Ndị uweojii atọghapụla Naira Marley na Sam Larry

Otiegwu Naira Marley na onye a ma ama bụ Sam Larry

Ebe foto si, Sam Larry/Naira Marley/Instagram

Ndị uweojii atọghapụla otiegwu Azeez Fashola a ma dịka Naira Marley nakwa onye a ma ama aha ya bụ Sam Larry bụ ndị abụọ anwụchiri maka nyocha banyere ọnwụ Ilerioluwa Aloba bụ Mohbad,

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bu Benjamin Hundeyin kwuru na nke a mere dịka ha mezuru iwu so ntọghapụ ha.

Nke a na-abịa dịka Naira Marley na Sam Larry gbara ndị uweojii akwụkwọ n'ụlọikpe ịtọghapụ ha n'ihi na ejichila ha karịa oge iwu Naịjirịa nyere.

'Ọ bụghị m gburu di m' na ihe ndị ọzọ nwunye Mohbad gwara ụlọikpe

Wunmi Aloba, nwunye Mohbad

Ebe foto si, @Wunmi

Nwunye Ilerioluwa Aloba, otiegwu a ma ama lara mmụọ na nsonso a a ma dịka 'Mohbad' ekwuola na aka ya adịghị n'ọnwụ di ya.

Oriakụ Wunmi Aloba gbara afọ 24 kwuru nke a ụbọchị Tuzde n'ihu ụlọikpe pụrụ iche Gọọmentị Legọs Steeti hiwere(corona inquest ) iji nyocha etu otiegwu Mohbad si nwụọ.

Mohbad nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba afọ 2023 n'ụzọ edoghị anya.

Ọnwụ ya kpalitere ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche na Naijiria dịka ndị ntọrọbịa kpọrọ oku ka e nyochaa ọnọdụ butere ọnwụ ya dịka ụfọdụ na-arụ nna egwu ya bụ Naira Markey na Sam Larry, ebe ụfọdụ na-arụ nwunye ya aka.

Mana n'ụlọikpe ahụ pụrụ iche e hiwere maka nnyocha ọnwụ ya, ụbọchị Tuzde, Oriakụ Aloba ji awa atọ kọwaa ihe ọ ma maka ọnwụ di ya.

O kwuru na "di m na enyi ya bụ Prime Boy lụrụ ọgụ n'Ikorod ka di m tichara egwu n'abalị 10 nke ọnwa Itoolu."

O kwuru na enyi di ya na di ya malitere ịrụrịta ụka nke mere ka di ya bụ Mohad kwụsị ụgbọala, si enyi ya ritu, ọgụ were suo.

Oriakụ Aloba kwukwara na dịka nọọsụ gbachara Mohbad ọgwụ, na Mohbad malitere ikwu na ka ahụ si eme ya, ma gaa n'ulọmposi gbọọ agbọọ.

" Nọọsụ ahụ bịara n'ebe Elekerere Mbụ, oge ahụ , aka Mohbad azawala."

N'ajụjụ ihe mere na O bugaghị di ya n'ụlọọgwụ, Oriaku Aloba kwuru na egwu ụlọọgwụ na-atụ Mohbad kemgbe o si n'aka Nna egwu ya bụọ, dịka a na-ezitere ozi iyi ndụ ya egwu.

Mohbad

Ebe foto si, Mohbad/Twitter(X)

O kwukwara na-egwu bara Mohbad ahụ dịka ndị ọrụ ngalaba na-ebu agha megide ọgwụike na Naijiria bụ NDLEA n'ịchafụ bịachara kpụrụ ya nandị ọzọ na-eti egwu n'okpuru nna egwu ya.

Oriakụ Aloba sịrị, "Ọ gwara m sị na ha kụrụ ya egbe n'isi, o nwetaghịkwa onye ya kemgbe ahụ."

" Ọ gwara na ha nyere ihe dị ọcha sị ya nwụọ. n'ezie, a hụrụ ihe na-acha ọcha n'akpụkụ ọnụ ya."

Nwunye Mohad rụtụkwara aka na ndị na-akpagbu di ya bụ ndị o kwuru na-amaja ya , eyi ya egwu tupu ọ nwụọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ewezụga otiegwu Olamide na Bella Shmurda, na ndị otiegwu ndị ọzọ na-asọ ya asọ ka o si n'aka nna egwu ya bụ Naira Marley pụta.

"Bella Shmurda nyere anyị nri ọnwa atọ oge nsogbu a nile dapụtara n'ihi na o nweghịkwa ihe anyị nwere."