Women in Politics: Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bara n'Ụlọmeiwu na Ntuliaka 2023 ọ na-agbada?

Ebe foto si, Miriam Onuọha, Ireti Kingibe, Lilian Orogbo/Facebook
Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị ga-anọ ụlọomeiwu Naijiria adaala site n'ihe ọ bụ n'afọ 2019.
Ụmụnwaanyị nwetara mmeri ịnọ n'oche 13 n'ime 360 (iri na atọ n'ime nari atọ na iri isii) dị n'Ụlọomeiwu Nta nke bụ 3.61% ndị omeiwu ga-abanye n' ụlọomeiwu ahụ mailite n'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ a.
Nke a bụ obere gbalite pasenti .56(.56 %) dịka ọ bụ ụmụnwaanyị 11 nke bụ pasent 3.05 n'afọ 2019.
Otu onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ Ada Agina ude nwere ọnụ na ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị banyere n'ụlọomeiwu gbalitere obere, rtụturu aka na o rubeghị ihe a na-achọ nke bụ ka ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nọ n'Ụlọomeiwu na nke ọgbo ha n dị nwoke hara nhatanha.
Agina-Ude kwụrụ sị, "Ọ bụ ihe mwute tumadi n'Ụlọomeiwu Ukwu bụ ebe ọ ga- amugbu onwe ya ma anyi karia otu a.
"Ụmụnwaany na-agazi akwụkwo ugbua, ahụghị m ihe kpatara ụmụnwoke ga-akarị ụmụnwaanyị n’ụlọomeiwu. Ha kwesịrị ịha nhatanha, 50:50.”
Naanị ụmụnwaanyị atọ nwetara mmeri ị banye senate na ntuliaka a e mere na nsonso a.
Ha bụ Harry Banigo (PDP) Rivers; Idiat Adebule APC nke Lagos nakwa Ireti Kingibe( LP) na-anọchite FCT.

Ebe foto si, Idiat Adebule/ Ipalibo Harry Banigo/Facebook
Ụmụnwaanyị asaa nọbu n'Ụlọiomeiwu Ukwu nke Itoolu, ọtụtụ n'ime ha enwetaghị ohere ịlọghachi.
Ụmụnwaanyị ndị banyere oche omeiwu Naijiria

Ebe foto si, Maureen Gwacham /Clara Chinwe Nnabuife/Facebook
Ụmụnwaanyị meriri na ntuliaka ụlọọmeiwu e mere na nsonso a ịbanye n'Ụlọomeiwu Nta gụnyere:
1. Onuoha Miriam Odinaka ( APC), Isiala Mbano, Okigwe, Onuimo
2. Orogbu Obiageli(Labour Party), Awka North/Awka South
3. Nnabuife Chinwe Clara(YPP), Orumba North/ Orumba South
4. Gwacham Mauren Chinwe (APGA), Oyi/Ayamelum
5. Ebikake Marie Enenimiete (PDP), Brass/Nembe
6. Akume Regina (APC) Gboko/Tarka

Ebe foto si, Boma Goodhead/ Regina Akume/Facebook
7. Onuh Onyeche Blessing - APC, Otukpo/Ohimini
8. Zainab Gimba - APC, Bama/Ngala/Kala-Balge
9. Ibori-Suenu Erhiatake - PDP, Ethiope East/Ethiope West
10. Beni Butmak Lar (PDP), Langtang North, Langtang South
11. Goodhead Boma (PDP), Akuku Toru, Asari Toru
12. Bukar Abba Ibrahim Khadijah Waziri - APC, Damaturu, Gujuba, Gulani, Tarmuwa
13. Fatima Talba - APC, Nangere Potiskum













