Imo Election 2023: Samdaddy, Uzodimma, Athan, Ejiogu na ndị ọzọ na-azọ ọkwa Gọvanọ

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti

N'ụbọchị 17 ọnwa Aprel afọ 2023 bụ ụbọchị ikpeazụ ngalaba Independent National Electoral Commission (INEC) nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị nọ n'Imo steeti ịwepụta onye ga-eji ọkọlọtọ pati ha zọọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti.

Ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka All Progressive Grand Alliance (APGA), Peoples Democratic Party (PDP), Labour Party (LP) na All Progressive Congress (APC) na ndị ọzọ họpụtara ndị ga-azọ ọkọwa gọvanọ n'aha pati ha.

Ntuliaka ga-adị n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 2023.

Lee ụfọdụ ndị ga-efe ọkọlọtọ pati dị iche iche na ntuliaka a nakwa ihe i kwesịrị ịma maka ha.

Hope Uzodinma nke APC

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Onyeisi nzụkọ na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ otu All Progressive Congress bụ William Kayoda kpọpụtara Hope Uzodinma dịka onye ga-anọchite anya otu ahụ oge ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Nke a na-eso mpụtara ntuliaka imeụlọ nke otu AOC nke Imo steeti mere nke Uzodinma ji vootu 63,618 merie ya bụ ntuliaka.

Uzodinma onye bụbu onye ọmeiwu nọchitere anya Imo west n'afọ 2011 ma bụrụkwa gọvanọ Imo Steeti ugbua.

Athan Achonu nke Labour Party

Nneji Athan Achonu

Ebe foto si, NNEJI ATHAN ACHONU/FACEBOOK

Onye omeiwu Athan Achonu meriri ntuliaka otu Labour Party ji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa dịka ọ meriri ntụliaka ime ụlọ nke otu ahụ.

Cheta na a ga-eme ya bụ ntụliaka nke ọkwa gọvanọ Imo Steeti n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.

Achonu na-anọchite anya okpuruọchịchị Imo Nọt n'afọ 2015.

Ọ bụ onye meriri ntuliaka gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti bụ onyeisioche nzụkọ na-ahụ ntuliaka ime ụlọ Imo Steeti kpopụtara Achonu dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ a dịka ọ bụ ya kacha nwee vootu.

Otti kwuru na Achonu nwetara vootu 134 ebe onye nke na-eso ya n'azụ nwetara vootu 121

Samuel Anyanwu nke PDP

Sam Anyanwu ji aha PDP azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti

Ebe foto si, Samdaddy/Facebook

Na ntuliaka ịmeụlọ otu pati PDP mere n'ụbọchị wenezde ka ha ji kpọpụta onye omeiwu Samuel Anyanwu dịka onye meriri ntuliaka ime ụlọ ha.

Ọ bụ onyeisioche nzụkọ na-ahụ maka ntulliaka ime ụlọ otu PDP bụ Kenneth Okon kpọpụtara ya dịka onye meriri.

O kwuru na Anyanwụ nwetara vootu 802.

Otu PDP na-atụanya na Anyanwụ ga-ama gọvanọ steeti ahụ aka oge ntụliaka nke a ga-eme n'ọnwa Nọvemba afọ a.

Tony Ejiogu nke APGA

Tony Ejiougu ji aha APGA azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti

Ebe foto si, Tony Ejiogu/Facebook

Otu All Progressive Grand Alliance họpụtara Maazị Tony Ejiogu dịka one ga-anọchite anya otu ha oge ntụliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti.

Tony Ejiogu bụ nwafọ Umuakuru, Emekuku nke dị n’Owerri.

A mụrụ ya n’ụbọchị 23 Maachị afọ 1974 n’ezinaụlọ Sir na Lady Ambrose Ejiogu.

Ọ gụrụ akwụkwọ n’Imo Steeti praịmarị dị n’Aba, gụọ Sekọndịrị na St. Peters Claver Seminari dị na Ngọr Okpala. Gụọ mahadum Akron dị n’Ohio nke mba Amerịka.

Ihe banyere nchịkọta ego, azụmaahịa nakwa nwulite ndụ mmadụ doro Ejiogu anya nke ukwuu.

N'okwu nnabat ya ka Ejiogu kwuru na ya dị njikere ịnweta mmeri n'oge ntuliaka.

Ọ kwere nkwa na ya merie dịka gọvanọ steeti ahụ na ọ ga-eme ka ọrụ dị ma weghachị ọchịchị okpuruọchịchị steeti ahụ etu ọ kwesịrị ịdị.

Ben Uche Odunze nke NNPP

Ben Uche Odunze ji aha NNPP azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti

Ben Uche Odunze ji aha New Nigeria Peoples Party NNPP azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na ntuliaka a ga-eme n’ụbọchị Satọde 11 Nọvemba.

Obinna Bright Ekwebelem nke SDP

Obinna Bright Ekwebelem ji SDP azọ ọkwa Gọvanọ Imo Steeti

Obinna Bright Ekwebelem bụ onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti na ntuliaka ọnwa Nọvemba 2023.

Ekwebelem bụ nwafọ Okwele nke dị n’okpuruọchịchị Onuimo nke Imo steeti.