Ebiela m n'ala Igbo afọ 25, amaghị m na ụdị ihe a ga-eme m - Nwoke e gburu nwunye ya na ụmụ ya anọ

Nwoke e gburu nwunye ya dị ime ọmụmụ na ụmụaka ya anọ kọwaara BBC Igbo etu ndụ ya siri kụsaa kemgbe ihe a mere.
N'ụbọchị ụka ka akụkọ etu ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ siri gbagbuo otu nwaanyị dị ime bụ Harira Jubril na ụmụ ya anọ (na-agụnyeghị nke o bu afọ) n'Osulo dị n'Ọrụmb-North, dị n'Anambara steeti.
Jubril Ahmed gbara afọ 42 bụ onye birila n 'Isulo nke okpuruọchịchị Orumba North kemgbe afọ atọ gwara BBC Igbo na ọ bụ na mgbede ụbọchịụka ọ latara ọ gara ọrụ ebe ọ bụ onye nche na-echere otu nwafọ obodo ahụ nche ka o nwetara ozi ihe mere.
Onye Ọkpuru ọchịchị Ganye nke Adamawa steeti, kwuru na nwunye ya kpọrọ ya n'ekwentị n'ebe Elekere anọ nke mgbede gwaa ya na ya na ụmụ ya na-aga ịhụ nwanne ya nwaanyị bi n'Ajali.
Ka o si kwuo, "Ihe a bụ ikpeazụ m nụrụ olu nwunye m" .
Ahmed kwuru na ọ bụ ka ọ lọtara ọrụ na mgbede ebe elekere isii, ọ hụghị nwunye ya n'ụlọ. Ya bụ ihe gbagwojuru ya anya.
Ọ kọwara na nwunye ya na-ahaziri ya mmiri ịsa ahụ nakwa nrị tupu ọ lọta ọrụ.
Ọ jụrụ nwanne ya nwoke o zutere n'ụlọ ya "Kedụ ebe nwunye m nọ?"
Nwanne ya gwara ya ka o nọrọ nwanyọọ zuo ike.
O kwuru na nwanne ya mechara gosị ya ihe onyonyo gosiri ozu nwunye ya n'ụmụ ya anọ ebe e gburu ha n'ụzọ.
O kwuru na o kubituru ya nwa mgbe nta dịka ọ hụrụ ihe onyonyo ahụ.

Ebe foto si, Harira Jubril
Ọ gara n'ihu kwuo na ada ya nwaanyị nke mbụ gbara naanị afọ itolu, nke na-eso ya gbara afọ asaa, osote ya dị afọ anọ, ebe nke ikpeazụ dị afọ abụọ.
O kwuru na nwunye ya kwesịrị ịmụ nwa ha nke ise n'ọnwa Mee a dịka ọ nọzị n'ọnụ ọmụmụ.
Mahmood ji obi mgbawa na olu arịrị kwuo: "Kemgbe m nụrụ akụkọ a, eribeghị m nri"
"A hụrụ m ezinụlọ m n'anya nke ukwuu", ahụ ka na-ama m jijiji kamgbe"
"Ọ dị m ka ụwa m agwụla kamgbe m nụrụ maka ogbugbu nwunye m na ụmụ m anọ"

Ebe foto si, Harira Jubril
Mahmood kọwara na ndị uweojii Naijirịa nke obodo Umunze e bugala ozu ndị be ya gaa ọdọ ozu nọ n'obodo ahụ.
Nwoke a kwukwara na ha na-akwadozị akwamozu ezinụlọ ya a nke ndị ojiegbe mechiri n'ike n'obodo ha dị n'Adamawa steeti.
Ọ kọwara na o biela n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo afọ iri abụọ na ise (25) dịka o birila n'obodo Isulo ruo afọ atọ.
Mahmood kwuru "Kamgbe m bi ebe a, enweghị onye mụ na ya nwere nsogbu ọbụla"
"Ndị obodo a hụrụ m n'anya, ahụkwara m ha n'anya nke ukwuu. Anyị na-ebi n'udo na ọṅụ kemgbe"
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC na ezigala ndị uweojii na mpaghara ahụ dịka ha na-agba mbọ ịnwụchị ndị mere ihe a.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na n'otu ụbọchị ụka ahụ, ndị ojiegbe gbukwara ndị mmadụ n'Adazi Nnukwu, Ogidi, Nanka, nakwa Abatete nke dịcha n'Anambra.
Nke a na-abịa nanị ka ọ gachara otu abalị e jiri gbuo onye omeiwu nke steeti ahụ bụ Okechukkwu Okoye, bepụ ya isi ma tọgbọọ isi ya n'otu obodo, ahụ ya n'obodo ọzọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga zara ekwentị mana o kweghị asa okwu n'okwu mkpamkpa nile kpara na Anambra steeti.
BBC Igbo natara ozi n'aka onyeisi otu jịkọrọ ndị ugwu bi na mpaghara ahụ nke na-achọghị ka a kpọọ aha ya, o kwuru:
"Ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala kutuo nwaanyị ahụ na onye ọkada bu ya."
"Onye Okada ahụ gbara ọsọ ndụ gbaba bee ndị mmad nọ nso ebe ahụ".
Ọnọdụ enweghị nchekwa na-akwanye njọ n'Anambra steeti dịka o sikwa eme n'akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị ọzọ.

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook
Ihe gọọmentị Anambra steeti na-eme maka nchekwa
Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo akpọọla oku ugboro ugboro kemgbe ọnwa Maachị 2022 ọ malịtere ọchịchị na steeti ahụ, rịọ arịrịọ, ma tie mkpu ka a kwụsị ọnọdụ tigbuo zuogbuo na steeti ahụ.
O kwuru na ọ dị njikere ka ya na otu ojiegbe ndị a na-enye nsogbu a nwee mkparịtaụka.
Soludo kwukwara na ya dị njikere ịmata ihe bụ iwe ha nakwa ime ihe niile o nwereike iji mee ka iwe ha dajụọ.
Soludo kwekwara nkwa inye ndị ekperima mgbaghara pụrụ iche bekee na-akpọ 'amnesty', ma nyekwa ha ọzụzụ iji mee ka ha bụrụ mmadụ.
Dịka akụkọ pụtara maka ọnwụ Okechukwu Okoye, Soludo kwere nkwa nde naịra iri maka onye ọbụla ga-enye aka ka a nwụchie ndị niile aka ha dị n'ọnwụ ya.
Agbanyeghi na o kwuola na ọnọdụ enweghị nchekwa na steeti ahụ na-emebi ọnọdụ akụnaụba steeti ahụ nakwaala Igbo, atụmatụ ya idaju ihe ndị a kemgbe ọnwa Maachị amịtabeghị mkpụrụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










