Nke bụ eziokwu gbasara ahịa Ladipo gọọmentị chọburu imechi

Ahịa Ladipo
Nkọwa foto, Nke bụ eziokwu gbasara ahịa Ladipo gọọmentị chọburu imechi

Ndị isiahịa n'ahịa mgbuka dị na Ladipo na steeti Legọs ekwuola na ha na ndị ọrụ Lagos Waste Management Authority (Lawma) ekwubiela ihe na-esere ha.

Lawma kwuburu na ha ga-emechị ya bụ ahịa mgbuka Ladipo na ahịa Oyingbo maka ọnọdụ adịghị ọcha ebe ahụ.

Okey Imo, bụbu onyeisi n'ahịa Ladipo ma bụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu ebe ahụ, sị na ha na ndị Lawma nwere ọgbakọ ụnyaahụ maka ya bụ okwu.

Ahịa Ladipo

Imo sị na ihe buteburu ya bụ okwu bụ na ụfọdụ ndị ahị jụrụ ịkwụ ụgwọ maka mkpocha na nzacha ahịa "maka na Lawma anaghị arụ ọrụ ha nke ọma".

Ọ jụrụ sị, "A ga-akwụ mmadụ ụgwọ maka ọrụ ọ rụghị?"

Imo sị na ọ bụ oke na ọrụ gọọmentị ikpocha ahịhịa n'ahịa ma ọ bụrụ na a na-akwụ ha ụgwọ ka o kwesiri. "Anyị na-akwụ ha ụgwọ kwa ọnwa".

Ọ sị na "Ugbua, nke ahụ a gaala. N'ọgbakọ anyị na Lawma nwere ụnyaahụ bụ Mọnde, anyị ekpeziela ihe niile na-ese okwu".

Lawma chọburu imechi ahịa abụọ ndị a malite n'ụbọchị Tọzde ruo mgbe ndị ahịa ahụ kwụrụ ụgwọ ha.

Lawma sị na ha adọọla ndị ahịa abụọ ahụ aka na ntị ugboro gboro dịka onyeisi ha na-ahụ maka mmekọ ha na ndị mmadụ bụ Folashade Kadiri siri kwuo.