Ear infection: Tinnitus, Otitis externa na ọrịa ndị ọzọ nwereike inye ntị gị nsogbu

Eserese ntị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eserese etu ụda egwu si akpatara mmadụ nsogbu ntị.
    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Kedụ ihe ị ma maka ọrịa ndị na-enye maọbụ nwereike inye gị nsogbu na ntị?

Ọrịa dị iche iche nwereike inye gị nsogbu na ntị, ụdị gụnyere ụda maọbụ mkpọtụ nakwa abụ ịpụta mmadụ na ntị so n'ihe ndị na-enye nsogbu na ntị.

Ụfọdụ n'ime ọrịa ndị a nwere ngwọta ebe ụfọdụ bụ ọrịa tara nchara na-enweghi ọgwụgwọ.

Ntị mmadụ nwere nke Bekee kpọrọ 'middle ear' nakwa 'inner ear'. Nke mbụ bụ ebe ụda na-esi n'udu ntị ('tympanum') agaru na n'ime ntị (inner ear).

A bịa n'ọrịa ntị, nke kacha emetụta ndị mmadụ ọkachasị ndị okenye bụ nke a kpọrọ Tinnitus. Anyị ga-akọwa ihe ọrịa bụ.

Ụdịrị ọrịa ntị na ọgwụgwọ ya:

1) Tinnitus:

Ntị mmadụ

Ebe foto si, Iwaria

Nke a bụ ọrịa ntị nke mmadụ ga na-anụ ụda maọbụ mkpọtụ na ntị ya. O nwereike ime mmadụ n'otu ntị maọbụ na ha abụọ.

Ụfọdụ oge ọ na-abụ oke mkpọtụ dịka nke si n'igwe okwu (loudspeaker), mmadụ imerụ ahụ n'isi, nakwa oke anya ajụ na-ebute ya.

Marakwa na mkpọtụ ahụ ị na-anụ na ntị gị n'ihi tinnitus abụghị n'okirikiri gị ka o si abịa, ọ bụ n'ime ntị gị ka o si.

Ụfọdụ oge ọ na-eji aka ya alara onwe ya, mana oge ndị ọzọ ọ ga-adị mma ka onye dọkịta ntị nyochaa gị.

Etu ị ga-esi agwọ tinnitus:

Ụlọọrụ ahụike NHS nke mba Briten nyere usoro a maka ilekọta tinnitus

  • Gbalịa nọrọ jụụ. Mee ihe dị ka ikuba nakwa ikupute ume ka o nyere gị aka ịnọ jụụ.
  • Gbalịa na-esi otu usoro na-akwado nlaba ụra, nke a ga-enyere gị aka ikwalite etu i si arahụ ụra ọfụma.
  • Gbaara oke mkpọtụ nakwa dọga dọga ọsọ n'ihi na o nwereike ime ka tinnitus kawanye njọ

Obi amapụla gị na ị nwere tinnitus n'ihi na ọ bụghị oge niile ka o gosiri na ntị gị nọ n'ezigbo nsogbu ichi.

2) Otitis (media na externa):

Otitis media

Ebe foto si, KATERYNA KON/SCIENCE PHOTO LIBRARY

Nkọwa foto, Foto na-egosi ebe nje na-akpata otitis na-eme mmadụ na ntị

Ọrịa Otitis na-ebu ụzọ egosi onwe ya site n'oke mgbu na ntị nakwa ebe mmiri (fluid) juru na ntị.

Nje (bakteria) kacha ebute ya bụ ndị nke a kpọrọ Streptococcus pneumoniae, Haemophilus influenzae, Moraxella catarrhalis, nakwa Streptococcus pyogenes.

Nke a nwereike isi na nsogbu mkpọchi imi dịka rhinitis malite.

N'ihi na e nwere okporo jikọrọ azụ imi na etiti ntị (middle ear) nke Bekee kpọrọ 'Eustachian tube', rhinitis nwereike ikpalite ọrịa a n'azụ imi ma ọ bụrụ na okporo a anaghị arụ ọrụ ọfụma, nke ga-eme ka mmiri tojuo n'etiti ntị n'azụ udu ntị.

Ihe na-egosi na mmadụ nwere nsogbu n'etiti ntị ya:

  • Ntị mgbu
  • Ahụ ọkụ
  • Oyi ọmụma
  • Ike ọgwụgwụ
  • Anụchaghị ntị ọfụma
Aha onyonyo, Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ

Etu e si agwọ ya:

  • Dọkịta ga-enye gị ọgwụ e ji achụ oyi ọmụma na ahụ mgbu
  • Ọ na-ejikarị aka ya ala ụfọdụ oge, n'ime mkpụrụ ụbọchị olemole

Ndị iche dị n'orịa Otitis media na Otitis externa:

  • Otitis media na-emekarị ụmụaka ebe otitis externa na-emekarị ndị okenye dị ebe afọ 45 ruo 75
  • Ọ bụ ihe dịka oyi ọmụma na-ebutekarị otitis media, mana otitis externa bụ ihe dịka ngwọ, mmiri ịbanye na ntị maọbụ ihe e ji afanye na ntị ịmetụta okporo dị n'etiti 'outer ear' na udu ntị ('ear canal') na-ebute ya
  • Otitis media na-emetụta na 'Eustachian tube' ebe otitis media na-emetụta 'ear canal'

3) Ọrịa Meniere:

Onye na-etinye ihe na ntị

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Ịfabanye ihe n'ime ntị bụ otu ihe nwere ike ibutere gị nsogbu ntị.

Ọrịa a bụ nke na-etinyekarị mmadụ n'ọnọdụ ebe ọ dị ya ka ụwa ya ọ na-eme ntụgharị.

Ọ bụ nsogbu nke ime ntị (inner ear) na-eme ka isi ejuru mmadụ.

A mabeghi ihe na-ebute ọrịa Meniere a, mana a ma na ọ bụ nsogbu mfachi ntị so eme ya.

Ihe na-egosi ọrịa Meniere:

  • Onye ahụ ga na-anụ mkpọtụ tinnitus n'ime ntị ya
  • Ọ ga-adị ya ka ala ọ chọrọ ịgbagote bịa zute ya (anya ajụ/vertigo)
  • Ọ ga-adị ya ka ihe ọ fachiri ya ntị, ọ gaghị na-anụchakwa ntị.
  • Ịgbọ agbọ ga-aghụ ya
  • Ihe ndị a niile ga na-eme otu oge, o nwere ike ime n'ime naanị nkeji ole ma ole maọbụkwanụ ọ nọruo awa abụọ na atọ
  • Ọ na-ebidokarị n'otu ntị, mana o nwere ike ịgafekwa na ntị nke ọzọ
  • Anaghị ahụkarị ọrịa a n'ụmụaka, ọ bụ ndị okenye nọ site afọ 20 ruo 60 ka ọ na-emekarị

Etu e si agwọ ọrịa Meniere:

Ọrịa a enweghi ngwọta, mana dọkịta nwere ike inye gị ọgwụ ga-enyere gị aka maka anya ajụ na ịgbọ agbọ.

Ọ bụrụ na ọ na-arịa gị, o gosi gị na ọ chọwala imalite dịka ibu gị anya ajụ na ihe ndị ọzọ, ndị dọkịta NHS na-ekwu na ọ ka mma na ị wegharịghị isi gị ọsịsọ, ma were nwayọ nwayọ na-aga ije, nọrọkwa maọbụ dinara ala ruo mgbe ọ kwụsịrị inye gị nsogbu.

4) Mastoiditis:

Ear phones

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Mmadụ ige nnukwu ụda ogologo oge nwere ike ibutere ya nsogbu ntị

Nke a bụ ọrịa na-emetụta ọkpụkpụ 'mastoid' dị n'azụ ntị mmadụ.

Ọ bụ ụmụaka ka ọ kacha emetụta.

Ihe na-egosi na mmadụ nwere ọrịa a:

  • Azụ ntị ga na-egbu onye ahụ mgbu ma na-acha uhie uhie
  • Azụ ntị nwereike ịza aza
  • Ihe nwereike ị na-awụpụta na ntị
  • Oyi ọmụma nakwa ike ọgwụgwụ
  • Isi ọwụwa
  • Anụchaghị ntị

Etu e si agwọ Mastoiditis:

  • A na-eji ịwa ahụ agwọ ya mgbe ụfọdụ, nke bụ na a ga-ewepụ ụfọdụ ọkpụkpụ mastoid ahụ na-enye nsogbu
  • A na-eji ihe awụpụta ihe dị na ntị, nke a kpọrọ 'myringotomy'
  • Dọkịta ga-enye gị ọgwụ nke mmiri a na-esi na ntụtụ agbanye n'akwara

Ọrịa ndị ọzọ na-emetụta ntị mmadụ gụnyere:

Hearing aid

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụrụngwa bekee kpọrọ 'hearing aid' nke na-enyere ndị nwere nsogbu ntị aka ịnụ ihe nke ọma.
  • Cholesteatoma - nke bụ ebe mkpụrụndụ (cell) nke anụ ahụ gbakọrọ n'ime ntị.
  • 'Allergic rhinitis' nakwa 'non-allergic rhinitis',
  • Otosclerosis - nke bụ ọkpụkpụ ito na ntị mmadụ etu o kwesịghị
  • Labyrinthitis maọbụ vestibular neuritis - bụ nke na-emetụta etu mmadụ si anọsi ike.