Tuberculosis, akpụka nti, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ ị nwereike ikute n'ume

Tuberculosis, akpụka nti, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ ị nwereike ikute n'ume

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tuberculosis, akpụka nti, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ ị nwereike ikute n'ume

Dịka mbaụwa niile na-echeta ụbọchị Tuberculosis - Ụkwara nta taata, makwa na-ebuso agha megide ọrịa coronavirus ugbua, e nwere ọrịa ndị ọzọ a na-esi n'ikuku ebute mama ọtụtụ amaghị maka ha.

Akụko a ga-arụtụ aka n'ụfọdụ ọrịa ndị a nakwa njirimara ha.

1 - Ụkwara nta

nje ụkwara nta

Ebe foto si, Science Photo Library

Ụkwara nta nke bekee na-akpọ Tuberclosis bụ nje Bacteria na-ebute.

Ọ bụ mgbe onye bụ ọrịa a kwọrọ ukwara maọbụ maa uzere ka ndị ọzọ nwereike ibute ya.

BBC dere na ọ siri ike ibute ọrịa ụkwaranta kama ọ bụrụ na onye bu ya anataghi ọgwụgwo, ọ na-egbukarị onye ahụ.

Ọrịa ụkwaranta kacha emetụta ngụ mmadụ, kama ọ na-emetụta kwa ọkpụkpụ mmadụ, afọ na eriri nsiụbụrụ.

Njirimara ọrịa ụkwara nta

  • Ụkwara na-anọ karịa izuụka atọ
  • ịta ahụ
  • ahụ ọkụ na ajịrịja ịgba mmadụ n'abalị

2 - Azụzụ

Nje Azụzụ

Ebe foto si, Getty Images

Okenye nwereike ibute azụzụ ugboro anọ n'otu afọ.

Ọtụtụ mgbe, ọ bụ nje sị n'ezinaụlọ nje asaa nke gụnyere nke Rhinoviruses, so na-ebute ọrịa azụzụ.

Nje ndị a ruru otu narị na iri isii n'ọnụ ọgụgụ ma nwe kwa ike ịgbanwe onwe ha maọbụ zọọ n'ime ahụ mmadụ nke na-eme ka o sie ike igbu ha.

Dịka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ sayensị chebere ihu ha ịhụ na nje azụzụ enweghị ike ịkpa ike n'ahụ mmadụ kama enweghị ọgwụ eji agwọ ọrịa azụzụ.

Njirimara ọrịa Azụzụ

Dịka ndị BBCPidgin siri dee, lee ihe e ji mara ọrịa azụzụ

  • Obere ụkwara
  • Ahụ ọkụ
  • Udehe nke bekee na-akpọ Mucus
  • Ntịtị asụ
  • Isi ọwụwa

3 - Okponọha

Ọrịa okponọha bụ ọrịa ọzọ sị n'ikuku efesa nke dị Bekee na-akpọ Influenza.

Ọ bụ nje Virus na-ebute ya.

Aha onyonyo, 'Menthol' ọ na-egbochi ọrịa coronavirus?

Ọrịa a na-agbanwe onwe ya nke mekwara ka ọgwụgwọ ya sie ike.

Okponọha gburu ihe ruru mmadụ otu nde narị site n'afọ 1918 ruo 1920, ọ na-akacha njọ n'oge udu mmiri.

Njirimara ọrịa okponọha

  • Ahụ ọkụ
  • Oyi ụtụtụ
  • Ụkwara
  • Ntịtị asụ
  • Ahụ mgbu

4 - Ktkpa

Kitikpa

Ebe foto si, Getty Images

Kịtịkpa bụ ọrịa nje vịrụs na-ebute.

A na-akpọ ya Chickenpox na Bekee.

E nwere ọgwụ mgbochi a na-agba ụmụaka maka ya site n'otu afọ ruo afọ iri na abụo.

Ọ bụ site n'ụkwara na uzere ka e nwereike iji butee maọbụ kesaa ya.

Njirimara ọrịa Ktkpa

Dịka e siri dee, njirimara Kitikpa bụ

  • Ọkọ nghasị
  • Ọkọ
  • Ahụ ọkụ

A hapụ ya, o nwereike imetụta ụbụrụ maọbụ bute oyi ọtụtu nke nwereike ibute ọnwụ.

5 - Akpụka nti

mgbochi ọrịa akpụkanti

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa akpụka ntị bụkwa ọrịa ọzọ na-efesa n'ikuku nke ọ bụ nje na-ebute ya.

Dịka ndị BBC siri dee na ọrịa akpụka nti na-efesa etu ọrịa azụzụ na ndị ọzọ sị efesa nke gosiri na asụ pụtara n'ọnụ onye nwere akpụka ntị banye n'ọnụ onye ọzọ ga ebunye onye ahụ ya bụ ọrịa.

Enwere ọgwụ mgbochi eji maka ya bụ ọrịa.

Njirimara ọrịa akpụkanti

  • Ntị ịza aza
  • Isi ọwụwa
  • Ahụ mgbu
  • Ike ọgwụgwụ
  • Nrị agụghị mmadụ
  • Ahụ ọkụ

6 - Arụbara

Ọgwụ Arụbara

Ebe foto si, Getty Images

Arụbara bụ ọrịa na-esite na nje virus awakpo ndị mmadụ.

BBC dere na ọ bụ site na asụ mmiri sị n'ụkwara, uzere ma mmetụta. Nje arụbara nwereike ị nọ n'ikuku ọtụtụ awa.

Ọrị a na-enye ụmụaka nsogbu karịa mana ọ na-emekwa ndị okenye ahụ ha esighịike iluso nje ọgụ.

Arubara nwereike ibute ọrịa ndị dịka ọrịa ntị, akwụkwụ, afọ ọsịsa, oyi ma nwereike imetụta ụbụrụ.

Njirimara ọrịa Arụbara

  • Udehe imi
  • ịma uzere
  • ahụ ọkụ
  • ọkọ ahụ na-ebido n'ihu gbasaa ahụ niile

7 - Ụkwara tịkotịkọ

Nje úkwaranta

Ebe foto si, Science Photo Library

Nke a bụ ọrịa sitere na nje Bacteria.

Ọ na-esikwa n'ikuku ekesa site n'asụ maọbu ụkwara.

Aha onyonyo, Ị makwa ọrịa ndị i kwesiri igbochi n'oge udu mmiri a?

Mgbe mmadụ si n'imi kuru ihe nje a ka ọ na-enute ọrịa ụkwara nta.

Ọ kacha eme ma na-egbu kwa ụmụaka mana enwere ọgwụ mgbochi maka ya bụ ọrịa.

Njirimara ọrịa ụkwara tịkotịkọ

Ndị BBC dere na njirimara ọrịa dị ka nke azụzụ

  • Ụkwara na oyi ịba mmadụ n'ahụ
  • Ahụ ọkụ
  • Udehe nke bekee na-akpọ Mucus
  • Ntịtị asụ
  • Isi ọwụwa

8 - Covid-19

Ihe eserese nje coronavirus

Ebe foto si, ROGER HARRIS/SCIENCE PHOTO LIBRARY

Nkọwa foto, Ihe eserese nje coronavirus

Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) nọọrọ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Julaị na-ekwu na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa.

Nke a bịara dịka ndị Sayensị ruru narị abụọ boro WHO ebubo na ha ejighi nyocha sị na ọrịa coronavirus nwereike isite n'ikuku efesa kpọrọ ihe.

Mana WHO mechara kwete na nyocha a ma kwuo na ọrịa covid-19 nwereike isi n'ikuku efesa ọkachasị ebe igwe mmadụ nọ n'ogige ikuku adịghị.

Kama ha sị na ha ka na-eme nyocha ha.

Njirimara ọrịa Covid-19

Lee njirimara ọrịa dịka ndị BBC siri dee bụ

  • Ahụ ọkụ
  • ịkwọ ụkwara oge niile
  • Anaghị anụta isi na ụtọ ihe
  • Enweghị ike ikute ume nke ọma