Anambra Killings: Can akatọọla ogbugbu e gburu Halira na ụmụ ya anọ

Njirimara ndị otu ụka

Ebe foto si, Church Channels

Otu jikọtara ndị otu Kraịst bụ Christian Association of Nigeria (CAN) akatọọla ogbugbu e gburu Halira Jubril na ụmụ ya anọ na Anambra steeti ụbọchị ụka.

Ha gwara gọọmentị Naịjirịa ka ha gbaa mbọ jide ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ dịka iwu kwuru.

Ha dere na, Ihe a ndị a mere dị njọ, ọ nweghị atụ. Ọnweghị onye ga-anabata ụdịrị agwa ahụ. Anyị na-akpọkụ ndị ọrụ nchekwa ka ha kulie rụọ ọrụ ha ka o kwesiri. Ndị ajọ mmadụ a jizi mpụ-na-iti akpa arụ, ebe ndị kweisiri ijide ha nyụrụ nkọ ka mma".

Ha kpọkụrụ ndị ọtụ Ipob ka ha kwusi oke igbu mmadụ a na-eme n'aha mnwereonwe.

Ha sị na otu Ipob kwesiri ị ma na oke ogbugbub mmadụ anaghị enyere onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu aka n'ikpe ya.

Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ndị aka ha dị n'ogbugbu mmadụ ha chee aka ghọrọ ya

Buhari na ụmụaka anọ e gburu

Onyeisiala Muhammadu Buharị adọọla ndị na-ebu akụkọ ụgha gbasara ụmụaka anọ na nne ha egburu n'Anambra steeti ka ha kpachara anya ha ghara ịme ihe ọbụla nwereike ibute ọgbaghara.

N'akwụkwọ ozi onye enyemaka mgbasa ozi ya bụ Garba Shehu tinyere aka, Buhari gwara ndị mmadụ bụ ndị chọrọ ịmegwara ya bụ ihe e mere n'ọwụwa anyanwụ ma dọọ ndị mere ya bụ ihe aka na ntị ka ha chee aka gbọrọ ya.

O kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-etinye anya na ya bụ ihe onyonyo na-efegharị na socha midia iji mara nke nbụ eziokwu.

Ọ gwara ọhaneze ka ghara iji ngwa ngwa mebie ihe.

Ọ jikwa otu aka ahụ gwa ndị mmadụ ka ha ghara ikesazi ya bụ ihe onyonyo ma jụkwa ihe ọbụla nwereike ịkewa Naịjirịa.

Ọ katọrọ oke gbuo gbuo gbuo juru Naịjirịa niile ugbua dịka ọ na-asị ndị nille aka ha dị na ya chee aka ghọro ya.

N'aka ọzọ, taa ka e liri nwaanyị ahụ n'ụmụ ya anọ n'Awka, Anambra steeti.

N'ajụjụ ọnụ ndị Daily Trust gbara Sarki Kabiru Bakari bụ onyeisi ndị ụka Alakụba n'Orumba South bụ ebe ndị ahụ bi, ọ kwuru na ha enweghike ibula ozu ha Adamawa be ha maka na "ọ rewala, ibu ha gbaa ogologo ụzọ".

Bakari kwuru na e butere ozu ndị ahụ ụbọchị Tuzde ka e gbuchere ha ụbọchị ụka.

Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ọzọ akatọọla ogbugbu a e gburu ụmụaka anọ a na nne ha.

Onye ọzọ tinyere ọnụ na ya bụ Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'ọkọlọtọ PDP.

Peter akatọọla ogbugbu e gburu ụmụaka ahụ na nne ha.

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi Twitter

Ọ sị na ụdịrị agwa ahụ "enweghị nabata maọlị dịka obodo anyị na-adakpọ n'ihu anyị".

Ọ sị na ya "ji ohere ahụ eti ndị ya bụ ihe metutere aka n'obi ma na-arịọ ndị ọrụ nchekwa na ndị nche obodo niile ka onye obụla gbaa mbọ mee ka udo lọchita ka ọ di na mbụ".

Ọ sị na gọọmentị kwesiri ịgba mbọ hụ na akwụrụ ndị mere ya bụ ihe ụkwọ ọrụ ha dịka o kwesairi.

O kwuru na "ọ nweghi ebe ọgbaghara na imebi ihe ga-eduga anyị", dịka ọ na-arịọ gọọmentị ka ha gbaa mbọ nye ndị mmadụ nchekwa ka o kwesiri.

Ihe Ohaneze sara maka ogbugbu nwaanyị dị ime, ụmụ ya anọ, omeiwu e beere isi na ndị ọzọ n'Anambra

Ohaneze Ndigbo na nwaanyị na ụmụ anọ

Ebe foto si, Ohaneze/ Jubril

Ohaneze Ndigbo ezigala ozi iti aka n'obi nye ndị Ugwu Awụsa bi n'Orumba North Anambra steeti na ezinaụlọ ndị ọzọ e gburu na steeti ahụ na nsonso a.

Ndị omekome bu egbe gburu ike karịrị mmadụ iri gụnyere nwaanyi dị ime aha ya bụ Harira Jubril na ụmụ ya anọ, onye Adamawa steeti na mpaghara dị iche iche n'Anambra steeti.

N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze bụ Alex Ogbonna ya binyere aka, Ohaneze katọrọ igbu mmadụ nakwa ibe isi na-akpọtụ sị na omenala igbo bụ na onye ọbụla gburu mmadụ ga-ata nnukwu ahụhụ nke gunyere iwuchi onye ahụ, igbu ya ma ọ bụ tụba ya n'ajọ ọhịa.

Ozi George Obiozor bụ onye isi Ohaneze wepụtara kwuru na ọ nọ na nnukwu ihe mwute ugbua dịka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bụzị ebe a na-egbụ mmadụ ka ọkụkọ.

Obiozor kwuru na "mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria bụ ebe udo kacha wee dị na mbụ tupu ndị omekome awakpoo ụlọmkpọrọ n'Owerre n'ụbọchị ise nke ọnwa Epreelụ, 2021.

Ohaneze katọrọ ogbugbu e gburu nwaanyị onye Adamawa steeti dị ime na ụmụ ya anọ n'ụbọchị ụka n'Ajali.

Ndị oji egbe ahụ gbukwara mmadụ isii ndị ọzọ.

Ohaneze zigara ozi iti aka n'obi nye ndị Ugwu bi na Orumba North Anambra steeti maka ogbugbu nwaanyị ahụ na ụmụ ya anọ.

Ozi ebere ahụ ha zigaara Sarikin Hausawa, Alhaji Said Muhammad kwuru na ya bụ ọnwụ bụ nnukwu ihe mwute na ihe mgbawa obi.

Ohaneze rịọrọ ndị mmadụ ka ha nyere gọọmenti aka ka ha nwuchie ndị omekome a na-ala ndụ n'iyi.

Gọọmenti Enugwu na Ebonyi akatọọla ogbugbu egburu mmadụ iri n'Anambra state ụbọchị ụka

Umahi na Uguwanyi

Ogbugbu egburu otu nwaanyi na ụmụ ya anọ n'Ajali dị n'okpuru ọchịchị Orumba bụ nke na-agba nnukwu anya mmiri ugbua.

Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ wakpokwara ọtụtụ ebe n'Anambra gbukwaa mmadụ isii, nke wetara ọnụ ọgụgụ ndị e gburu rue mmadụ iri.

Ndị ọnụ na-ekwuchitere gọmentị Ebonyị na Enugwu ji onu iwe katọọ ogbugbu ahụ dịka ihe jọgburu udene ma sigbuo nkapị.

Kọmishịọna na ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi Steeti bụ Mazị Uchenna Orji kwuru na ọ dị mkpa ka gọmenti ọwụwanyanwụ tinye anya na mmiri, kpọkọba ndị ntorobịa mara ihe bụ iwe ha.

Orji nyere ndụmọdụ ka obodo ndị ọzọ ṅomie ka Ebonyị si arụ ọrụ nchekwa dịka iji "ebube agụ", imata onye ọhụrụ ọbụla batara n'obodo nakwa ịjụ ndị Igwe ihe na-eme na gburu gburu ha.

Umahi na Uguwanyi

Ogbo ya bụ ọnụ na ekwuchitere Enugwu steeti bụkwa onye ndụmọdụ nye gọọmenti Enugwu bụ Steve Orụrụa ji anya mmiri kwuo na ndị igbo bụ ndị na asọ ikwafu ọbara nsọ, bụrụkwa ndị e ji udo na onye aghana nwanne ya mara.

Mana ugbua Orurua kwara arịrị na oge eruola mgbe Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị ọchịchị ime ime obodo ga-anọrọ ọdụ, kpọkọba ndị ntorobịa ma yọọ ha ka ha kwụsị ikwafu ọbara.

Etu 'unknown gunmen' si gbuo nwaanyị dị ime, ụmụ ya anọ na ndị ọzọ n'Anambra na Mee 22

Nwaanyị bu afọ ime

Cheta na abalị abụọ gara aga ka Iru uju na arịrị na-afịọ n'etiti ndị Ugwu bi n'Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị omekome bu egbe gburu opekata mpe mmadụ iri , ọtụtụ n'ime ha bụ ndị si Ugwu Naijiria na mwakpo mere ebe dị iche iche n'Anambara steeti n'Ụbọchịụka.

Ndị omekataraihepụjọ gburu mmadụ gụnyere nwaanyị dị ime na ụmụ ya anọ, otu onye inginia, ndị na-ere suya, ndị ọkwọụgbọala, ọkwọ ọgbatumtum na ndị na-arụ akpụkpọụkwu n'Ọnịcha, Adazi NnukwuAjali, Ogidi, Nanka.

Nke a na-abịa nanị ka ọ gachara otu abalị e jiri gbuo onye omeiwU nke Steeti ahụ bụ Okechukkwu Okoye ,bepụ ya isi ma tọgbọọ isi ya n'otu obodo, ahụ ya n'obodo ọzọ.

Mbọ nile BBC Igbo gbara inweta olu ndị uweojii Anambara steeti amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga zara ekwentị mana o kweghị asa okwu n'okwu mkpamkpa nile kpara na Anambra steeti.

Onye ma nwaanyị ahụ dị ime gwara BBC na nwaanyị ahụ bụ onye okpuru Ọchịchị Ganye dị n'Adama steeti si Akpo gaa ileta ụmụnne ha bi n'Ajali na-ala, ya na ụmụ ya oge ndị ojiegbe bu ụgbọala zutere ha.

Onye bu egbe

Ebe foto si, Getty Images

Onye ndu otu jikọrọ ndị Ugwu ma bụrụkwa onye ma nwaanyị ahụ achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC kwuru,"Ha ji ụgbọala kutuo nwaanyị ahụ na onye ọkada bu ya."

"Onye ọkada ha gbara ọsọ ndụ gbaba bee mmadụ.

"Ha gbagburu nwaanyị ahụ dị nnukwu ime, gbagbuo ụmụ ya anọ".

Ọ gara n'ihu kọwaa na ụmụ anọ ndị ahụ e gburu dị agbata afọ 9 rue14.

Ndị ojiegbe e gbukwara mmadụ n'Adazi Nnukwu,Ogidi,Nanka, na Abatete.

N'Adazi Nnukwu

Ọgbatumtum a gbara ọkụ

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ndị omekome bu egbe gburu mmadụ anọ n' Adazi Nnukwu , gbaa ọgbatumtum ise ọkụ

N'Adazị Nnukwu dị n'Okpuru Ọchịchị Aniocha, ndị ojiegbe ahụ gburu mmadụ atọ, gba ọgbatumtum ise ọkụ.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC na e gburu Rabiu Adamu, onye Jada na Adamawa steeti, ,Kabiru, onye Nijie, otu onye ọzọ sikwa Jada n'Adamawa amabeghị aha ya na otu onye ọzọ.

Onye Ugwu gwara BBC Igbo na " ndị ahụ bu ụgbọala bia, ndị ọkada nille gbara ọzọ hapụ ọgbatumtum ha."

"Mana ha gburu mmadụ atọ nọ ebe ahụ amaghị ihe na achụ ndị ọkada na-agba ọsọ."

Ọ gara n'ihu kọwa na ndị mere ihe ahụ na-agwa ha, "Na lọckdown dị echi." oge ọbụla a na-eme lockdọwn, ụnụ na-apụta".

Nke a bụ iji gwa ụnụ na 'lọckdown dị echi."

N'Ogidi,

Akụkọ kwuru na ndị omekome kpakwara mkpamkpa n'Ogidi, Anambra steeti.

Otu onye Ogidi achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na e gburu "otu nwoke onye Ugwu na 'Nkwelle Junction na nso Ogidi n'ụbọchịụka.

Nanka, Orumba North

Na Nanka ha gburu otu nwoke onye Sokoto steeti na-ere suya .

Onye be ha gwara BBC, "Ha bịakwutere ya ebe ọ na-ere suya n'ihe dịka Elekere ise nke mgbede, gburu ya, kposaa suya ọ na-ere."

"Ozu ya dọ ebe e gburu ya kemgbe ụnyahụ n'ihi na e nweghị ngagharị taa bụ Monde".

N'Abatete

Na Abatete, ndị ojiegbe bu ụgbọala Hilux abụọ gburu onye na-ere suya nakwa onye na-arụ akpụkpọụkwụ.

"Ha gburu ha, ghafuo suya".

Cheta na nsonso a, gbuogbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ ọkachasị n'Anambra steeti bụ ebe e gburu onye omeiwu steeti ahụ bepụ ya isi.

Gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa na-arụ ndị otu Ipob aka maka oke ogbugbu mmadụ na-eme mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: