Anambra election 2021: Tupu ị tụọ vootu lee njirimara pati ndị so na ntuliaka gọvanọ Anambara steeti

Ọkọlọtọ ụfọdụ pati na-azọ ọchịchị

Ebe foto si, Facebook/the political parties

Nkọwa foto, Ọkọlọtọ pati iri n'ime iri na asatọ na-azọ ọchịchị

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) pịakọtara pati niile nọ na Naịjiria ọnụ, nke bụ na ha dịzị naanị iri na asatọ (18) ugbua.

N'ime ya bụ 18, ha niile wepụtara ndị ga-efere ha ọkọlọtọ dịka a na-azọ onye ga-abụ gọvanọ Anambara steeti site n'ọnwa Maachị 2022.

Maka ndị ga-atụ vootu, ọkachasị ndị ọ bụ mbụ ha na-apụta ịtụ vootu, ị ga-ahụ njirimara pati ndị aha ha dị n'akwụkwọ ntuliaka Inec.

Lee pati ndị ahụ, njirimara ha nakwa ndị na-azọ oche gọvanọ n'okpuru ha.

Pati ndị na-azọ oche gọvanọ Anambara steeti

1) Accord (A)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Godwin Maduka

Njirimara ha - E sere aka na-eme 'turu ugo' n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị A

Ebe foto si, Accord Facebook

Onyeisi ha - Hon. Mohammad Lawal Nalado

2) Action Alliance (AA)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Etiaba Bennet Chukwuogo

Njirimara ha - E sere nnụnụ ọcha n'etiti kpakpando na-acha anụnụ anụnụ n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị AA

Ebe foto si, AA Facebook

Onyeisi ha - Hon. Adekunle Rufai Omoaje

3) African Action Congress (AAC)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Chidozie Wilson Nwankwo

Njirimara ha - E sere aka abụọ na-acha akwụkwọ ndụ na oji n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị AAC

Ebe foto si, AAC Facebook

Onyeisi ha - Dkt. Leonard Nzenwa

4) African Democratic Congress (ADC)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Nze Akachukwu Sullivan Nwankpo

Njirimara ha - E sere aka abụọ na-ekwe onwe ha n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị ADC

Ebe foto si, ADC Facebook

Onyeisi ha - Ralphs Okey Nwosu

5) Action Democratic Party (ADP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Prince Ume-Ezeoke Afam Luke Douglas

Njirimara ha - E sere aka ji akwụkwọ a sapere asape n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị ADP

Ebe foto si, ADP Facebook

Onyeisi ha - Engr. Yabagi Yusuf Sani

6) All Progressives Congress (APC)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Emmanuel Nnamdi Andy Uba

Njirimara ha - E sere aka ji azịza n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị APC

Ebe foto si, APC Facebook

Onyeisi ha - H.E Mai Mala Buni (onyeisi na-elekọta ya ruo mgbe a họpụtara onye ọzọ)

7) All Progressives Grand Alliance (APGA)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo

Njirimara ha - E sere ọkụkọ n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị APGA

Ebe foto si, APGA Website

Onyeisi ha - Dkt. Victor Ikechukwu Oye

8) Allied Peoples Movement (APM)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Onyejegbu Geoffrey Okwudili

Njirimara ha - E sere akpụ a bọpụtara n'ala n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị APM

Ebe foto si, APM Facebook

Onyeisi ha - Yusuf Mamman Dantalle

9) Action Peoples Party (APP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Azubuike Philip Echetebu

Njirimara ha - E sere enyi n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị APP

Ebe foto si, APP Facebook

Onyeisi ha - Ikenga Imo Ogochinyere

10) Boot Party (BP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Chika Jerry Okeke

Njirimara ha - E sere akpụkpọụkwụ n'ọkọlọtọ ha

Ọkọlọtọ ndị BP

Ebe foto si, Boot Party Website

Onyeisi ha - Adenuga Sunday

11) Labour Party (LP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Agbasimalo Obiora Emmanuel

Njirimara ha - E sere ezinaụlọ nna, nne na nwa n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị LP

Ebe foto si, Labour Party Lagos Facebook

Onyeisi ha - Ọkaiwu Julius Abure

12) National Rescue Movement (NRM)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ezenwafor Afamefuna Victor

Njirimara ha - E sere aṅụ n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị NRM

Ebe foto si, NRM Facebook

Onyeisi ha - Sinetọ Saidu Muhammed Dansadau

13) New Nigeria Peoples Party (NNPP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ohajimkpo Leonard Emeka

Njirimara ha - E sere nkata mkpụrụosisi juru n'ime ya n'etiti maapụ Naịjiria n'ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị NNPP

Ebe foto si, NNPP Facebook

Onyeisi ha - Ambassador Agbo Gilbert Major

14) Peoples Democratic Party (PDP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Valentine Chineto Ozigbo

Njirimara ha - e sere nche mmiri/anwụ n'etiti ọkọlọtọ ha.

Ọkọlọtọ ndị PDP

Ebe foto si, PDP Facebook

Onyeisi ha - Sinetọ Iyorchia Ayu

15) Peoples Redemption Party (PRP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Nnamdi Nwawuo

Njirimara ha - ọkọlọtọ pati a nwere agwa atọ; nke na-acha uhie uhie, nke dị oji na nke ọcha. E sere ntụghe igodo dị oji n'etiti ya bụ ọkọlọtọ.

Ọkọlọtọ ndị PRP

Ebe foto si, PRP Facebook

Onyeisi ha - Mallam Falalu Bello, OFR

16) Social Democratic Party (SDP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Obinna Chukwudum Godwin Uzoh

Njirimara ha - E sere ịnyịnya ọcha n'ọkọlọtọ pati ha.

Ọkọlọtọ ndị SDP

Ebe foto si, SDP Facebook

Onyeisi ha - Dkt. Olu Agunloye

17) Young Progressive Party (YPP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Ifeanyi Patrick Ubah

Njirimara ha - Ọkọlọtọ ha na-egosi aka ji ahịhịa ndụ, n'ime ọnụụzọ dị n'ime eserese maapụ Naịjiria.

Ọkọlọtọ ndị YPP

Ebe foto si, YPP Facebook

Onyeisi ha - Cmrd. Bishop Amakiri

18) Zenith Labour Party (ZLP)

Onye na-efe ọkọlọtọ ha - Okonkwo Obiora Francis

Njirimara ha - E sere ndị na-arịgo n'elu ubube.

Ọkọlọtọ ndị ZLP

Ebe foto si, ZLP Facebook

Onyeisi ha - Ichie Dan Nwanyanwu