FIBA World Cup: O nwere ike ịkwa otu bọọlụ nkata Nigeria bụ 'D'Tigers'?

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ nkata Naịjirịa a kpọrọ D'Tigers bụ Alex Nwora ekwuola na ndị otu ya atọọla na Naịjirịa n'ihi ụkọ ego.
Nwora kwuru na agbanyeghi na otu ha bụ ndị mbụ n'itozuoke n'asọmpi Iko mba mana ha agabeghi Chaịna n'ihi ụkọ, na nke a nwereike ime ka ha gbajọọ asọmpi a.
D'Tigers dịka e si a kpọ ha bụ otu kachasị akụ bọọlụ nkata n'Afrịka ma bụrụ ndị nke asatọ n'ụwa (FIBA Power Ranking).
Asọmpi Iko Mbaụwa bọọlụ nkata a bụ nke ugboro atọ nakwa nke mbụ ha kamgbe afọ 2006.
Ha nwere ndị ọkụ bọọlụ a ma ama dịka Al Farouq Aminu nke Orlando Magic, Ekpe Udoh nke Utah Jazz, Josh Okogie nke Minnesota Timberwolves, na Ike Diogu onye na-akụrụ Golden State Warriors.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọ dị ugbua, Naịjirịa enweghi mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu dịka onyeisiala Buhari edubeghi ndị mịnịsta ya n'iyi ọrụ kamgbe ọ bara ọchịchị nke abụọ.
BBC kpọtụrụ onye Direktọ mịnịstrị egwuregwu. Onweghi ihe o kwuru kama ọ sị ka a jụọ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nkata bụ NBA.
BBC na-agba mbọ inwete ọsịsa n'aka ndị a mana onwebeghi nke nwere isi.
Nke a emeela ka ọtụtụ n'ime ndị na-akụ bọọlụ ji ekwuputa uche ha na soshal midia.










