Coronavirus Lockdown: Ihe mere anyị ji kpọpee Legos - Gọvanọ Sanwo-Olu
Legọs bụ steeti ọrịa coronavirus kacha akpa ike na Naịjirịa.
Ọrịa a egbuola ihe karịrị mmadụ iri atọ na steeti ahụ, ebe ihe karịrị mmadụ narị asatọ ka bu ya.
Nke a mere gọọmentị ji kpọchie elu na ala ma tie iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ime ụlọ ya.
Mana ka izuụka isii gachara, gọọmentị nyekwara iwu ka a kpọpee obodo ka ndị mmadụ malite kpagharịwa ntakịrị ntakịrị.
Ha mere nke a n'agbanyeghi na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus ka na-agbali elu.
Aka na-achị Legọs bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu kọwara na ọ bụ n'ihi akwa agụụ ndị mmadụ na-ebegara gọọmentị so na ihe mere ha ji sị ka a kpọghetụ obodo obere.
Gere mkparịtaụka ya na BBC n'ihe nkiri dị n'elu.




