Ọkaiwu ukwu nke Legọs steeti akpụpụla onyeuweojii gburu Bolanle Raheem ụlọikpe

Ebe foto si, Lagos State Government
Ọkaiwu ukwu nke Legọs steeti bụ Moyosore Onigbanjo akpụpụla Drambi Vandi bụ onye uweojii gbagburu ọkaiwu Bolanle Raheem ụlọikpe maka ebubo igbu mmadụ.
Ọ bụ dịka akpụpụtara Vandi n'ụloikpe Majie nke Yaba ka ọ gbara akwụkwọ a n'isi ya.
Ya bụ akwụkaọ ọ gbara kwuru sị, "Gị onwe gị bụ ASP Drambi Vandi n'ụbọchị 25 nke ọnwa Disemba afọ 2022, n'ụzọ Ajah nke dị n'okporoụzọ Lekki Expressway nke Legọs steeti megidere iwu dịka ịgbagburu otu onye bụ Omobolanle Raheem mgbe ị gbara ya egbe n'obi nke megidere iwu agba nke 223 nke iwu gbasara mpụ nke Legọs steeti nke afọ 2015".
Onigbanjo kwukwara ka ọkaikpe bụ Adeola Olatunbosun bụ ọkaikpe kpere ya bụ ikpe ka ejichie Vandi n'ụlọ mkpọrọ nke Ikoyi Correctional centre ka ndị uweojii nweeike mee nyocha ha nke ọma
Ọkaikpe Olatunbosun kwetere na nke a.
Eyighayiri ya bụ ikpe gaa ụbọchị iri atọ nke ọnwa disemba afọ 2023.





