Gọọmentị Legọs eboola Eze ndigbo nke Ajao ebubo iyi ndụ egwu n'ụlọikpe ukwu

Ebe foto si, Getty/EON
A kpụkpụtara Frederick Nwajago bụ Eze ndigbo nke akụkụ Ajao Estate n'ụlọikpe ukwu nke nọ n’akụkụ Tafawa Balewa Square n’ụbọchị Tuzde maka ebubo itoolu metụtara iyi ndụ egwu.
Ebubo ndị a gụnyere: ịnwa atụmatụ iyi ndụ egwu, isonye mee iyi ndụ egwu, ikwado otu a machiri amachi, ịnwa kwụọ ụgwụ maka iyi ndụ egwu nakwa ịdị njikere mee ihe iyi ndụ egwu.
Ọkaikpe Yetunde Adesanya nụrụ mkpesa Legọs steeti mere banyere Nwajago.
Ọkaikpe Jonathan Ogunsanya bụ onye nọchitere ọkaiwu Legọs steeti bụ Moyosore Onigbanjo kọwara na Nwajago dara iwu olemole n’akwụkwọ iwu steeti ahụ nke megidere iyi ndụ egwu.
Maazị Nwajago kwuru na aka ya dị ọcha n’ebubo ndị a dịka ehigharịrị ikpe ahụ gaa ụbọchị anọ nke ọnwa Jụlaị.
Cheta na a kpụpụtabuola ya ụlọikpe majịstratị nke nọ na Yaba nke nyere iwu ka akpọchie ya n’ụlọ nga.
Ụlọikpe ‘Magistrate’ dị na Sabo Yaba nyere iwu ka a kpọchie ya maka okwu ịsị na ọ ga-akpọbata ndị ‘Indigenous People of Biafra’ (Ipob) na Legọs.
Onyeisi ụlọikpe ahụ bụ Peter Nwaka nyere iwu sị ka a kpọchie Eze a n’ụlọmkpọrọ dị n’Ikoyi ruo ụbọchị iri atọ mgbe onyeisi ọma ịkpe na Legọs ga-ekwu ihe a ga-eme ya.
O nyere iwu a n’ụbọchị Wenezde mgbe ndị uweojii kpọtara Nwajagu dị afọ 67 n’ụlọikpe n’ebubo abụọ gụnyere ịkpa nkata na agwa nwereike ibute ọgbaghara.
Ọkaiwu ndị uweojii bụ Thomas Nurudeen gwara ụlọikpe a na Eze Ndigbo na ndị ọzọ a na-achọ achọ kpara nkata a n’ụbọchị 26 Maachị n’ebe a kpọrọ 26 Akeem Shitu St. dị n’Ajao Estate, Lagọs Steeti.
O boro ebubo na Nwajagu yijara ndị bi na Legọs mgbe o kwuru na ọ ga-akpọbata ndị Ipob n’ime Legọs. E bokwara ebubo na Nwajagu sị na Ipob ga-akpọchị Legọs kpamkpam n’ọtu ọnwa.
Ha sị na nke a megidere iwu na-achị Legọs ngalaba 168 (d) na 411 nke afọ 2015.
Ọkaikpe ụlọikpe Magistrate a kwuru na ọ ga-echere ndụmọdụ sị n’aka onyeisi ọma ikpe nke Legọs Steeti bụ Babajide Martins.
O buuru ikpe ahụ gawazie n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 2023.
Ihe ị kwesịrị ịma maka nwụchi Eze ndị Igbo n'Ajao onye kpọkuru Ipob na Legọs

Ebe foto si, @EONSINTELLIGENC/ TWITTER
Ndị uweojii Legọs steeti agbaala ama na ndị ọrụ ha nakwa ngalaba ụlọọrụ ha ha zoro ezo bụ Department of State Services (DSS) jịkọrọ aka ọnụ wụchie Eze ndị Igbo n’akụkụ mpaghara Ajao Estate na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Igbo okwu n’ụtụtụ Satọdee ma kọwa
“Ndị ọrụ anyị nakwa ndi DSS jịkọọ aka were nwụchịe Eze Fredrick Nwajagu maka okwu a hụrụ o kwuru n’ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia banyere ịkpọku ndị otu Ipob ka ha bịa chekwaa ndị Igbo nakwa ndị akụnụba ha na Legọs steeti.”
O kwuru na ya bụ Eze nọzị n’aka ndị DSS ugbua.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ gaghị enweike kwuo okwu ọzọ banyere nwụchi a.
Cheta n'ụbọchị Fraịdee ka akụkọ a malitere ifesa na Hundeyin kwuru na Twitter ya ndị uweojii agaghị akụgọọ aka na-ele ka ya bụ ihe me na steeti ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Etu okwu a siri malite
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’ụbọchị Fraịdee abalị 31 nke ọnwa Maachị, ihe onyonyo gosiri Fredrick Nwajagu bụ Eze ndị Igbo n’akụkụ Ajao Estate malite ifesa na soshal midia nke metụtara ịkpọku otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ka ha bịa Legọs.
Na ya bụ ihe onyonyo, Eze ahụ kwuru:
“Anyị ga-akpọku ha. Ndị Ipob, ha niile ga-abịa chekwa ụlọahịa anyị, anyị ga-akwụ ha ụgwọ maka nke a. Ọ bụ ihe anyị kwesiri ime.”
“Anyị ga-enwerịrị ndị nchekwa nke anyị iji hụ na ha kwụsịrị iwakpo anyị n’ime abalị, n’ụtụtụ nakwa n’ehihe.”
Ọ gara n’ihu kwuo na nke a ga-eme ndị ọ sị na-awakpo ụlọahịa ndị Igbo echee echiche tupu ha e mee ya bụ atụmatụ.
N’okwu ya, ọ sị:
“Ha hụ na anyị enweela ndị nchekwa nke anyị, ha ga-eche echieche nke ọma tupu ha abịa. Enweghi ihe m kwuru zoro ezo, ka ọ ha niile nụrụ olu m. Ndị Igbo ga-enwetarịrị ikike dịrị ha na Legọs steeti”.
Akụkọ pụtara n’ọha na Satọdee a na-ekwu na ndị uweojii nakwa ndị DSS mara ime ala gaa n’obi Eze mana ha ahụghị ya nke mere ha jiri zoro ezo nyochapụta ya n’otu ụlọ ndịna dị n’akụkụ Ejigbo na steeti ahụ ma nwụchie ya.
BBC enwebeghi chọpụta ma akụkọ a ọ bụ etu e siri nwụchie ya n’ezie.
Akụkọ a pụtara ka ọkụ gbara akụkụ ahịa ọzọ na Legọs bụ ahịa Balogun n'ụbọchị Tuzde a.
Eze ahụ nọ n'onyonyo ahụ kwuo na Ipob ga-abịa chekwaa ngwa ahịa ndị Igbo dịka ebubo na ọ bụ ndị agbụrụ ọzọ na-agba ngwa ahịa nakwa ụlọahịa ebe ndị Igbo na-azụ ahịa ọkụ.
Gọọmentị Legọs steeti nakwa ndị uweojii akụchapụla ebubo a ugboro ugboro ma kwuo na ha na-eme nnyocha ima ma ya bụ okwu enwere eziokwu nọ na ya.

Ọtụtụ ebubo ndị etu na-efesa na e nwere ndị ma ụma gbaa ya bụ ahịa ọkụ iji megide ndị Igbo na-ere ahịa ebe ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mmenyụ ọkụ Lagọs bụ Amodu Shakiru sara okwu a mgbe ya na BBC kwuru okwu ụbọchị ọkụ gbara akụkụ ahịa Balogun ma kwuo:
“Ebubo na ọ bụ ndị mmadụ munyere ọkụ a achịtaghị aja ugbua n’ihi enwebeghị ihe akaebe gosiri nke a.”
O kwuru na agbanyeghi nke a, na ya bụ ebubo ga-eru ndị uweojii Legọs steeti ntị maka nnyocha zuruoke.
Nke a sokwa akụkọ ebubo ọzọ dapụtara n'oge ntuliaka 2023 mgbe ahịa Akere dịkwa na Legọs gbara ọkụ.
Ebubo olemole dapụtara na ụfọdụ ndị ma ụma mmunye ahịa ahụ ọkụ iji megide otu agbụrụ mana ndị uweojii steeti ahụ kụchapụrụ ya bụ akụkọ ma kwuo na enweghi ihe gosiri nke a dịka ha kwuru na ha na-enyocha ihe nwereike ịkpata ya bụ ọkụ.
Okwu na ebubo ndị dị etu a malitere iri ibe ya elu tupu e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.
Ọtụtụ okwu ịkpaoke agbụrụ nakwa mmaja nye ndị agbụrụ dị iche iche pụtara ihe.
Mana dịka e mechapụrụ ntuliaka ọkwa onyeisiala ya bụ okwu bịara kwanye njọ.
N'ụbọchị 27 nke ọnwa Febụwarị bụ abalị abụo emechara ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naijirịa, ụfọdụ ndị amaghị ndị ha bụ nwara ịwakpo ndị Igbo na-azụ ahịa n'ahịa Mandilas dị na Legọs.
Otu onye na-ere ahịa ebe ahụ gwara BBC na ha niile nọ n'ime ọdọ ahịa ha mgbe ụfọdụ ndị omekome ji osisi na mma malitere ịchụ ndị mmadụ ọsọ.
"Anyị malitere ịgba ọsọ ma kpọchie ọdọ ahịa anyị mana o teghi aka ndị uweojii na ndị agha abịa ebe ahụ nke mere ka ndị ahụ gbapụ ọsọ" ka o kwukwara.
Nke a bịara dịka akpọpụtara aha Peter Obi dịka onye meriri Legọs dịka otu steeti na ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Akụkọ ịkpaoke agbụrụ, mmaja, ebubo ịgba ụlọahịa ebe ndị Igbo na-azụ ahịa nakwa ihe ndị ozọ pụtara ihe n'oge ntuliaka mana ọtụtụ ndị ọchịchị nakwa gọọmentị Naịjirịa arịọla ụmụ afọ Naịjirịa ka kwụsị okwu nakwa agwa ga-akpata ọgbaghara dịka ndị ọrụ nchekwa kwukwara na ha ga-ata onye ọbụla e jidere na-ekesa ụdịrị okwu a ahụhụ dịrị ha.








