Coronavirus: Etu iwu ọhụrụ Buhari tinyere maka covid-19 ga-esi metụta steeti gị

N'abalị Mọnde bụ ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Epreelu, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputara usoro ọhụrụ a ga-eji buso coronavirus agha.
N'okwu ya, Buhari sị na a ga-amalite ibelata mmachị ngagharị etinyere na Legọs, Ogun nakwa Abuja malite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee.
Ọ kọwara na ya na ndị gọvanọ nwere mkpebi a mgbe ha lechara anya etu "ọnọdụ nọrọ n'ụlọ" siri metụta akụnaụba obodo, ahịa ndị mmadụ, ụlọakwụkwọ nakwa ịkọ ihe.


N'ozi a ọ gbasara, o kwuru na a ga-amalite mbelata Lockdown ma jirikwa ohere ahụ wụlite nnyocha ọrịa Coronavirus na nchọpụta ndị bu ya.
Ọ nọkwa n'otu aka ahụ tinye mmachị ngagharị kpam kpam na Kano ma manye mmachị ngagharị n'abalị na Naịjirịa niile.
Ọzọkwa bụ ịsị na mmadụ agaghị apụta n'ezi ma ya bụrụ na okpughi mkpuchi imi.
N'okwu Buhari, aihe atọ kacha pụta ihe bụ:
- Steeti ndị a ga-amalite ibelata mmachị n'ụbọchị anọ Mee nke gunyere Legọs, Abụja nakwa Ogun.
- Kano steeti ebe mmachị ngagharị kpam kpam ga-amalite site Monde ruo izuụka abụọ.
- Steeti niile na Naịjirịa ga-enwe ọnọdu "curfew" na mmanye ikpu mkpuchi ime.
Ihe ndị mmadụ kwesiri ịma bụ na a gụpụ Legọs, Abuja, Ogun na Kano, onweghị steeti ebe ọzọ Buhari tinyere mmachị ngaghari.
Ya bụ na mmachi ngaghari nke dị na ọtụtụ steeti sitere n'aka ndị gọvanọ na-achi steeti ndị ahụ.
Ọ gịnị bụ atụmatụ "curfew" a Buhari manyere?
"Curfew" bụ ọnọdụ mmachi ngagharị kpam kpam gọọmenti na-etinyekarị ma ya bụrụ na enwere ebe nsogbu dị.
Nke a Buahri tinyere na-ebido n'elekere asatọ nke abalị ruo elekere isii nke ụtụtụ.

Ebe foto si, Nigerian Police
Mana ọbụghi ugbua bụ mbụ a na-anụ maka "curfew" kemgbe agha coronavirus a malitere.
Na steeti Imo, Abia, Kaduna na Ebonyi e nwere atụmatụ a.
Kedụ steeti ndị "Curfew" a ga-emetụta?
Iwu "Curfew" a ga-amalite taa bụ Tuzde na steeti niile dị na Naịjirịa.
Ihe ndị gọọmentị na uweojii ọwụwa anyanwụ na-ekwu gbasara ya bụ iwu Curfew
Abia: Kọmịshọna mgbasa ozi nke Abia steeti gwara BBC na Abia steeti nwere Curfew nke ya bidoro n'elekere isii nke mgbede rue elekere isii nke ụtụtu.
Mana o kwuru na ha ga-elebanye anya na ntuziaka onyeisiala nyere ma kwuputazie ihe ọhụrụ ọbụla ha chọrọ ịkwu n'ụbọchị Satọde na-abịa.
Imo: Ọnụ na-ekwuru aka na-achị Imo steeti bụ Oguiwike Nwachukwu kwuru na Imo steeti nwekwara Curfew nke ha si elekere isii rue elekere isii dịka nke Abia steeti.

Mana o kwuru na ha agaghị agbanwe ihe ọbụla n'ihi na nke ha bu ụzọ buru iwu tupu onyeisiala amanye nke ọhụrụ a.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo bụ Godson Ikeoku kwukwara na ha zuru ka-emee n'idebe iwu ahụ.
Enugwu: Kọmịshọna mgbasaozi n'Enugwu bụ Chidi Aroh kwuru na ọnọdụ nọrọ n'ụlọ nke amanyere na steeti ahụ ka na-aga n'ihu.

kwukwara na dịka onyeisiala si kwuo na a ga-elebanye ya bụ okwu anya ọfụma tupu ha ekpebie ihe ga-ebe n'oge adịghị anya.
Anambra: BBC enwetebeghi kọmịshọna mgbasaozi nke Anambra steeti mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed kọwara na ha bụ ndị uweojii na-echekwa Anambra ọfụma.
Maka akụkọ ndị na-enye ndị uweojii aka azụ abata obodo, o kwuru na ndị uweojii na-arụ ọrụ ha n'ịchọpụta ọrụ mmadụ na-arụ tupu ha ekwe ha banye steeti ahụ.

O kwukwara na ha na-achụghachi ụfọdụ mmadụ ejidere n'abụghị ndị ọrụ dị mkpa maọbụ anapụ ha ụgbọala ha.
Ebonyi: Ọnụ na-ewkuchitere ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah kwuru na steeti ahụ enweela Curfew nke ya kemgbe gọvanọ Dave Umahi manyere ya.
kwuru na Curfew ahụ bidoro n'elekere asaa nke mgbede rue elekere asaa nke ụtụtụ enyela aka ịbelata ohi na ihe ndị ọzọ na-enye ndị mmadụ nsogbu.

N'ọnụ ya,"Obi adịghị kọmịshọna ndị uweojii mma n'ihi akụkọ na ụfọdụ ndị uweojii na-anara aka azụ iji nabata ndị njem si steeti ndị ọzọ"
Ya mere na agbanweela ndị uweojii na-anọ n'oke Ebonyi steeti na steeti ndị ọzọ iji hụ na anaghị anara aka azụ iji kwe ka ndị mmadụ bata steeti ahụ ọzọ.
Kemgbe Naịjirịa nwetara ọnụọgụgụ mbụ ya bụ ọrịa Coronavirus n'ọnwa Febụwarị, ọrịa ahụ efesala mmadụ otu puku na narị atọ na iri atọ na asaa.
Ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na ise agbakeela ebe mmadụ iri anọ nwụrụ n'aka ya bụ ọrịa.









