Bola Tinubu Vs Donald Duke : Kedụ ihe na-ese n'etiti Duke na Tinubu?

Ebe foto si, Donald Duke/Bola Tinubu/Facebook
Ndị mgbasa ozi onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu ekwuola na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ha arịọla mgbaghara maka iji foto Donald Duke oge ọ dị na nwata si na ọ bụ nke Tinubu n'akụkọ maka Tinubu.
Nke a na-abịa dịka akwụkwọ mgbasazi ozi nke a si ọnyeisi mgbasaozi Tinubu bụ Bayo Onanuga binyere aka rịọrọ mgbaghara maka itinye foto Donald Duke n'ihe onyonyo sị na ọ bụ Tinubu na nwata.
N'ozi ahụ kwuru na Tinubu amaghị maka ya bụ ihe kama, na ndị na-akwado ya ya mepụtara ihe onyonyo e ji ajụrụ ya nta vootu tinye foto ahụ na-ajụghị ese.
Ozi ahụ kwuru na ọ bụ "ndahie" nke ndị jịkọtara ihe onyonyo ahụ mere.
Mana Onyeisi mgbasaozi Tinubu bụ Bayo gwara BBC Igbo n'ozi ahụ na-efegharị na soshal midia bụ akwụkwọ adigboroja, na o sighị n'aka ha.
Ọ sịrị, : "Ozi ahụ esighị n'aka anyị."
O nyeghị nkọwa ọbụla banyere ihe mere na foto bụ ihe e ji mee akụkọ onyonyo ndụ Tinubu.
Nsogbu dapụtara n'abalị 27 nke ọọnwa Novemba oge aka chịburu Krọs Riva steeti bụ Donald Duke wepụtara ihe onynoyo n'akara Facebook ya bụ ebe ọ gbarụrụ ihu na e ji foto o sere oge ọ dị afọ 12 na Sokoto steeti were mee ihe onyonyo si na ya bụ Tinubu.
Ihe Donald Duke kwuru

Ebe foto si, Donald Duke
Duke sịrị, "Enwere ihe onyonyo e mere a kpọrọ "Nation Builder".
"Ọ dị mma mana ihe na-ewute m bụ na foto oge m dị afọ 12 na Sokoto."
"Amaghị ma aga enweta ikpenkwụmọtọ na ya bụ okwu mmadụ."
"O gosiri na ọnọdụ nrụrụtaụka n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị akụọla afọ n'ala n'ebe ọ dị ukwu."
Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka foto ahụ
Kemgbe akụkọ maka foto ahụ gbara na soshal midia, ọtụtụ ụmụ Naijiria akatọọla ya bụ ihe.
Ụfọdụ kwuru na ọ bụ ihe jọgburu udele ,sigbuo nkapị n'isi iwere foto mmadụ dịka nke onye ọzọ.
Otu onye kpọrọ onwe ya @vsntongv.s kwuru na ọ bụrụ ya bụ Donald Duke na ọ ga- eji ha kpa ego maka izuru njirimara ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@SEzekwesịli sịrị na ya chebu na akụkọ ahụ bụ ụgha were ruo oge ya hụrụ ebe Duke na-ekwu maka ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọ gbara @novieverest gharịị na o nweghị onye nọ n'otu mgbasaozi Tinubu hụrụ foto ahụ sị ya na foto amaka ịbụ foto Tinubu oge ọ dị na nwata.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@Chymaker kwuru na ọ bụ ihe ihere ịkpa ụdị agwa a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

End of X post, 5
Ihe ndị na-akwado Tinubu kwuru
Mana dịka ụfọdụ na-akatọ Tinubu, ndị na-akwado onye a na-efere otu APC ọkọlọtọ na ntuliaka 2023 kwuru na akụkọ ahụ bụ imeghara ndị mmadụ anya.