Anambra governorship election debate 2021: Ihe Ozigbo, Okonkwo Uba, Uzoh, Maduka kwuru ha ga-emere ndị Anambra steeti

Godwin Maduka, Obiora Okonkwo, Valentine Ozigbo,Ifeanyi Uba,Obinna Uzo

Ebe foto si, Mmadúka, Okonkwo,Ozigbo,Uba,NwankwoUba

Ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Anambara steeti na ntuliaka ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Novemba, afọ 2021 gụnyere Valentine Ozigbo, Ifeanyi Uba, Obinna Uzo, Godwin Mmaduka na Obiora Okonkwo.

Lee ihe ndị ha kwuru gbasara ndakpọ nchekwa, mwulite akụnaụba ndị ntorobia na ihe ndị ọzọ:

Ndị Anambara ekwela ọ dị ha ka oge Massob sị emela Census - Ifeanyị Uba, YPP

Ifeanyi Uba

Ebe foto si, Ifeanyi Uba

Onye ga-efe ọkọlọtọ otu pati YPP bụ Ifeanyi Uba kwuru na ngwangwa ya banyere n'ọchịchị na ya ga-eme ka e jiri 'biometric system'nwee ngụkọ mmadụ niile nọ na steeti ahụ na a na-enweta ozi ma onye ọbụla daa iwu n'obodo.

"Achọrọ m ka Anambara bụrụ steeti mbụ ga-etinye biometric system."

Ifeanyi Uba kwukwara sị, "Anyị ga-akpọkọba ndị ntoria maka ọrụ."

"Anyị bịara ka anyị na ndị Anambara dozie obodo."

N'okwu ndị sịrị na a gaghị eme ntuliaka, Uba dọrọ aka n na ndị ka Igbo ghara ikwe ka ọ dị ha ka ọ dị ha oge Massob kwuru na ndị Igbo agaghị eme census,"e meghị ya.Ugbua e kee oke, nke ndị Igbo na-epe mpe karịa."

Anyị na ndị nwe obodo ga-enwe mkparịta ụka maka ndị ntorobịa - Obinna Uzor 

Obinna Uzo

Ebe foto si, Obinna Uzo

Obinna Uzor nke otu SDP kwuru na "Ị kpọgasia ndị nwe obodo, a kpaa ụmụ ihe a amara ka a ga-esi nye aka" n'okwu ndakpọ nchekwa n'Anambara steeti.

"Lee etu a ga-esi nye ndị uweojii ọzuzụ na enyemaka eji arụ ọrụ, enyere ha aka."

Ọ gara n'ihu sị "Anyị bụ ndị na-agba mbọ, enyere ụmụ anyị aka ka ha nwee ihe ha na-eme."

"N'ime obodo na-achị ebe dị icheiche enyere ha aka."

Ọ bụ ntuliaka na-eweta ọganihu - Obiora Okonkwo 

Obiora Okonkwo

Ebe foto si, Obiora Okonkwo

Obiora Okonkwo nke Zenith Labour Party kwuru na "Anyị ma ihe anyị ga-eme ozugbo ahaziri okwu nchekwa."

"M ga akpọ ụmụ Igbo gwa ha okwu ma rịọ ha etu nna si arịọ nwa ka ha butuo obi."

N'agụmakwụkwọ, Okonkwo kwuru na ya ga-enye ohere agụmakwụkwọ n'efu bido na ọtakara rue Pramarị.

Okonkwo kwukwara sị, "Ndị ọga bụ ndị ga-achị Anambara steeti ọbụghị ndị Boị."

"Ị lee anya n'elu ya nsogbu nchekwa dị n'ụdị n'ụdị."

Aga m etinye ọnọdụ gbatata n'okwu nchekwa obodo- Ozigbo

Valentine Ozigbo

Ebe foto si, Valentine Ozigbo

Valentine Ozigbo bụ onye na-efe ọkọlọtọ PDP sịrị: "A ga-akpọ ọnọdụ gbatagbata n'ihe gbasara idozi obodo nke gụnyere ụzọ na nchekwa."

O kwuru na ya ga-enye ụmụnwaanyị ohere inwe ọkwa n'ọchịchị ya.

"Ụmụnwaanyị chee aka ghọrọ m n'ihi na o nwebeghi ihe ha ga-ahụ dị ka m ma m banye ọchịchị."

"A ga-agba mbọ jiri teknụzụ belata mmefu, nwere ndị aka ha kwụ ọtụ tinye n'ọchịchị."

Abịara m idozi obodo, akpatala m ego- Godwin Maduka 

Godwin Maduka

Ebe foto si, Godwin Maduka

Godwin Maduka nke Accord Party kwuru na "Ihe m bịara bụ imezi obodo, ọ bụghị ịkpata akpata".

Maduka kwuru na onye ejighị ego ekwesịghị ịzọ ọkwa gọvanọ sị, "O nwe onye ji ụgwọ ọ gaghị a bụ Gọvanọ."