Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka mmadụ ikwu okwu nwereike ibute nkewa

Mudashiru Obasa, Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Obasa/BBC

N'ọdịnso a, e nweela nrụrịtaụka na soshal midia gbasara okwu nke ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị welitere isi kwuru nke ọtụtụ kwuru na o nwereike ịkalite nkewa nakwa akpọmasị na Naịjirịa.

Okwu ndị a gụnyere okwu Nasir El-Rufai kwuru gbasara atụmatụ ndị okpukperchi Islam iweghara ọchịchị na Naịjirịa, nakwa ihe onyeisi ụlọ omeiwu Legọs bụ Mudashiru Obasa kwuru gbasara ime iwu ga-abara ndị Yoruba karịa ndị ọzọ.

Ọtụtụ kwuru ka e jide ndị ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ, nyochaa ha, ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ikwu okwu nwere ike ibute nkewa, mana ọtụtụ ndị ọzọ kwuru na iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike ikwu uche ya.

Iji tụlee okwu a BBC Igbo kpọtụụrụ onye ọkaiwu aha ya bụ Chidi Ikeotuonye.

Nasir El-Rufai
Nkọwa foto, Ọtụtụ

Gbasara ihe El-Rufai kwuru, Ikeotuonye kọwara na ọ bụ eziokwu na okwu ahụ gosiri echiche onye họọrọ okpukperechi ya karịa ịdịnotu Naịjirịa, mana "El-Rufai adaghị iwu ọbụla".

"Ọ bụ uche ya ka o kwupụtara, ọ dịịrị ndị okpukperechi Christ ka ha saa ya ihe o kwuru. Onweghị mgbe o ji sị na ndị okpukperechi Vhrist bụ ndị arụ, maọbụ kparịa ha, maọbụ kpọọ ha iyi."

N'aka nke ọzọ, gbasara ihe Obasa kwuru, Ikeotuonye kwuru na onweghị iwu ọbụla e mere iji kwalite otu agbụrụ ma butuo ndị ọzọ nke ga-akwụdo.

"Iwu Naịjirịa megidere ịmekpa mmadụ ahụ n'ụzọ ọbụla, maọbụ nye mmadụ ihe nrite n'ụzọ ọbụla naanị n'ihi agbụrụ maọbụ okpukperechi ya." Ikeotuonye kọwara.

"Iwu nyere nwaafọ Naịjirịa ọbụla ikike ibi na mpaghara Naịjirịa ọbụla ọbụla masịrị ya, na-arụ ọrụ ebe ahụ, nwee akụnụba ahụ, rụọ ụlọ maọbụ zụọ ala ebe ọbụla ọmasịrị ha."

"Ọ bụrụgodi na ndị omeiwu Legọs emee iwu iji nye ndị mpaghara Yoruba ohere ọbụla karịa agbụrụ ndị ọzọ, ụlọikpe ga-akụchapụ iwu dị otu a maka na ọ dabaghị n'iwu Naịjirịa."

Ikeotuonye kọwara na ma El-Rufai, ma Obasa adabeghị iwu ọbụla nke e nwereike iji kpụpụ ha ụlọikpe, mana okwu ha egosila na ha amaghị iwu Naịjirịa nke ọma.

O kwukwara na ndị nọ n'ọkwa ọchịchị kwesịrị ị na-echezi echiche nke ọma tupu ha ekwuo ihe ọbụla, maka na okwu ha nwereike ịkwalite udo maọbụ bute ọgbaaghara n'obodo.

Ihe Onyeisi Ụlọomeiwu Legọs steeti kwuru maka ịzụ ala na ụlọ na Legọs nke mụnyere ọkụ na soshal midia

Mudashiru Obasa

Ebe foto si, Mudashiru Obasa

Onyeisi ụlọomeiwu Legọs Steeti bụ Mudashiru Obasa ekwuola na ụlọọmeiwu steeti ahụ ga-eme ikwu metụtara inwe ụlọ nakwa ebe azụmahịa ga-echekwa ụmụafọ Legọs steeti.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Cable siri kwuo, Obasa kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde dịka e duru ya n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ agba nke atọ ya.

Obasa rụtụrụ aka na ha ga "emegharị iwu ndị a ga-emegharị iji hụ na e chekwara ndị Legọs".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

N'okwu ahụ nke kpalitere ndọrịtaụka na soshal midia, Obasa sịrị, “Legọs bụ ala Yoruba, ọ bụghị ala enweghị onye nwe ya dịka ụfọdụ ndị mmadụ si kwuo."

“Ya mere, atụmatụ anyị dịka ụlọomeiwu bụ ịhụ na a tụgharịrị iwu ndị ụlọomeiwu a wepụtara n'asụsụ Yoroba."

“Ọzọ bụ na anyị ga-ejikọta aka ịhazi iwu iji chekwa ọdọịmma ndị be anyị."

“Malite ugbua gaa n'ihu, anyị ga-agbaso usoro iwu metụtara inwe ụlọ, azụmahịa ga-akwado ndị be anyị."

“A ga-enwe iwu nakwa mkpebi n'okwu akụnaụba, azụmahịa iikike inwe ụlọ na ala.”

Dịka a na-akwado ntuliaka 2023, agbụrụ onye si ghọrọ okwu ụfọdụ pati na ndị nkwado ji mere ụka n'ozi achụmta vootu ha.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Otu onye Igbo ọnụ na-eru n'okwu na pati APC na Legọs bụ Joe Igbokwe kwuru na ya 'enweghị ihe o nwere ikwu dịka ọ ka na-eme nnyocha ịchọpụta na Obasa o kwuru ihe asị na o kwuru.'

Oge BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị ọ sịrị, "O nwebeghị ihe m nwere ikwu."

"Aka m na-enyocha ịmata ma o kwuru ya bụ ihe n'ezie."

Otu onye na-aza @Shehusky na Twitter kwuru na Legọs steeti wepụta iwu ga-akpaoke na ọ ga-aka mma ikpewa Naịjirịa ka onye ọbụla gawara onwe ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Mana ụfọdụ dịka @TaxDoctorNG kwuru na ha ahughị ihe ọjọ ọbụla dị n'ụdị iwu ahụ.

Ọ jụrụ ajụjụ sị, "Kedụ ihe ebunobi Ụlọomeiwu Legọs Ime iwu ga-echekwa ụmụafọ ha ji bụrụ nsogbu nye gị?"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2