'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell anaemia'

Aha onyonyo, World Sickle Cell Day: 'Ndị mmadụ na-akpachapụ anyị n'ihi na anyị nwere ọrịa 'Sickle Cell'

Dịka ụwa niile na-eme ncheta ọrịa ọbara a kpọrọ 'Sickle Cell Anaemia' n’olu Bekee taa bụ abalị 19 nke ọnwa Juun afọ 2024, ndị nwere ya bụ ọrịa akwaala arịrị na ndị mmadụ na-akpachapụ ma na-anapụkwa ha ihe dị ịche ịche n’ihi ya bụ ọrịa.

Iji mee ka ndị mmadụ ghọta nke ọma ihe ọria 'Sickle cell' pụtara, anyị gara na ụlọọgwụ 'University of Nigeria Teaching Hospital' (UNTH) dị n'Ituke ozalla, Enugwu, wee nụta ọtụtụ ihe mgbawa obi mere ụmụnwaanyị abụọ bu ọrịa ahụ.

Nwada Rose Ifenu kwuru na ọdịla ụmụnwoke abụọ chọburu ịlụ ya, ma gbaa ya alụkwaghịm ka ha chọpụtara na o nwere ọrịa ahụ.

Ọzọkwa bụ na a chụrụ ya n’ọrụ ya n’ihi na ọ rịọrọ ka e nye ya mkpụrụ ụbọchị ole ma ole ka ọ gaa ụlọọgwu.

Nke a mere onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ jiri chụọ ya n’ọrụ.

Oriakụ Somadina Ezeanochie bụkwa onye otu “SICKLE CELL WARRIORS” kwuru na ọ hịara ya ahụ tupu ya ahụ nwoke lụrụ ya na-agbanyeghị na o bu ya bụ ọrịa.

Somadina kọwara na ya amụọla otu nwa na-agbanyeghị ahụ ụfụ kwa mgbe kwa mgbe ọrịa ahụ na-ebute.

Nnukwu Dọkinta na-ahụ maka ọbara na UNTH Enugwu bụ Dkta. Helen Okoye kwuru na ọrịa SS ahụ abụghị nke ọnwụ.

Ọ kọwara na ọtụtụ ndị SS na-adịzi ndụ rue n' ezigbo agadị, n’ihi na e wepụtala ọgwụ nakwa ụzọ ọzọ dị iche ịche e si akwọ onye ikwu wara.

Dọkinta ji ohere ahụ gwa ndị mmadụ kwụsị ịgbawa ndị nwere ọrịa ahụ obi, kama ka ha nyere ha aka na-agbanahụ nsogbu dị na ya

Kirie ihe ha gwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu: