Imo State Governorship Election: Ndị Imo ekwuola na Uzodimma, a ga ya ugboro abụọ

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) akpọpụtala aka na-achị Imo steeti na onye fere ọkọlọtọ APC dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahu n'abalị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023.
Uzodimma, onye meriri n'okpuru ọchịchị 27 dị na steeti ahụ ji vootu dị 540, 308 merie ma nweta ohere ịchị agba nke abụọ ya.
Onye zọrọ n'aha otu PDP bụ Sam Anyanwụ (Sam Daddy) gbara onye nke abụọ dịka o nwetara vootu 71, 503, ebe onye feere otu 'Labour Party' bụ Athan Achonu, gbara onye nke atọ dịka o nwetara vootu 64, 081.

Ebe foto si, BBC/Sam Anyanwu
Mana otu PDP na 'Labour Party' jụrụ mpụtara ahụ ma kpọọ oku ka a kagbuo ntuliaka ahụ kpamkpam, sị na ndị ọrụ nchekwa na ndị Inec kpara nkata nye otu APC ohere ime wuruwuru na ntuliaka ahụ.
Dịka Inec si kwuo, mmadụ 2, 419,922 debanyere aha ha maka ịtụ vootu, ebe mmadụ 2,318,919 naara kaadị atụmvootu ha nIm O steeti.

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook
Na-agbanyeghị na pati 18 soro zọọ ntuliaka ahụ, nanị ndị chị ọgbọ n' ọsọ ntuliaka ahụ bụ Uzodimma nke APC, Athan Achonu nke Labour Party, Samuel Anyanwunke PDP na Jack Ogunewe nke Action Alliance.
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post
Mana o nweghị onye n'ime ha nwetara mmeri ma ọbụladị n'otu Okpuru ọchịchị dịka Uzodimma meriri n' okpuru Ọchịchị 27 dị na steeti ahụ.
Cheta...
Uzodimma bụ gọvanọ nke ise kemgbe afọ 1999 bụ mgbe e weghachiri ọchịchị site n'aka ndịagha ga n'aka ndị nkịtị.
Achike Udenwa nke PDP bụ gọvanọ Imo steeti afọ asatọ malite n'abalị 29 ọnwa Mee 1999 rue Mee 29 afọ 2007.
Ikedi G. Ohakim chịrị naanị afọ anọ dịka Gọvanọ steeti ahụ malite n'abalị 29 Mee 2007 rue abalị 29 Mee, afọ 2011
Rochas Okorocha chịrị Imo steeti afọ asatọ malite n'abalị 29 Mee afọ 2011 rue abalị 29 ọnwa Mee 2019.
Emeka Ihedioha nke PDP chịrị ọnwa isi dịka Gọvanọ Imo steeti malite n'abalị 29 May 2019 rue abalị 15 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020 bụ oge Ụlọikpe Kachasị napụrụ ya oche nye Hope Uzodimma.
Nke a na-abịa dịka Uzodimma , onye gbara onye nke anọ na ntuliaka e mere n'gọvanọ Imo steeti gbaghara mkpọpụta Ihedioha n'ụlọikpe rue Ụlọikpe Kachasị bụ ebe e nyere ya mmeri.















