, ihe niile zoro ezo n'ihi nrụrụaka ndị ọchịchị."

Gbasara mpụtara ngagharịiwe End SARS

Ebe foto si, Grv Lagos
Gbadebo Rhodes-Vivour kwuru na ya ga-arụ ihe ncheta maka ndị niile ndị ọrụ nchekwa gburu n'oge ngagharịiwe End SARS n'afọ 2020.
O kwuru sị: "Ruo taa, anyị ka na-ajụ Gọvanọ Legọs Babajide Sanwo-Olu onye nyere ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha gbaa ndị na-eme ngagharịiwe egbe," Rhodes-Vivour kwuru.
"Onye ọbụla hụrụ n'ụbọchị ahụ etu ụgbọala gọọmentị si buru ndị agboro bịa ebe a na-eme ngagharịiwe, ha ewere mma na okpiri na-awakpo ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe. Onye kpọtara ndị ntorobịa ahụ?"
Gbasara osote ya bụ Islamiyat Oyefusi

Ebe foto si, Relevance Touch
Rhodes Vivour kọwakwara maka osote ya bụ Islamiyat Oyefusi, onye o kwuru na ọ bụ ọkaiwu nwetara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ dị icheiche na Naịjirịa nakwa mba ofesi.
"Ọ bụ onye ndu zuru oke, nwere ahụmihe dị icheiche n'ịkwalite ụmụnwaanyị ịbụ ndị ndu," ka o kwuru.
Gere mkparịtaụka a n'uju nke ndị mere ya bụ Chukwunaeme Obiejesi na Okechukwu Omeire.















