Ihe 7 ị ga-eji cheta ndị Naịjirịa ma ị zute ha n'ụgbọelu

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị nwere ahụmihe pụrụ iche sitere n'oge gị na ndị Naịjirịa ndị ọzọ banyere n'otu ụgbọelu?
Ị ma na ụfọdụ ndị na-echefu na ha nọ n'ihu ọha ma ha na-akpa ụdịrị agwa nwere ka ọ dị ma ha nọrọ n'ụgbọelu? Nke a butere akụkọ a BBC Igbo dere iji gosipụta akparamagwa ndị a.
Ndị mmadụ tụmadụ ndị Naịjirịa na-eme ihe ndị e ji enyo ha enyo ma ụkwụ ha banye n'ụgbọelu.
1) Ịkụ aka:
Kedụ etu ọzọ ị ga-esi mara na ị rutela n'ọdọ ụgbọelu Naịjirịa ma ọ bụrụ na ị nụghị ka ndị mmadụ na-akụ aka?
Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-akụ aka ma ụgbọelu tụọ ụkwụ n'ọdụ ụgbọelu dị na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ n'ihi aṅụrị na ha anwụghị n'ihe mberede ụgbọelu mere ha ji akụ aka. Mana gịnị kpatara ha anaghị eme etu a ma ụgbọelu fetuo na mba ndị ọzọ na-abụghị Naịjirịa?
Ị bụrụ onye si mba ọzọ bata ma ị maghị na ndị Naịjirịa na-emekarị ụdịrị ihe a, ọ ga-abụ ihe ọhụrụ na ihe ịtụnanya nye gị.
2) Ikpe ekpere/iti mkpụ ọṅụ:
Ihe ọzọ ga-egosi na gị na ndị Naịjirịa nọ n'otu ụgbọelu bụ 'ekpere'. Ndị Naịjirịa ma etu esi ekpe ekpere nke ukwuu.
Ụfọdụ na-ekpe ya maka na ọ bụ ihe marago ha ahụ, ebe ndị ọzọ na-ekpe ya site n'ụjọ mberede na-esi n'ife n'elu.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ọzọ ha na-eme bụ iti mkpụ ọṅụ ma ụgbọelu fetuo nakwa ime 'n'afa nna' iji gosi obi ọma ha na ha anwụghị n'ihe mberede.
Ị ga-ata ha ụta ebe ihe mberede ụgbọelu emeela ihe karịrị ugboro iri na Naịjirịa?
3) Ịkọ akụkọ
Ihe ọzọ e ji mara ndị Naịjirịa n'ụgbọala bụ ịkọ akụkọ ka ha niile esi n'ime otu ọnụụlọ pụta.
Ma ọ bụ ụjọ ka ọ bụ obi ọma na-ebute akparamagwa a, enweghị onye nwere ike ịkọwanwu ihe mere ndị Naịjirịa na-eji eme omume a.
Agwa a nwere ike ịgbakasị ndị ọzọ ha na ndị Naịjirịa na-eme njem ụgbọelu ahụ, mana ebe o si ka njọ bụ na ndị na-eme ya anaghị ahụta ya ka ihe ọjọọ.
4) Ịba mba/ịkọ ọnụ
Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-esete ihe nkiri ebe ndị Naịjirịa na-akọ ọnụ n'ime ụgbọelu.
Oge ụfọdụ, ihe na-ese abụghị ihe ọzọ karịa na a na-azọ oche maọbụ na a na-azọ ebe a na-etinye akpa n'ime ihe a kpọrọ 'overhead bin'.
Maka etu ụgbọelu dị, ọ bụghị oge niile ka ị ga-etinyenwu akpa n'ime 'overhead bin' dị n'ebe oche gị dị. Nke a kpatara ụfọdụ ndị mmadụ na-eji akọ ọnụ ma onye ọzọ si n'oche ọzọ bịa itinye ihe n'oche ha.
Ihe ndị ọzọ nwere ike ibute esemokwu n'ime ụgbọelu bụ ebe a gara mposi maọbụ ebe ndị mmadụ na-azọ onye ga-anọ n'isi mpio.
5) Ise foto
Ọ na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ ise foto a kpọrọ 'selfie' ma ha banye n'ụgbọelu.
Nke a abụghị naanị ndị Naịjirịa ka ọ metụtara, mana ụfọdụ na-akawa ahụ gaa n'oche na-abụghị nke ha maka ise foto a.
Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ ịhụ ka onye kwesịrị ịnọ na 'economy class' biliri ọtọ gaa n'oche ndị 'business class' ise foto ma ụgbọelu tụọ ụkwụ n'ala.

Ebe foto si, Michael Ngene
Ha na-eme ya ma ụgbọala fetuo, maka na ndị nọ na 'business class' na-ebu ndị 'economy class' ụzọ aritu.
Ego ha na-akwụkwa na-aka nke ndị 'economy class', nke kpatara ụfọdụ ji ese foto a igosi 'ị makwa ndị anyị bụ'.
N'otu aka ahụ, ụfọdụ na-ese foto n'ime ụgbọelu iji gosi ndị mmadụ na ha 'so nn'ihe a na-eme', ọkachasị ndị ọ bụ mbụ ha na-efe n'ụgbọelu.
6) Ịrịọ efere nri ọzọ
Nke a bụ ọnọdụ ebe mmadụ ga-asị ndị ọrụ ha bụ ịlekọta ndị na-eme njem ụgbọelu ka o nye ya efere nri maọbụ iko mmanya ọzọ. Bekee kpọrọ ya 'second helping'.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị na ọ bụ naanị ndị Naịjirịa na-eme etu a, maọbụ na ọ bụ ihe ọjọọ ime ya, mana ị banye ụgbọelu bu ndị Naịjirịa, ị ga-ahụ ka ọtụtụ mmadụ na-ana ihe oriri ugboro ugboro.
N'afọ 2017, otu onye na-arụ na British Airways were iwe ma kwuo etu o si kpọ ịrụ ọrụ n'ụgbọelu bu ndị Naịjirịa asị.
7) Ibili ọtọ tupu ụgbọelu akwụsị
Gịnị mere o ji adị ndị Naịjirịa ọsịsọ iritu n'ụgbọelu?
Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị ekwe ka agbapee ụzọ ụgbọelu tupu ha ebilite ọtọ gawa nso ụzọ ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ị banye n'ụgbọelu ndị Naịjirịa nọ n'ime ya, ị ga-ahụ na ozugbo ụkwụ ụgbọelu ahụ tụrụ n'ala, ọ dị ha ọsịsọ iritu. Ọ bụ obiọma na ihe mberede emeghị ka ha ji eme omume a?











