Etu aka siri kpara nwokorobia a sị na-ezu ụmụaka,ere n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Enugu Police Command
Ndị uweojii Naijiria ekwuola na ha na-eme nnyocha banyere nwokorobia asị na-atọrọ ụmụaka ere sị ndị na-aeme ọgwụ ego nakwa mpụ ndị ọzọ.
Akụkọ kwuru na iko Ifeanyi Omeke gbara afọ 21 juru dịka ọ gara n' Ifeanyi Omeke aged 21, Igogoro dị n'Enugu-Ezike n'Okpuru Ọchịchị izu nwatakirị nwaanyị n'abalị 27 nke ọnwa Oktoba ,afọ 2023.
Ihe onyonyo fegharịrị na-soshal midia gosiri nwokorobia ahụ dịka o kwupụtara na ya na-ezuola ohi ụmụaka iri bụ ndị 0 resịrị ndị na-ekwu chamdum a kpọrọ 'yahoo- yahoo' maka iji agwọ ọgwụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Dan Ndukwe , onye kwuru na ya bụ akụkọ bụ eziokwu kwuru na nwa amadị ahụ kwupụtara na ya ezuola ụmụaka iri ma resi ha ndị na-eme chamdum.

Ebe foto si, Enugu Police Command
Ndukwe sịrị, "A nwụchiri nwa amadi a a na-enyo enyo oge o zubara n'ụlọ onye wetara anyị mkpesa n'obodo ahụ chọrọ izuru nwa nwaanyị dị otu afọ na ọnwa atọ."
"O kwetara na ya mere ya bụ mpụ, sị na o nwere ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ izu ụmụaka, ere maka iji ha gwọọ ọgwụ ego na mpụ ndị ọzọ."








