Covid-19: 'Ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka m nụrụ na m bụ ọrịa coronavirus'

Ebe foto si, Ardito Kodijat
Sita Tyasutami na nne ya Maria Darmaningsih bụ mmadụ abụọ bu ụzọ bute ọrịa coronavirus na mba Indonesia.
Kama ihe mere ka ọnọdụ ha pụọ iche bụ etu ha siri mata na ha bu ya bụ ọrịa.
Nne na nwa gara ụlọọgwụ dịka ha na-egosi njirimara ọria coronavirus ma na-eche ka agwa ha mpụta nnyocha emere ha.
Kama ọ bụ mgbe ha na-ele ihe onyonyo oge Onyeisiala Indonesia bụ Joko Widodo na-agwa ndị mba ahụ okwu ka ha matara na ha bu ọrịa coronavirus.
Onyeisiala Widodo kwuru na mgbasa ozi ya were sị na Indonesia enwetela mmadụ abụọ mbụ bu ọrịa coronavirus. Widod kpọrọ afọ ole ndị ahụ dị, ụlọ ọgwụ ha nọ na ndị ha na ha nwere mmekọ.
Akpataoyi wụrụ Tyasutami n'ahụ dịka ọ chọpụtara na ọ bụ ya na nne ya ka onyeisiala na-ekwu maka ya.

Ebe foto si, Sita Tyasutami
O wutere ya na ọ bụ n'ihe onyonyo, site n'ọnụ onyeisiala ha ka ha ga-eji mara na ha bu ọrịa coronavirus.
Etu osiri bido
Mgbe olu bidoro ịkọ Sita ọkọ, o nweghị ihe ọ kpọrọ ya tupu ya eruo ụtụtụ ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Febuwarị mgbe ahụ ya biara mesiwa ya ike.
Nne ya bụ Darmaningsih na-arụ ọrụ dịka onye nkuzi na Mahadum ndị na-agba egwu dị na Jarkarta, dakawra ọrịa ma ha abụo amaghị ihe na-eme ha.
Ha gara ụlọọgwụ ebe dọkinta gwara Tyasutami na ọ nwere ọrịa "Typhus" ebe nne ya nwere "Broncopneumonia".

Ebe foto si, Getty Images
Ha gwara ndị ụlọọgwụ ka ha mee ha nnyocha maka coronavirus kama ndị ụlọọgwụ jụrụ n'ihi na ha enweghị akụrụngwa e ji eme nnyocha.
Ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Febuarị mgbe otu enyi Tyasutami gbara ya ama na ya bụ Tyasutami gara otu ọgbakọ ndị egwu ebe otu nwaanyị si mba Japan bụ ọria coronavirus biakwara.
Mgbe ahụ ka Tyasutami matara na agwọ nọ n'akịrịka.
Tyasutami kwuru sị "ugbua ka m siri ọnwụ were gwa dọkinta ka ha nnyochaa anyị maka coronavirus".
Dọkịnta kwetara ugbua ma edopụkwara ha iche n'ụlọọgwụ pụrụiche maka ndị bu nje.
Ọ tụrụ Tyasutami na nne ya Darmaningish n'anya na ọ bụ n'ọnụ onyeisiala ka ha ji mara na ha bu ọrịa coronavirus.

Ebe foto si, Sita Tyasutami
Ọ bụ mgbe abalị abụọ gara ka a gwara Tyasutami na Darmaningish na iwu obodo Indonesia nke ehiwere n'afọ 2009 na-ekwu na mgbe ọbụla e nwere ọrịa zuru ụwa ọnụ, na ọ bụ onyeisiala ka a ga-ebu ụzọ gwa.
Kama ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị mba Indonesia bụ Achmad Yurianto gwara BBC na ọ bụ etu a ka iwu ha dị.
N'aka nke ọzọ nwanne Tyasutami bụ Ratri Anindyajati kwuru sị " ndị mmadu na-ata nwanne m ụta na ọ bụ ya butere ọrịa a na mba anyị, ọtụtụ na-ata kwa ya ụta na ọ bụ ya mere e jiri chụọ ha n'ọrụ".
Dịka onyeisiala kwuchara okwu ya, mkpọbịrị aha Tyasutami na nne ya, akara ụlọ ha ma ihe gbasara ahụike ha jupụtara na "Whatsapp".
Tyasutami kwuru sị "tupu m bute ọrịa coronavirus, enweghị onye na-agwa m okwu ọjụọ, mmadụ puku abụọ na-eso m n'Instagram ma ugbu a ha eruola mmadụ puku iri. Ndị mmadụ na-ekwu zi okwu na ihe onyonyo ebe m yi mbeleukwu m ji agba egwu"

Ebe foto si, Sita Tyasutami
Ratri Anindyajati bidoro igosi njirimara ọrịa coronavirus nke mere ka ọ gaa kwa nnyocha. Mpụta nnyocha ya gosikwara na o butela ya bụ ọrịa
Ihe mere ịkpọ mmadụ "Patient Zero" ji dị njọ
Ntule Richard Mckay bụ Ọkammụta na onyenkụzị ihe gbasara mbido ọrịa zuru ụwa ọnụ
Mckay kọwara na ịkpọ mmadụ "Patient Zero" maọbụ onye mbụ bu ụzọ bute ọrịa zuru ụwa ọnụ na-eduhe karị ndị mmadụ.
O kwuru na a na-enwekarị ndị ga-ebu ya bụ ọrịa ma ọ gaghị egosi n'ahụ ha.
Mckay kọwara na-ịkpọ mmadụ onye mbụ butere ọrịa dịka coronavirus na ebute kwa ịkpa oke na ịkwa emu.
Ọ kọwa kwara na ọtụtụ mgbe, gọọmentị agaghị etinye ụchụ ị chọpụta ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa a dika ha ga-etinye uche ha niile na ndị mbụ ha chọpụtara maọbụ ndị a na-akpọ "Patient Zero".

Ebe foto si, Sita Tyasutami
Dịka ọ dị ugbua, Tyasutami, Anindyajati na nne ha bụ Darmaningish enwerela onwe ha.
Ụfọdụ na-akọ ha ọnụ, akpọ ha ekwensu kama Anindyajati sị " anyị kwetere na enwere ndị ọzọ bu ya bụ ọrịa ma ewepụ anyị, kama ma enweghị ihe ọzọ, nchọpụta nke anyi mere ka gọọmentị bido iluso coronavirus ọgụ".
Ụgbụ a,mba Indonesia enwela mmadụ puku iri na abụọ bu ọrịa coronavirus ebe mmadụ narị itolu anwụọla site n'aka ya bụ ọrịa.









