Atọrọla mmadụ 22 n'obodo dị nso okporoụzọ Abuja-Kaduna

Ebe foto si, HQ Nigerian Military/Facebook
Ndị ntọ atọrọla mmadụ iri abụọ na abụọ n'obodo Angwar Maji nke dị nso okporoụzọ jịkọrọ Abuja na Kaduna n'abalị Sụnde.
Ndị bi ebe ahụ gwara BBC na ndị omekome a yi uwe ndị agha ma jiri nnukwu egbe were bịa.
Ha kwuru na ndị omekome a na-aga site n'ụlọ n'ụlo atọrọ ndị mmadụ.
Enwebeghị ihe gọọmentị Naijirịa kwurula maka ihea mere.
Nke a na-eme dịka otu ịzuụka ndị omekome wakporo ụgbooloko sị Abuja aga Kaduna.
Mwakpo ndị yiri nkea na-emezị kwamgbe kwamgbe na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ugwu Naijirịa.
Ndị mmadụ na-ekwugide gọọmentị Naijirịa maka na ha eneghị ike ịkwụsị mkpamklpa ndịa dịka atọrọla puku pụrụ puku ndị mmadụ maka ego ebe ihe ruru otu nde mmadụ esila n'ụlọ ha gbapụ maka nke a.
Atọhapụla ụmụakwụkwọ ABSU asaa atọrọ - ABSU PRO

Ebe foto si, ABSU/Facebook
Ọnụ na-ekwuchitere mahadum Abia State University, Uturu nke dị n'Abia Steeti bụ Chijioke Nwogu gwara BBC Igbo na-atọhapụla ụmụakwụkwọ asaa ndị atọọrọ n'ụbọchị Tọzde n'ihe dịka elekere asaa ruo asatọ nke abali.
Nwogu kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Sọnde ka atọhapụrụ ụmụakwụkwọ a ma sị na ahụ dị ha mma mgbe atọhapụrụ ha.
Atọrọ ụmụakwụkwọ a dịka ha si Okigwe alahachi ụlọ akwụkwọ ha.
O kwukwara sị, "Amaghị m ma e nwere ego a kwụrụ were tọhapụ ụmụakwụkwọ a".
O kwuru na onyeisi mahadum a bụ Onyemachi Ogbulu gwara ụmụ akwụkwọ ka ha kwụsị ije abalị.
Ahọpụtala John Ogbonnaya Amadi dịka onyeisi mpaghara ọnwụwa anyanwụ ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Francis Nweze_Facebook
Ahọpụtala John Ogbonnaya Amadi dịka onyeisi mpaghara ọnwụwa anyanwụ ndị uweojii Naịjirịa
Onyeisi ndị uweojii bụ Alkali Baba ahọpụtala John Ogbonnaya Amadi dịka osote onyeisi ndị uweojii nke mpaghara ọwụwa anyanwụ nwa mgbe nta
Amadi si Ebonyi steeti bụkwa onyeisi Department of Research and Planning n'Abuja.
Onye bụ John Ogbonnaya Amadi?
Ogbonnaya nwere asambodo Bachelors na Biology na nkụzị,nwekwaa nke Masters na Nkuzi bụ nke ọ nwetere na Mahadum nke Legọs.
Onye nnọchite anya ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ CSP Muyiwa Adejobi, sị na Ogbonnaya nwetere ọzụzụ dị iche iche na ofesi nakwa na Naịjirịa.
O jidekwala ọkwa dị iche iche na ọrụ ndị uweojii nke gụnyere kọmishọna na ụlọọrụ ụgbọoloko, na nke ụgbọmmiri dị na Legọs nakwa nke ụgbọelụ.
Ọ bụtụkwala osote onyeisi ndị uweojii nke Maritime nke Legọs.
Ruo mgbe ọ nwetere ọkwa a Ogbonna bụ onyeisi na National Institute for Policy and Strategic Studies, NIPSS, Kuru, Jos.










