Nigeria vs South Africa: Ugo eberela na mgbagbu

Ndị otu bọọlụ Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu bọọlụ Super Eagles
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ekwuola na ha di njikere maka asọmpi nke ha na ndị ogbo ha nke mba Saut Afrịka n'agba anọ ikpeazụ nke iko mba Afrịka.

Mba Saut Afrịka gosiri na ha so n'ihe a na-eme mgbe ha gbapụrụ mba Ijipt na-agbanyeghi na ọbụ be ha ka a nọ asọ mpi 'African Cup of Nations' (AFCON) nke afọ a.

Nke a mere ka onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr kwuo na Saut Afrịka buzi okwu akpụ n'ọnụ ugbu a.

Mana Rohr kwukwara na ndị otu ya ma ihe ha ga-eme ma ekeremgba bido.

Mikel Obi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnyendu ndị otu bọọlụ Naịjirịa - Mikel Obi

Dịka ọ dị ugbua, ahụ zuru ndị otu Super Eagles niile oke maka asọmpi nke mgbede taa.

Mikel Obi bụ onye ndu ha agbakeela nke ọma n'ahụ o meruru mgbe Naijiria zutere Madagaska.

Gernot Rohr

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gernot Rohr onye nkuzi Super Eagles

N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ enwere na Cairo, Ijipt ụnyaahụ, Odịon Ighalo kwuru na ndị Saut Afrịka ma ihe ekwe na-akụ mana egwu ọbụla adịghị ndị "Super Eagles" n'ahụ.

"Asọmpi a ga-esi ike, mana anyị akwadoola nke ọma. Obi siri anyi nile ike. Ebumnuche anyị bụ ibulata iko AFCON na Naijiria."

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Soshal midia esorola tinye ọnụ n'okwu a dịka Nigeria 2 - 1 South Africa na-ewu.

Local Black Man na-ajụ ihe mere mpụtara a ji ewu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Broskie sị na ọ bụ Sawụt Afrịka meriri Naịjirịa 2 - 1.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ije Kelvin sị na Naịjirịa ga-emeri maọbụrụ na ha eyighi uwe a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Thulani Hlatshwayo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyendu ndị otu bọọlụ Saut Afrịka, Thulani Hlatshwayo

Cheta na Naijiria na Saut Afrịka ezutela onwe ha ugboro iri na anọ na mgbe gara aga.

Naijiria meriri ubgoro asaa ma Saut Afrika meriri ugboro abụọ.

Mba abụọ ahụ zutere onwe ha mgbe a na-eme nkwado maka AFCON ebe Saut Afrịka meriri Naijiria na Uyo dị na Akwa Ibom steeti.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ịkpa akwa Akwete