Ihe 5 dị n'akpa gị e nwere ike ịkpọga gị nga?

Onye uweojii gbara mmadụ mmiri ose n'obodo Lusaka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-ejikarị mmiri ose akwụsị ọgbaghara n'ọtụtụ obodo na gburugburu ụwa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Enwere ike ịnwụchi gị maka ibu mmiri ose n'akpa?

Ndị uweojii Naịjirịa kwuru na mmiri ose so na ngwaọgụ amachiri amachi na Naịjirịa, ya mere na enwere ike ịkpọchi gị ma a hụ ya n'akpa gị.

Otu onye akpọrọ @yoitspizzu pụtara na Twitter ịjụ onye na-esote onyeisi ndị uweojii na Legọs bụ Abayomi Shogunle ihe mere eji nwụchie ya n'ụlọọrụ ndị police dị n'Igando maka mmiri ose o tinyere n'ime akpa.

Shogunle zara ya sị ya na ihe o mere dị njọ, maka na mmiri ose ahụ bụ 'ngwaọgụ amachiri amachi'.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gịnị ka a ga-akpọnwu ngwaọgụ?

BBC kpọrọ onye na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti, o wee kọwaa ihe mere mmiri ose ji bụrụ ngwaọgụ.

Oti kwuru na enweghị iwu ọbụla kwuru na mmiri ose dị njọ, mana enwere ụfọdụ iwu a ga-ejinwu jichie onye ọ bụla ji mmiri ose.

Ọ sị kwa na onweghị mmadụ ọ bụla nwere ikikere iji mmiri ose n'akpa ha mana ọ sị na mmiri ose dị iche n'anwụrụ ose ndị uweoji maọbụ ndịagha ji arụ ọrụ ha.

Oti kwukwara na dịka mkpebi ndị UN siri kwuo, na a ga-akpọnwu mmiri na anwụrụ ose, ngwaọgụ kemịkal.

Ị ga-aganwu nga?

N'otu aka ihe Shogunle kwuru, kedụ ihe ise nwere ike itinye gị na nsogbu ma ọ bụrụ na ndị uweojii hụ ya n'akpa gị?

1. Mmiri ose

Mkpọ mmiri ose

Ebe foto si, AFP

2. Mma

Mma ekwu

Ebe foto si, Getty Images

3. Agụba

Agụba eji eme ọtụtụ ihe

Ebe foto si, AFP

4. Mkpa

Ụfọdụ mmadụ ji mkpa ebi akwụkwọ nrị

Ebe foto si, AFP

5. Okwute

Onye na-ama iche okwute

Ebe foto si, AFP

Akụkọ ndị ga-amasị gi: