Etu ndị mmadụ si agbanye onwe ha 'wonder drug' e mere maka ụmụanụmanụ iji dozie anụahụ ha

Katie ji ihe e ji agba ọgwụ na-agba nke a kpọrọ GHK-Cu

Ebe foto si, Katie

    • Onye dere ya, Ruth Clegg
    • Ndị mere akụkọ a, Health and wellbeing reporter
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Katie wepụtara ntụtụ e ji agba ọgwụ. Ọ mịtara ihe dịka ọgwụ ma gbanye ya n'elu ike ya tupu o kelee ndị na-ekiri ya.

O mere ihu dịka onye obi dị mma. Ọ na-agbanye ọgwụ ahụ a kpọrọ GHK-Cu n'ahụ ya kamgbe.

Ọgwụ ahụ ndị bekee kpọrọ 'copper peptide' ka ọ na-agbanye n'ahụ ma buru n'obi na ọgwụ ahụ na-enweta nnukwu mgbawe n'anụ ahụ ya.

Ọ sị na ihe mere ya dịka ihe a kara aka n'elu ahụ ya mgbe ọ mụrụ nwa na-achọ ịpụcha kamgbe o bidoro na-agba ọgwụ ahụ.

Mana ihe e dere n'elu ọgwụ ahụ ọ gbanyere n'ahụ ya bụ na 'nke a bụ maka ime nnyocha, ọ dịghị mma n'ahụ ndị mmadụ".

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-agbanye ọgwụ ahụ n'ahụ ha na-egosi ya na soshal midia. Ihe e dere kwuru na ọgwụ ahụ adịghị mma n'ahụ mmadụ adịghị eche Katie uche. Obi ya bụ na ọgwụ ahụ dị mmadụ mma n'ahụ.

"E meela m nnukwu nnyocha banyere ya, mana m na-ehi asaa n'anya"

"E bidoro m ịgba ya obere obere ime ka m hara inweta ihe m na-achọghị".

Katie kwuru na ọgwụ ahụ mere ka ntụtụ isi ya kwụrụ chịmchịm ma na-edozi anụ ahụ ya.

Ebe a na-arụpụta peptides, ụlọọrụ a kpọrọ Hubei Reborn Biotech Co., Ltd na Nọvemba 17, 2020. Ụlọọrụ a dị na Jingzhou, Hubei Province, Chaịna.

Ebe foto si, Huang Zhigang/VCG via Getty Images

Nkọwa foto, Ebe a na-arụpụta peptides na Jingzhou, China

E si n'amino acid arụpụta 'Peptides' maọbụ n'obere 'protein' nke anụ ahụ mmadụ na-ewepụta.

Ha na-enye aka n'anụ ahụ. Ma ndị na-arịa ọrịa shuga. Mana 'peptides' abụrụla ihe ndị mmadụ na-agba dịka ọgwụ kamgbe "GLP-1s" na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụ ọkachasị ndị buru ibu chọrọ ịta ahụ.

Onye ọrụ na-erere ụlọọrụ ebe a na-arụpụ 'peptides' na Hubei Reborn Biotech Co., Ltd na Nọvemba 17, 2020 dị na Jingzhou, Hubei Province mba Chịana.

Ebe foto si, Huang Zhigang/VCG via Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Anyị na-ahụta ya dịka ihe ga-emebi ihe n'ọdịnihu" Dọkịnta Mike Mrozinski nyere nkọwa. "Usoro ichekwa usoro e ji agba ọgwụ ahụ emeela ka e jiri naanị otu ntụtụ, nke ga-ebelata mmadụ ịgba ya onwe ya.

Na soshal midia ka a na-ahụ ọtụtụ ndị a ma ama ka ha ji na-agba onwe ha ọgwụ 'peptides' dị iche iche a wepụtara maka ime nnyocha.

"Achọrọ m ka m zulite akwara m, mee ka ahụ m dị mma ngwa ngwa? A sị na BPC 157 na-eme ya.

Mana nnyocha e mere maka anụmanụ na-egosi na BPC 157 na-enye aka ime ka ebe anụmanụ meruru ahụ laa.

Ọkammụta na ngalaba 'Anatomy' na mahadum Lancaster bụ Adam Taylor kwuru na "ndị na-agba onwe ha ọgwụ ahụ ji onwe ha eme oke e ji eme nnyocha".

Ọ sị na "e nwere ndekọ dị mana ọgwụ ahụ bụ n'ahụ anụmanụ ka a gbara ya, enweghị mgbe a gbara ya mmadụ".

Ọ na-ele ka ọnụọgụgụ ndị na-agba ọgwụ ahụ na-arị elu kamgbe ihe karịrị otu afọ. Ebe ya na ndị gbara ọgwụ ahụ nwerela mkparịtaụka, ha sị na ha nwere ihe ndị dịka ikike ọgwụgwụ, ọrịa ọnyụnyụ, ọkọ, na ụkwụ ọzịza. O nwere nchekasị ahụ na ihe ndị a ga-ebutere ndị a ihe izendụ n'ọdịnihu.

Jack Sarginson
Nkọwa foto, Tupuu ị gbaa ọgwụ "peptides", Jack Sarginson nyere ndụmọdụ.

Jack Sarginson bidoro "na-agba ọgwụ peptides" ka o nyere onwe ya aka maka ahụ o meruru n'azụ ya.

"Nwoke dị afọ iri anọ bedoro na-agbanye ọgwụ 'peptide' na Desemba afọ garaaga ka ọ nwee ahụ dịka Marvel".

Ihe dịka izuụka abụọ o wetere ọgwụgwọ na-enweghị nnsogbu ọbụla. Ma ọ gaala ebe a na-agba ọkpụkpụ tupu obido na-agbaọgwụ 'peptide'.

"A ma m na ihe a dị ụzọ abụọ. Kamgbe ọrịa Covid19 ndị mmadụ na-achọ ijiri aka ha na-ahụ maka ahụike nke ha".

"Ọ dị m ka 'peptide' a dị mma ma mmadụ gbaa ya n'ụzọ dị mma".

"Ihe e ji eme nnyocha"

Dọkịta Mrozinski kwuru na bụghị na mmadụ amaka ihe bụ ị na-agba ọgwụ nke nnyocha akwadoghị ka mmadụ gbaa, ọ bụ ihe onye hụrụ o nwere

"Ọ bụrụ na ndị ji onwe ha eme nnyocha a banwanye ụba, anyị ga-enwe nnsogbu na ngalaba ahụike nke ụlọọgwụ enweghị ike ịgwọ".

"Ugbu a e nwere ọtụtụ ụlọọgwụ na-agba mmadụ 'peptide'

Manadọkịta Syed Omar Babar, onye ọrụ n'ụlọọgwụ Healand Clinic dị na Leicester na-enye ndị mmadụ ọgwụ 'peptide' nakwa ọgwụ ndị ọzọ dịka 'BPC-157' na 'TB-500'. Ọ kwenyere na ugbua bụ ọgwụ 'peptides' nwere nnukwu ọ ga-aba n'ahụike ndị mmadụ na-akwa na ngalaba ahụike.

Mana gịnị ma na enwebeghị ikike ime ka ndị mmadụ na-aṅụ ọgwụ ahụ?

Ọsịsa ya bụ na "ị rụpụta ọgwụ site na nnyocha e mere n'anụmanụ bido nwere ya na-agwọ mmadụ bụ ihe na-efu nnukwu ego. Ọ bụghị ihe ụlọọrụ na-arụpụta ọgwụ ga-akwado."