Coronavirus Update: Etu ili mmadụ na nzuzo nwereike isi nyere aka maka coronavirus na South Africa

Ndị nọ akpati ozu nso

Ebe foto si, Sinoxolo Funeral Directors

Nkọwa foto, A machiela nnọkọ akwamozu

Dịka onye ntaakụkọ BBC nọ n'obodo Johannesburg depụtara na dịka mmachi ngagharị na nnọko na Saụt Afrịka mere ka a kwụsị ụfọdụ omenala, n'aka nke ọzọ ụfọdụ omenala ọ dịka echefuru echefu adịwala ire.

Otu n'ime omenala ndị a bụ olili mmadụ na nzuzo.

Cheta na ọ bụ naanị site n'otu akwamozu ka mmadụ iri anọ si bute ọrịa coronavirus na mba a.

Akụkọ yiri ibe ya bụ na o rughị otu izuụka onyeisiala Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa hiwere ọnọdụ gbata gbata ma machie nnọkọ ndị mmadụ, ka mmadụ ruru otu narị mere akwamozu n'obodo Majola dị na mpaghara "Eastern Cape" n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị.

Dịka ọ dị ugbua, obodo a nke dị n'ime obodo AmaMpondomise bụ ebe ọrịa covid-19 na-akpa ajọ ike ma tinye kwara obodo abụọ ọzọ ndị mekwara akwamozu n'oge ahụ.

Obodo ndị a nwere mmadụ narị abụọ bu ọrịa coronavirus na mpaghara ahụ. Ọnụọgụgụ ndị a dịka otu onye n'ime mmadụ anọ bụ ya bu ọrịa coronavirus na mpaghara ahụ.

Ị nupu ndị ọchịchị ntị

Iwu ụgbua nyere ikike ka nanị mmadụ iri ise bia olili mmadụ na Saụt Afrịka.

Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba ahụike nke Eastern Cape bụ Sizwe Kupelo sị na ụfọdụ ezinaụlọ na enupuru ndị ọchịchị isi nke na eme ka ọnụ ọgụgụ ndị bụ ọrịa coronavirus na-agbako.

Mazị Kupelo gwara ndị mgbasa ozi News24 sị " Etu ndị mmadụ si eme akwam ozu na mpaghara ana-echu anyị ụra".

O kwukwara sị "Anyị anabatala atụmatụ ndị Eze mpaghara a nyere ka esite n'ụlọ a na-edowe ndị nwụrụ gaa lie ha ozugbo.

Women sitting for a funeral

Ebe foto si, Alamy

N'ezie, o siri ike iwepụ omenala ndị dị otu a n'ihi na akụkọ ga na-ekwu na ndị mmadụ ka na anọkọ maka akwam ozu.

Ọkammụta Somadoda Fikeni kwu kwara sị "Emume dịka olili, alụm dị na nwunye na ị banye otu dị iche iche bụ emume ntozu e ji ama ndị obodo dị ezigbo mkpa n'ụwa mmadụ niile".

" Ọ dị na-agwụrụ ndị Afrịka ị nyere onwe ha aka ma na-ebi dịka otu ezinụlọ"

Mmadụ niile na-achọ ịkwanye ugwu nke ha

Ọtụtụ ndị isi ojii nke Saụt Afrịka na ejikọ omenala na ofufe Kraịst ekpere chi ha.

Nke a na-eme na mgbe ọbụla mmadụ nwụrụ ndị mmadụ na-esi ebe dị anya abịara ha mgbaru, i nyere ka aka maọbụ ị soro na memme ọbụla metụtara ya bụ akwam ozu.

Ihe ndị a gụnyere isi nrị maka ndị ọbịa, igwu ili na ihe ndị ọzọ.

Mgbe a na-eli mmadụ, a na-anabata mmadụ niile. Ọ naghị enwe onye a na-agụpụ.

'Etu ọrịa coronavirus si efe'

Mgbe a ga-elo ozu, igwe mmadụ bịara ga-anọkọ ọnụ, rịkọọ kwa nrị dịka ọtụtụ mmadụ na-enyere aka eke ha nri.

Fikeni kọwara sị " ọ bụ etu a ka ọrịa si agbasa".

I ji kwụsị mgbasa coronavirus site na nnọkọ ndị mmadụ maka akwam ozu mere ka Eze Zwelozuko Matiwane nke AmaMpondomise machie akwam ozu ọbụla ma mee ka ebido omenala ochie eji akwa ozu na nzụzọ a kpọrọ "Uktuqhusheka".

Presentational white space

Ọnye na-ekwuchitere Matiwane bụ Nkosi Bhakhanyisela Ranuga kwuru na ha na ndị ọchịchị omenala dị iche iche nwere nzụkọ tupu ha ehiwe ya bụ iwu.

Ranuga kwuru sị " Anyị na-achọ ị chekwa ndị obodo anyị maka coronavirus".

O kwuru na omenala Uktuqhusheka butara na a ga-eli onye nwụrụ ụbọchị ọ nwụrụ maọbu echi ya ma ọ bụ kwa nanị ndị nọ mgbe ọ nwụrụ ga-abịa olili ya"

Ịkwa ala

Ala Eze AmaMpondomise gụnyere obodo Qumbu,Tsolo, Ugie, Maclear na obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu.

Dịka Ranuga sị kọwara " Omenala ochie ga-emezị ka ọ bụrụ nanị ndị ezinụlọ onye nwụrụ ga-eli ya".

Ụkọchụkwụ na-eme olili

Ebe foto si, Sinoxolo Funeral Directors

Nkọwa foto, Ndị na-eli mmadụ na-epezi mpe.

Ndị mmadụ kwadoro uktuqhusheka maka ọ na-enyere aka igbochi ọrịa coronavirus ma ọ na-eme ka ego ndị mmadụ na-eji eli onye ha pee mpe.

"Kama emume ndị a akwụsịrị na-enyere m aka iru uju"

Ụfọdụ na-ekwu na omenala uktuqhusheka mere ka ha hara iru uju nke ọma.

Onyeisi ụlọọrụ Eastern Cape-based Sinoxolo bụ Siyabulela Jordan kwuru sị "ọtụtụ ndị mmadụ ndị ha nwụrụ agaghị enwe ọghere ịkwa ma ruo uju ma ebido omenala ochie a".

O kwukwra sị " Ihe niile eji mara ndị Afrịka oge olili ozu agaghị adị kwa"

Map
Presentational white space

"Ufọdụ ndị kwesiri ka enye ha nkwalite na ndụmọdụ ma akwụsi Uktuqhusheka"

Fikeni na-ekwu "n'ụche nke m ọ ga-adị mma ma ndị nile liri mmadụ n'oge Uktuqhusheka ka enye ha ndụmọdụ nkwalite mụọ"

Eziokwu bụ na ihe eji mara ndị mba Saut Afrịka nke na-ebute nnọkọ naudo bụzị ihe ọrịa coronavirus na-agbasa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: