Innoson VS Gtbank : Ihe mere Innoson ji chọọ iweghara GTBank maka ụgwọ ụlọakụ ahụ ji ha

Ebe foto si, Innoson-Facebook
Dịka akụkọ na-efegharị na Innocent Chukwuma, onye nwe ụlọọrụ 'Innoson Group', nwereike iweghara Gtbank ma ọ bụrụ na ụlọakụ ahụ akwụghị Innoson ụgwọ ha ji ya, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Innoson Group bụ Cornelius Osigwe akọwala ihe ya bụ okwu pụtara.
Onye nwe ụlọọrụ Innoson bụ Innocent Chukwuma kwuru na nsonso a na ọ bụrụ na ụlọakụ 'Gtbank' akwụghị ụlọọrụ ya ijeri naira iri atọ na abụọ (N32bn) nke ụlọikpe kpebiri ka ha kwụọ ya, na ya ga-eweghara ụlọakụ ahụ ma isiego na ọmụrụnwa so ya karịa ego ụlọakụ ahụ nwere.
Chukwuma, kwuru nke a na nsonso a, oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ gara n'ụlọọrụ ya dị na Nnewi, Anambara steeti ajụjụ.
O kwuru na ya na bụbu ezigbote onyeahịa ụlọakụ GtBank oge Tayo Aderinokun bụ onyeisi ụlọakụ ahụ larala mụọ nọ nke mere ka ụlọakụ ahụ rụọ ngalaba ụlọakụ ha na Nnewi.
Mana na egwu dagharịrị oge onye ọhụrụ nọchiri ya.
Na nkọwa ya, Osigwe gwara BBC Igbo n'ekwentị na "akụkọ ụnụ na-anụ bụ eziokwu."
"Anyị ma na enwetala mkpebi n'Ụlọikpe Kachasị bụ ndị gwara Gtbank ka ha kwụọ anyị ego ha were n'akpaego anyị dị n'ụlọakụ ha."
"Oge e nyere mkpebi mbụ n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti, ihe e kpebiri ha ga-akwụ anyị bụ N4.7bn."
"Ụlọikpe kwuru na ego ahụ ga-eji pasent 22 na-erite ọmụrụnwa were ruo oge ha ga-akwụ ya bụ ụgwọ."
"Ọ bụ ihe ndị a ka anyị gbakọrọ malite na Ụlọikpe Ukwu ruo Ụlọikpe Kachasị" o were rute ijeri naira 32.
Ọ gara n'ihu bo ebubo na kama imezu ihe ụlọikpe gwara ha, na ụlọakụ GTbank ahụ na-agbagharị akwụkwọ n'Ụlọikpe kachasị ka ha lebagharịa anya n amkpebi ha nyeburu.
Ọ sịrị, "Ha agbabuola akwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị, a kụpụ ya, mana o nwere akwụkwọ ọhụrụ ha gbara n'Ụlọikpe Kachasị."
N'ajụjụ ma Innoson ọ ga-enwe ike imezu nke a ebe ọ bụ na Gtbank ahazighariala ụlọọrụ ha ma gbanwee aha ha ka ọ bụrụ, GTco, Osigwe sara sị, "Aha ọ bụla ọ masịrị ha na-aza, mkpata na mmefu ha nille ka ga-abụ nke GTBank."
Mbọ BBC gbara inweta olu ụlọakụ GTbank amịtaghị mkpụrụ.
Onye na-arụrụ ụlọakụ ahụ ọrụ na-achọghị ka a kpọ aha ya kwuru na "Ụlọakụ ahụ achọghị ka ha na onye bụbu onye ahịa ha na-eme tụmsara."
Cheta na Innoson na GTbank anọọla n'ụlọikpe ọtụtụ afọ maka ikpe metụtara ebubo na ụlọakụ ahụ zupuru nde kwuru nde Naira n'akpaego Ịnnoson nwere n'ụlọakụ ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Etu ngagharịiwe e mere maka Fada John Odey siri gbaa ihe e zoro ezo n'anwụ n'Abakaliki Catholic Diocese
- Ihe Buhari sara ndị ndu ala Igbo gara rịọ ya ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu
- A gbaala ụlọ Igwe Oliver Nnaji nke Ogwu Aniocha Anambra steeti ọkụ
- Ọkaikpe amachiela ndị ọrụ nchekwa iwuju n'ụlọikpe n'Umuahia maka ikpe Nnamdi Kanu











