Nkọwa foto, Onye na-eme nnyocha ọnọdụ ọbara mgbalielu ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ndị ma nke ekwe na-akụ ekwuola na ị chọọ ka ọgwụ ọbara mgbalielu gị rụọrọ gị ọrụ ọfụma, ṅụọ ya tupu ị laba ụra abalị.
Dị ka akwụkwọ mgbasaozi European Heart si kwuo, ọ bụ obere ntuziaka nwereike ịzọ ndụ.
Ha kwukwara na nchọpụta ọhụrụ a na-ekwu na ọgwụ a na-aka enye mgbochi maka obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ, ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya tupu ị laba ụra n'abalị kama ịṅụ ya n'ụtụtụ.
Ndị ọkachamara kwuru sị na ọnọdụ ime ahụ anyị maọbụ etu ahụ anyị si eme n'ime awa 24 dị n'ime otu ụbọchị na-emetụta etu anyị si anabata ọgwụ.
Lee ma ị nọ n'ọnọdụ gbatagbata maka ọrịa ọbara mgbali elu
Ọbara mgbali gị ọ dị mma?
Jiri ohere a lelee ihe ọnụ ọgụgụ ọbara mgbali gị pụtara wee nweta ozi gbasara ihe ị ga-eme ọzọ.
Otu esi eji ngwa a
Ihe i ga-eme
I nwere ike iji ngwá ọrụ a ma ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye ị na-eji ya:
Dị afọ 18 maọbụ karịa.
Enweela ọnụ ọgụgụ ọbara mgbali elu n'oge na-adịbeghị anya, nke onye ọkachamara ahụike were ma ọ bụ jiri ihe nleba anya mgbali elu ụlọ.
Ihe ị gaghị eme
I kwesịghị iji ngwá ọrụ a ma ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye ị na-eji ya:
Dị afọ 17 maọbụ erughị
Di ime.
Na-aṅụ ọgwụ nwere ike imetụta ọbara mgbali gị.
Emeela ịwa ahụ n'oge na-adịbeghị anya ma ọ bụ nwee mmerụ ahụ.
Na-enwe ahụ adịghị mma site na mgbaàmà ọhụrụ dị ka isi ọwụwa, ọgbụgbọ ma ọ bụ isi ọwụwa.
Ahụla onye ọkachamara ahụike na nso nso a gbasara ọbara mgbali elu gị wee nweta ndụmọdụ ahụike.
I kwesịghị iji ngwá ọrụ a chọpụta mgbaàmà ọbụla. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị maka ọbara mgbali elu, hụ dọkịta.
Ndụmọdụ maka ilele ọbara mgbali elu gị nke ọma
Mgbe ị na-ewere ọbara mgbali elu n'ụlọ, e nwere ihe ndị ị nwere ike ime iji nyere aka nweta ọgụgụ ziri ezi.
Nọdụ ala n'oche kwụọtọ nwere azụ.
Tinye ụkwụ gị n'ala.
Mee ka ogwe aka gị guzosie ike na tebụl wee mee ka aka na ogwe aka gị dị jụụ.
Yiri uwe aka dị mkpụmkpụ.
Wetuo obi, na-eku ume nke ọma ma ghara ikwu okwu n'oge ule.
Were agụ ọzọ nkeji ole na ole ka ịgụchara mbụ gị wee lelee na ọ bụ eziokwu.
Tulee ọbara mgbali gị n'ụtụtụ na mgbede.
Lelee nkezi ọbara mgbali elu gị
A na-ede ọbara mgbali elu dịka ọnụọgụ abụọ. Nọmba nke ‘systolic’ na-anọchianya nrụgide dị n’ọbara mgbe obi na-agbakọ maọbụ na-akụ. Nọmba ‘diastolic’ na-egosi nrụgide dị n'ọbara mgbe obi na-ezuike n'etiti ịkụ.
Tinye ọbara mgbali elu gị site na ugboro abụọ dị iche iche n'okpuru.
Ọgụgụ ọbara mgbali elu gị bụ:
Ọgụgụ mbụ
Ọgụgụ nke abụọ
Ịgbakọ ihe egwu ọbara mgbali elu
Nrụgide diastolic
Nọmba ala
405060708090100110120+
708090100110120130140150160170180190+
Nrụgide Systolic
Nọmba elu
Ihe egwu ọbara mgbali elu gị bụ:
Dị ala
Nkịtị
Tupu ọbara mgbali elu
Agba 1 Ọbara mgbali elu
Agba 2 Ọbara mgbali elu
Ọ bụ otu usoro ọgụgụ ziri ezi ka a chọrọ
Ịghọta ọgụgụ ọbara mgbali elu gị
A na-achọpụta ọbara mgbali elu ma ọ bụrụ na, mgbe e nnyochara ya n'ụbọchị abụọ dị iche iche, systolic ọbara mgbali elu na ụbọchị abụọ bụ ≥140 mmHg na/maọbụ ọgụgụ ọbara mgbali elu diastolic na ụbọchị abụọ ahụ bụ ≥90 mmHg. .
Mee ọgụgụ ọbara mgbali elu n'ime otu ọnwa
Ndụmọdụ maka usoro ndị ọzọ
Ọ bụrụ na ị na-enwe nke ọ bụla n'ime mgbaàmà ndị a na ọbara mgbali elu, chọọ nlekọta ozugbo.
Ahụghị ụzọ nke ọma maọbụ mgbanwe n’ịhụ ụzọ
Anya ajụ
Oke isi ọwụwa
Nchegbu
Obi mgbu
Ihe isiike ikuume
Agbọọ
Ịgbọ agbọọ
Ọgbaghara
Ntị ịzụ wuruwuru
Azị imi
Ndagherị ụdaobi
Gbochie ọbara mgbali elu
Mgbanwe ụdị ndụ nwere ike inye aka belata ọbara mgbali elu gụnyere:
Na-eri nri nke ọma
Nri obere nnu
Ịbelata ibu
Na-emegharị ahụ
Ịkwụsị ụtaba
Isi mmalite: Otu Ahụike Ụwa na Ọrụ ahụike mba UK
Biko kwalite ihe nchọgharị gị
Wegharịa ọgwụ ka ya na ahụ gị na-arụkọ
E nwere ihe mgbaama dị ugbua na-egosi na ọgwụ dị iche iche, gụnyere ọgwụ maka obi, nwereike ịrụ ọrụ ọfụma ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya n'otu mgbe n'ụbọchị.
N'ime nchọpụta nke ugbua, e ji ihe ruru mmadụ puku 19 wee nwalee ọgwụ ọbara mgbalielu ahụ.
Na nwale nke e mere ndị si mba Spen:
* E kewapụtara ndị e nyochara ụzọ abụọ - otu bụ ndị ṅụrụ ọgwụ n'ụtụtụ ebe ndị ọzọ bụ ndị ṅụrụ ya tupu ha alaba ụra abalị.
Ndị ọkachamara sị na ọ bụrụ na ọ daghị n'abalị, na-arị elu oge ọbụla, mgbe ahụ ka ị nwereike ibanye na nsogbu obi nkoropu nakwa mkpọnwụ ahụ.
Dịka nchọpụta ahụ si kọwaa, ịnwụ ọgwụ gị n'abalị ga-enye aka ibudata nrugharị ọbara gị n'abalị, maka ndị a chọtara ya bụ ọrịa nke Bekee kpọrọ Hypertension n'ahụ ha.
Ndị nke ṅụrụ ọgwụ ha tupu ha alaba ụra, nrugharị ọbara ha n'abalị nakwa n'ime ụbọchị dị ọkara, ọ gbadakwa ọzọ n'abalị, ebe ndị nke ṅụrụ nke ha n'ụtụtụ adịghị etu ahụ.
Ọkammụta Ramon Hermida nke mahadum Vigo bu nchọpụta a n'isi, sị na ndị dọkịta nwereike itule ya ma gwa ndị ha na-agwọ ọrịa maka ya, n'ihi na o nwere ike ịzọ ndụ ọtụtụ ndị mmadụ.
Atụmatụ e ji agwọ ọbara mgbalielu ugbua enweghi oge e dere na ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-eji agwọ ya. Ndị dọkịta na-akacha agwa ọtụtụ ndị mmadụ ṅụọ ọgwụ n'ụtụtụ makana nkwenye na-ekwu na ọ na-akụda nrugharị ọbara n'ụtụtụ.
"Mpụtara nyocha a gosiri na ndị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu tupu ha alaba karịa ịṅụ ya mgbe ha tetara, na-enwe ike ijide nrugharị ọbara ha. Nke ka mkpa bụ na ọ ga-ebudata ohere ha inweta ọrịa obi nakwa nke ọbara nakwa ọnwụ."
O kwuru na ha ka kwesịrị ime nyocha ndị ọzọ si n'ọgbakọ ndị mmadụ si mpaghara ọzọ ịmata ma nchọpụta ha ọ ga-abara onye ọbụla nakwa ọgwụ ọbara mgbalielu dị iche iche.
Gbaara ụdịrị omume a ọsọ makana o nwereike ịmetụta nrugharị ọbara gị:
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onye na-eme nnyocha ọnọdụ ọbara mgbalielu ya
* Ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya
* Ịfụ anwụrụ
* Ibu oke ibu
* Agbatịghị ahụ etu e kwesịrị
* Iri oke nnu
Vanessa Smith, nke si na British Heart Foundation, kwuru sị: "N'agbanyeghị na nchọpụta a kwadoro ihe a chọpụtaburula n'ihe gbasara ọrịa a, a ka kwesịrị imekwu nyocha n'ebe ndị mmadụ si agbụrụ dị iche iche nọ, nakwa ndị na-arụ ọrụ ịgbanwe oge (shift), iji chọpụta ma n'eziokwu n'eziokwu ịnwụ ọgwụ nrugharị ọbara n'abalị ọ na-aka mma maka ahụike obi."
"Ọ bụrụ na ị na-aṅụ ọgwụ ọbara mgbalielu ugbua, ọ dị mkpa ịjụ dọkịta gị tupu ị gbanwee oge i ji aṅụ ya. Makana e nwereike inwe ihe kpatara dọkịta ji sị gị na-aṅụ ya n'ụtụtụ maọbụ n'abalị."