Etu ndị 'unknown gunmen' si wakpoo ndị ọrụ mkpọrọ Imo steeti abụọ

Ụlọ mkpọrọ Owere ndị ekperima wakporo

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala iji nwụchie ndị omekome gbagburu ndị ọrụ mkpọrọ abụọ na steeti ahụ.

Ndị omekome a sị bu egbe gbagburu ndị ọrụ mkpọrọ n'ụtụtụ Wenezde n'Umulolo Okigwe dị n'Imo steeti.

Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na ndị ọrụ mkpọrọ ahụ nọ n'ụgbọala 'Hilux' nke ụlọmkpọrọ Imo steeti agaje oge ndị omekome ahụ tụrụ ha ogbunigwe nke gburu mmadụ abụọ ozigbo ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

Ha kwukwara na e bugawara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ akpọghị aha ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya bụ ihe mere n'ezia.

Abattam gara n'ihu kwuo na ndị uweojii steeti na-achọsị ndị mere mpụ ahụ ike iji nwụchịe dịka ha na-eme nchocha maka ihe a mere .

Kemgbe otu afọ tigbuo zogbuo na-arị ibe ya elu na mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjrịa dị ịcheịche dịka ndị bu egbe wakporola ọtụtụ ebe nke gụnyere ụlọ mkpọrọ Owere bụ ebe ndị omekome ji ogbunigwe gbakaa mkpọrọ ahụ ma tọhapụ ndị nga karịrị otu puku n'ọnwa Eprelụ afọ 2021.

Ọtụtụ mwakpo emela n'Imo steeti kamgbe afọ 2021 ọkachasị na mpaghara Orsu na Ihiala nke ndị uweojii kwurula na ha agba mbọ idaju.

Awakpokwala ụlọọrụ ndị uweojii na steeti ahụ ugboro ugboro, gbuo ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ma mwakpokwa ụlọọrụ gọọmentị nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec).