Anambra governorship debate 2021: Ihe Etiaba, Akachukwu kwuru na ha chọrọ imere ndị Anambra

Etiaba,Echetubu Akachukwu

Ebe foto si, Etiaba,Echetubu Akachukwu

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ anọrọla na ndọrịtaụka BBC Igbo haziri ekwu ebumnobi ha ma ọ bụrụ na ha merie na ntuliaka Govanọ Anambra steeti.

N'okwu ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, Ben Etiaba, Azubuike Echetebu, Sulivan Akachukwu na Geoff Onyejekwu kwenyere ibinye aka n'akwụkwọ na ha ga-agba arụkwaghịm ma ọbụrụ na na ha egboghị nsogbu ndakpọ nchekwa n'Anambara.

Lee ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha kwuru:

Apụtara m ka mmara ma aga-adọpụta Anambra n'ihe- Etiaba,AA

Ben Etiaba

Ebe foto si, Ben Etiaba

Ben Etiaba, onye sị n'otu AA kwuru na ya ga-agba mbọ "Ịpịchịsị ebe e si ezu ego anyị."

O kwekwara nkwa na "Aga m arụ 'industrial park na mpaghara senetorial zone atọ dị n'Anambra."

N'okwu agụmakwụkwọ, Etiaba kwuru na "Anyị ga-edozi ụlọakwụkwọ, rụzie ụlọakwụkọ, tinye oche,kwụọ ndị nkuzi ụgwọ, nye ha ọzụzụ."

N'okwu inye ụmụnwaanyị ohere n'ọchịchị, Etiaba kwuru na ọ ga-enye ohere 60:40 n'ọchịchị ya.

Abịara m iweta usoro onye-ọbụla-tinye-ọnụ- Akachukwu,ADC

Sullivan Akachukwu Nwamkpo

Ebe foto si, Sullivan Akachukwu

Akachukwu chọrọ ka e nwe ọchịchị ebe gọọmentị na-ege ndị a na-achị ntị .

"Anambara nwere ihe niile; ndị nwere ihe, ndị gụrụ akwụkwọ, mana a bịa ọ dị ka ebe a gbara ọzọ."

"Ihe na-ese bụ ọnọdụ ọchịchị Anambara bụ ihe mmadụ ole na ole were tinye ya n'akpa."

"Ihe m putara bụ ka e nwe gọọmentị, gọọmentị adịghị n'Anambra, ka e nwe ọchịchị ebe gọọmentị na-ege ntị ."

Ihe m chọrọ bụ akụ rue ụlọ - Echetebu,APP

Azubuike Echetebu

Ebe foto si, Azubuike Echetebu

Azubuike Echetebu kwuru na ahụhụ erika n'Anambra.. ndị ntorobia enweghị ọrụ mana ọ ga-agba mbọ ịhụ na e nwere nhụta

Echetebu kwuru na ya ga-etinye ihe ga-eme ka ndị Anambra ji ego malite tinyewa ego n'Anambra site na inye ha "Tax holiday".

N'okwu ndakpọ nchekwa, Echetebu kwuru na ya ga-enwe mkparịtaụka iji mata ihe na-ewe ndị ntorobịa ozigbo ya banyere ọchịchị.

Nke ọzọ bụ na m ga-ahụ na agbanwere usoro agụmakwụkwọ nke Bekee kpọrọ 'curriculum'

N'okwu inye ụmụnwaanyị ohere n'ọchịchị, Echetebu kwuru na ọ ga-enye ụmụ nwaanyị tozuru ohere, na ọ bụghị inye ọkwa maka na onye ahụ bụ nwaanyị.

Aga m arụ 'industrial park- Chidozie Nwankwo,AAC

Chidozie Nwankwo

Ebe foto si, Chidozie Nwankwo Facebook

Chidozie Nwankwo nke otu pati African Action Congress (AAC) kwuru na ya ga-eji amaihe o nwetarala na ịrụ ụlọ mmepụta ahị were wube ọtụtụ n' Anambra steeti ma ọ banye ọkwa gọvanọ.

"Abụ onye nwere ụlọ mmepụta ngwahịa ise."

"Ala Igbo ga-abụ Japan nke Afrika ma m bụrụ gọvanọ."

O kwukwara na ọ ga-eme ka imgbazinye ego dịị ndị nwere ebunobi ịrụ ụlọ mmepụta ahị dị mfe.

"M ga-enye onye ọbụla nwere ụlọ, ego ha nwere ike iji gbazite ego n'ụlọ akụ."

Ị ga-enweta C of O n'abalị atọ - Geoff Onyejekwu

Geoff Onyejekwu

Ebe foto si, Geof Onyejekwu

Geoff Onyejekwu sịrị : "Aga m eme ka okporoụzọ kpachiri akpachi di obosara (dualization)".

N'okwu ahụike o kwuru ha ọ ga-eweta ụlọahụike n'elu ọgbatumtum.